Oge Na Ụbọchị Dị n’Aka Jehova
“Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.”—ỌRỤ 1:7.
1. Olee otú Jisọs sị zaa ajụjụ ndị na-egosi iji oge akpọrọ ihe nke ndị ozi ya jụrụ?
GỊNỊ ka ndị ahụ “na-eze ume ndị na-asụkwa ude n’ihi ihe arụ nile nke a na-eme” n’ime Krisendọm nakwa n’ụwa nile kwesịrị ime karịa ịjụ banyere mgbe ajọ usoro ihe a ga-agwụ ma bụrụ nke e ji ụwa ọhụrụ ezi omume Chineke dochie? (Ezikiel 9:4; 2 Pita 3:13) Ndị ozi Jisọs jụrụ ya ajụjụ ndị na-egosi iji oge akpọrọ ihe kpọmkwem tupu ọnwụ ya na mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị. (Matiu 24:3; Ọrụ 1:6) Otú ọ dị, ná nzaghachi, Jisọs egosighị ha ụzọ isi gụkọọ ụbọchị. N’otu oge o nyere ha ihe ịrịba ama ọtụtụ ihe mejupụtara, ná nke ọzọkwa ọ sịrị na ‘ọ bụghị ihe dịịrị ha ịma oge ma ọ bụ ụbọchị nke Nna ya debere n’ike nke aka Ya.’—Ọrụ 1:7.
2. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Jisọs abụghị mgbe nile ka ọ ma banyere ọgụgụ oge nke Nna ya banyere ihe omume ndị gaje ime n’oge ikpeazụ?
2 Ọ bụ ezie na Jisọs bụ Ọkpara Jehova mụrụ nanị ya, ya onwe ya abụghị mgbe nile ka ọ ma banyere usoro ọgụgụ oge Nna ya maka ihe omume. N’amụma ya banyere mgbe ikpeazụ, Jisọs ji obi umeala kweta, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:36) Jisọs dị njikere iji ndidi chere ka Nna ya kpugheere ya kpọmkwem oge maka ọrụ mbibi a ga-arụ megide ajọ usoro ihe a.a
3. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’azịza Jisọs nye ajụjụ ndị metụtara nzube Chineke?
3 A pụrụ ikwubi ihe abụọ site n’ụzọ Jisọs si zaa ajụjụ ndị metụtara mgbe ihe ga-eme ná mmezu nke nzube Chineke. Nke mbụ, na Jehova nwere usoro ọgụgụ oge; nke abụọ kwa, na ọ bụ nanị ya na-esetịpụ ya, ndị ohu ya apụghịkwa ịtụ anya ka e nye ha ihe ọmụma doro anya nke oge na ụbọchị ya tupu o ruo.
Oge na Ụbọchị Jehova
4. Gịnị ka okwu Grik ndị ahụ a sụgharịrị ịbụ “oge” na “ụbọchị” n’Ọrụ 1:7 pụtagasịrị?
4 Gịnị ka “oge” na “ụbọchị” pụtara? Okwu Jisọs e dekọrọ n’Ọrụ 1:7 nwere akụkụ abụọ nke oge. Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “oge” pụtara “oge n’echiche nke otú ọ ga-anọru,” oge (ma ọ̀ dị ogologo ma ọ̀ dị mkpirikpi). “Ụbọchị” bụ nsụgharị nke okwu na-ezo aka n’oge e setipụrụ esetịpụ ma ọ bụ nke a kara aka, otu mgbe kpọmkwem, nke ihe ụfọdụ kara akara. Banyere okwu abụọ mbụ ndị a, W. E. Vine na-ekwu, sị: “N’Ọrụ 1:7, ‘Nna ahụ debere n’ikike Ya’ ma oge (chronos), ịdị ogologo nke oge ndị ahụ, ma ụbọchị (kairos), oge ndị e ji ihe omume ụfọdụ mara.”
5. Olee mgbe Jehova gwara Noa banyere nzube Ya ịla ụwa ahụ rụrụ arụ n’iyi, ozi abụọ dịkwa aṅaa ka Noa jere?
5 Tupu Iju Mmiri ahụ, Chineke setịpụrụ afọ 120 maka ụwa ahụ rụrụ arụ nke ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi na-enupụ isi bụ́ ndị nwoghara onwe ha kpatara. (Jenesis 6:1-3) Noa ahụ na-atụ egwu Chineke dị afọ 480 n’oge ahụ. (Jenesis 7:6) Ọ mụtaghị nwa, ọ nọgidekwara otú ahụ ruo afọ 20 ọzọ. (Jenesis 5:32) Mgbe ogologo oge gasịrị, nanị mgbe ụmụ Noa torusịworo ogo mmadụ ma lụọ nwunye, Chineke gwara Noa banyere nzube Ya iwepụ ajọ omume n’ụwa. (Jenesis 6:9-13, 18) Ọbụna mgbe ahụ, ọ bụ ezie na e nyere Noa ọrụ abụọ nke ịrụ ụgbọ na ime nkwusa nye ndị nọ ndụ n’oge ya, Jehova ekpugheghịrị ya ndokwa oge ya.—Jenesis 6:14; 2 Pita 2:5.
6. (a) Olee otú Noa si gosi na ọ hapụrụ ihe ndị metụtara oge n’aka Jehova? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Noa?
6 Ruo ọtụtụ iri afọ—ikekwe ọkara otu narị afọ—“Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya.” Noa ji “okwukwe” mee otú ahụ, n’amaghị kpọmkwem ụbọchị ọ bụ. (Jenesis 6:22; Ndị Hibru 11:7) Jehova agwaghị ya kpọmkwem oge ihe omume dị iche iche ga-ewere ọnọdụ ruo mgbe ọ fọrọ otu izu ka Iju Mmiri ahụ malite. (Jenesis 7:1-5) Ntụkwasị obi na okwukwe zuru ezu nke Noa nwere n’ebe Jehova nọ mere ka o nwee ike ịhapụ ihe ndị metụtara oge n’aka Chineke. Leekwa aha ekele Noa na-aghaghị inweworị mgbe o nwetara nchebe Jehova n’oge Iju Mmiri ahụ ma mesịa si n’ụgbọ ahụ pụta n’elu ụwa e mere ka ọ dị ọcha! N’inwe ụdị olileanya nke mgbapụta yiri nke ahụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ụdị okwukwe ahụ n’ebe Chineke nọ?
7, 8. (a) Olee otú mba na ike ụwa dị iche iche si malite? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova si ‘debe oge a kara aka na ókè nile nke ebe obibi mmadụ’?
7 Mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, ihe ka ọtụtụ n’ụmụ Noa gbahapụrụ ezi ofufe nke Jehova. Ná nzube nke ịnọgide n’otu ebe, ha malitere iwu otu obodo ukwu na ụlọ elu maka ofufe ụgha. Jehova kpebiri na oge eruwo ka o tinye aka. Ọ ghagburu asụsụ ha ma “mee ka ha si [na Bebel] gbasaa n’elu ụwa nile.” (Jenesis 11:4, 8, 9) Mgbe e mesịrị, ìgwè asụsụ ndị ahụ ghọrọ mba dị iche iche, ndị ụfọdụ n’ime ha weghaara mba ndị ọzọ wee ghọọ ike ọchịchị ógbè, na ọbụna ike ụwa.—Jenesis 10:32.
8 N’ikwekọ ná mmezu nke nzube ya, mgbe mgbe Chineke kpebiri ókèala mba nakwa kpọmkwem oge otu mba ga-achị n’ógbè ma ọ bụ dị ka ike ụwa. (Jenesis 15:13, 14, 18-21; Ọpụpụ 23:31; Deuterọnọmi 2:17-22; Daniel 8:5-7, 20, 21) Pọl onyeozi zoro aka n’akụkụ a nke oge na ụbọchị Jehova mgbe ọ gwara ndị Gris ụbụrụ na-aghọ nkọ n’Atens, sị: “Chineke Onye kere ụwa na ihe nile dị n’ime ya . . . wee site n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ, ka ha biri n’elu ụwa nile, mgbe O debesịrị oge ha a kaworo aka na ókè nile nke ebe obibi ha.”—Ọrụ 17:24, 26.
9. Olee otú Jehova siworo ‘gbanwee mgbe na mgbe a kara aka’ n’ihe banyere ndị eze?
9 Nke a apụtaghị na ọ bụ Jehova na-akpata mmeri na mgbanwe ọchịchị n’etiti mba dị iche iche. Ma, ọ pụrụ itinye aka mgbe ọ chọrọ ime otú ahụ iji mezuo nzube ya. N’ihi ya, onye amụma bụ́ Daniel, onye gaje ịhụ ọdịda nke Ike Ụwa Bụ́ Babilọn na ndochi a ga-eji Medo-Peasia dochie ya, kwuru banyere Jehova, sị: “Ya onwe ya na-agbanwe mgbe na mgbe a kara aka: Ọ na-ewezụga ndị eze, na-emekwa ka ndị eze bilie: Ọ na-enye ndị maara ihe amamihe ha, Ọ na-enyekwa ndị maara nghọta ihe ọmụma.”—Daniel 2:21; Aịsaịa 44:24–45:7.
‘Oge ahụ Na-eru Nso’
10, 11. (a) Ruo oge ha aṅaa tupu o mee ka Jehova setịpụrụ oge mgbe ọ ga-agbapụta ụmụ Abraham pụọ n’agbụ? (b) Gịnị na-enye echiche na ụmụ Israel amaghị kpọmkwem mgbe a gaje ịgbapụta ha?
10 Ihe karịrị narị afọ anọ tupu o mee, Jehova setịpụrụ kpọmkwem afọ mgbe ọ ga-eweda eze nke Ike Ụwa Bụ́ Ijipt n’ala ma mee ka ụmụ Abraham nwere onwe ha pụọ n’ịbụ ohu. N’ikpughere Abraham nzube ya, Chineke kwere nkwa, sị: “Mara nke ọma na mkpụrụ gị ga-abụ ọbịa n’ala na-abụghị nke ha, ha ga-efekwa ha; ha ga-eweda ha ala [narị afọ anọ]; ọzọkwa, mba ahụ nke ha ga-efe ka M ga na-ekpe ikpe: e mesịa ha ga-achịrị akụ̀ ukwu pụta.” (Jenesis 15:13, 14) Ná ntụleghachi ya dị mkpirikpi nke akụkọ ihe mere eme nke Israel, nke o kwuru n’ihu Ụlọikpe Sanhedrin, Stifen zoro aka n’oge afọ 400 a ma kwuo, sị: “Ma mgbe oge nkwa ahụ na-eru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndị Juu gara n’ihu baakwa ụba n’Ijipt, ruo mgbe eze dị iche biliri ịbụ eze Ijipt, onye na-amataghị Josef.”—Ọrụ 7:6, 17, 18.
11 Fero ọhụrụ nke a weturu ụmụ Israel ala gaa n’ịbụ ohu. Mosis aka-edeghị akwụkwọ Jenesis mgbe ahụ, ọ bụ ezie na o yikarịrị ka e nyewo nkwa Jehova kwere Abraham, n’ụdị e kwuru ekwu ma ọ bụ n’ụdị e dere ede. Ya bụrụgodị otú ahụ, o yiri ka ihe ọmụma ụmụ Israel nwere ekweghị ka ha gụkọọ kpọmkwem mgbe mgbapụta ha pụọ ná mmegbu ga-abụ. Chineke maara mgbe ọ gaje ịgbapụta ha, ma o doro anya na a gwaghị ụmụ Israel ahụ nọ ná nhụjuanya. Anyị na-agụ, sị: “O ruo, n’ọtụtụ ụbọchị ahụ, na eze Ijipt nwụrụ: ụmụ Israel wee na-eze ume n’ihi ofufe ha, ha wee tie mkpu, ntiku ha tikuru Chineke wee rịgoruo Chineke ntị, n’ihi ofufe ahụ. Chineke wee nụ ịsụ ude ha, Chineke wee cheta ọgbụgba ndụ Ya, nke Ya na Abraham na Aịsak na Jekọb gbara. Chineke wee hụ ụmụ Israel, Chineke wee mara.”—Ọpụpụ 2:23-25.
12. Olee otú Stifen si gosi na Mosis mere ihe tupu oge Jehova eruo?
12 A pụkwara ịchọpụta enweghị ihe ọmụma a banyere kpọmkwem oge mgbapụta Israel ga-abụ site n’okwu nchịkọta stifen. N’ikwu banyere Mosis, ọ sịrị: “Mgbe o ruwere [afọ iri anọ], ileta ụmụnne ya, bụ́ ụmụ Israel, batara n’obi ya. Ma mgbe ọ hụrụ otu onye n’ime ha ka a na-emejọ, ọ lụwaara ya ọgụ, wee kpepụta onye a na-emegbu, ebe o tigburu onye Ijipt: ma o chere na ụmụnne ya ghọtara na Chineke na-esi n’aka ya enye ha nzọpụta; ma ha aghọtaghị.” (Ọrụ 7:23-25, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ebe a Mosis mere ihe afọ 40 tupu oge Chineke eruo. Stifen rụtụrụ aka na Mosis chere afọ 40 ọzọ tupu Chineke ‘esi n’aka ya nye ụmụ Israel nzọpụta.’—Ọrụ 7:30-36.
13. Olee otú ọnọdụ anyị sị yie nke ụmụ Israel tupu mgbapụta ha site n’Ijipt?
13 Ọ bụ ezie na “oge nkwa ahụ na-eru nso” nakwa na Chineke esetịpụwo afọ ahụ kpọmkwem, Mosis na Israel nile aghaghị inwe okwukwe. Ha aghaghị ichere oge Jehova kara aka, o doro anya na ha enweghị ike ịgụkọ ya tupu o ruo. Anyị onwe anyị kwenyesikwara ike na mgbapụta anyị site n’ajọ usoro ihe a na-abịaru nso. Anyị maara na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ya mere ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịdị njikere igosipụta okwukwe anyị ma chere oge Jehova maka oké ụbọchị ya? (2 Pita 3:11-13) Mgbe ahụ, dị ka Mosis na ụmụ Israel, anyị pụkwara ịbụ abụ dị ebube nke mgbapụta, iji nye Jehova otuto.—Ọpụpụ 15:1-19.
“Mgbe Oge ahụ Zuru”
14, 15. Olee otú anyị si mara na Chineke setịpụwororịị oge maka Ọkpara ya ịbịa n’ụwa, gịnịkwa ka ndị amụma na ọbụna ndị mmụọ ozi nọ na nche banyere ya?
14 Jehova setịpụwororịị oge a kara aka maka Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ịbịa n’ụwa dị ka Mesaịa. Pọl dere, sị: “Mgbe oge ahụ zuru, Chineke zipụtara Ọkpara Ya, Onye a mụrụ site na nwanyị, Onye a mụrụ n’okpuru iwu.” (Ndị Galetia 4:4) Nke a bụ ná mmezu nke nkwa Chineke kwere izite otu Mkpụrụ—‘Shaịlo, onye ga-enwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.’—Jenesis 3:15; 49:10.
15 Ndị amụma Chineke—ọbụna ndị mmụọ ozi—nọ na nche banyere “ụbọchị” mgbe Mesaịa ga-apụta n’ụwa, mgbe nzọpụta ga-ekwekwa omume nye ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. “Ọ bụkwa nzọpụta nke a,” ka Pita kwuru, “ka ndị amụma chọrọ, nyochaakwa ihe banyere ya, bụ́ ndị buru amụma banyere amara ahụ nke ga-eru unu: na-enyocha oge ọ bụ ma ọ bụ aha oge ọ bụ, bụ́ nke Mmụọ nke Kraịst Nke dị n’ime ha na-egosi, mgbe O buru ụzọ na-agba àmà banyere ahụhụ nke Kraịst, na ebube nile nke ga-eso ha. . . . Ihe ọ na-agụ ndị mmụọ ozi inyocha ha.”—1 Pita 1:1-5, 10-12.
16, 17. (a) Site n’amụma dị aṅaa ka Jehova nyeere ndị Juu narị afọ mbụ aka ịtụ anya Mesaịa? (b) Olee otú amụma Daniel si metụta atụmanya ndị Juu maka Mesaịa?
16 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Daniel—nwoke nke okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ—Jehova ebuworị amụma nke metụtara “[izu iri asaa].” Amụma ahụ ga-eme ka ndị Juu nke narị afọ mbụ nwee ike ịmara na mpụta nke Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa na-eru nso. Akụkụ amụma ahụ kwuru, sị: “Site ná mpụta okwu ahụ iwughachi na iwuzi Jerusalem ruo mgbe onye e tere mmanụ, bụ́ onye ndú, ga-adị izu asaa: na [izu iri isii na abụọ].” (Daniel 9:24, 25) Ndị ọkà mmụta ndị Juu, Katọlik, na Protestant, na-ekwekọrịta na “izu” ndị e hotara ebe a pụtara izu nke afọ. “Izu” 69 ahụ (afọ 483) nke Daniel 9:25 malitere na 455 T.O.A., mgbe Eze Ataksakses nke Peasia nyere Nehemaịa ikike “iwughachi na iwuzi Jerusalem.” (Nehemaịa 2:1-8) Ha gwụsịrị mgbe afọ 483 gasịrị—na 29 O.A., mgbe e mere Jisọs baptism ma were mmụọ nsọ tee ya mmanụ, o wee si otú a ghọọ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst.—Matiu 3:13-17.
17 Ma ndị Juu nke narị afọ mbụ hà maara kpọmkwem mgbe afọ 483 ahụ malitere bụ ihe na-edoghị anya. Ma mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism malitere ozi ya, “ndị Juu nọ na-ele anya, mgbe mmadụ nile na-atụgharịkwa n’obi ha ihe banyere Jọn, ma eleghị anya ya onwe ya bụ Kraịst ahụ.” (Luk 3:15) Ụfọdụ ndị ọkà mmụta Bible na-ejikọta atụmanya a na amụma Daniel. N’ikwu okwu banyere amaokwu a, Matthew Henry dere, sị: “N’ebe a a gwara anyị . . . otú ndị ahụ sị kwubie okwu, site n’ozi na baptism Jọn, gaa n’iche banyere Mesaịa ahụ, na iche banyere ya dị onye ga-apụta ngwa ngwa. . . . Izu iri asaa nke Daniel na-agwụ ugbu a.” Manuel Biblique nke French, nke Vigouroux, Bacuez na Brassac dere na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ maara na izu iri asaa nke ọtụtụ afọ nke Daniel kara aka nọ na-abịaru ọgwụgwụ ha; ọ dịghị onye o juru anya ịnụ ka Jọn Baptist mara ọkwa na Alaeze Chineke adịwo nso.” Onye Juu bụ́ onye ọkà mmụta bụ́ Abba Hillel Silver dere na dị ka “usoro ọgụgụ oge a ma ama” nke oge ahụ si dị, “a tụrụ anya Mesaịa ahụ n’ihe dị ka agbata afọ 25 na 50 nke narị afọ mbụ O.A.”
Ihe Omume —Ọ Bụghị Ngụkọ Oge
18. Ọ bụ ezie na amụma Daniel nyeere ndị Juu aka ịmata oge mgbe a pụrụ ịtụ anya mpụta Mesaịa, gịnị bụ ihe àmà kasị doo anya nke ịbụ Mesaịa Jisọs?
18 Ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na usoro ọgụgụ oge nyeere ndị Juu aka ịmara banyere mgbe oge ruuru Mesaịa ahụ ịpụta, ihe ndị mesịrị mee na-egosi na o nyeghị aka ime ka ihe ka ọtụtụ n’ime ha kwenye n’ịbụ Mesaịa nke Jisọs. Ihe na-erughị otu afọ tupu ọnwụ ya, Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ònye ka ọha mmadụ na-asị na Mụ onwe m bụ?” Ha zaghachiri, sị: “Jọn Baptist; ma ndị ọzọ sị, Elaịja: ma ndị ọzọ sị, na otu onye n’ime ndị amụma ochie esiwo n’ọnwụ bilie ọzọ.” (Luk 9:18, 19) Anyị enweghị ihe ndekọ ọ bụla na Jisọs hotara amụma nke izu ihe atụ ahụ iji nwapụta na ya bụ Mesaịa ahụ. Ma n’otu oge, ọ sịrị: “Àmà nke Mụ onwe m ji ka nke Jọn ukwuu: n’ihi na ọrụ nke Nna m nyeworo m ka M rụzuo ha, ọrụ ahụ onwe ha nke M na-arụ, na-agbara m àmà, na Nna m ziteworo m.” (Jọn 5:36) Kama ọgụgụ oge ọ bụla e kpughere ekpughe, nkwusa nke Jisọs, ọrụ ebube ya, na ihe omume ndị gbara ọnwụ ya gburugburu (ọchịchịrị ọrụ ebube, mgbawa nke ákwà mgbochi nke ụlọ nsọ ahụ, na ala ọma jijiji) gbara akaebe na ọ bụ Mesaịa ahụ nke Chineke zitere.—Matiu 27:45, 51, 54; Jọn 7:31; Ọrụ 2:22.
19. (a) Olee otú ndị Kraịst ga-esi mara na mbibi Jerusalem dị nso? (b) N’ihi gịnị ka ọ ka ji dị ndị Kraịst oge mbụ bụ́ ndị si na Jerusalem gbapụ mkpa inwe okwukwe hiri nne?
19 N’otu aka ahụ, mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, e nyeghị ndị Kraịst oge gboo ihe enyemaka ha ga-eji gụkọọ ọgwụgwụ na-abịanụ nke usoro ihe ndị Juu. N’eziokwu, amụma Daniel nke izu ihe atụ ahụ hotara mbibi nke usoro ihe ahụ. (Daniel 9:26b, 27b) Ma nke a ga-eme mgbe ọgwụgwụ nke “izu iri asaa” ahụ (455 T.O.A.–36 O.A.) gasịrị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mgbe ndị Jentaịl mbụ ghọsịrị ụmụazụ Jisọs na 36 O.A., ndị Kraịst agafewo ọgụgụ oge ahụ dị ịrịba ama nke Daniel isi 9. Nye ha, ihe omume, ọ bụghị ọgụgụ oge, ga-egosi na usoro ihe ndị Juu aghaghị ịgwụ n’isi nso. Ihe omume ndị ahụ, ndị Jisọs buru n’amụma, malitere imezu site na 66 O.A., mgbe usuu ndị agha Rom wakporo Jerusalem ma lazie azụ. Nke a nyere ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị na-aṅa ntị nọ na Jerusalem na Judia ohere ‘ịgbalaga n’ugwu.’ (Luk 21:20-22) N’ịbụ ndị na-enweghị ihe nduzi nke ngụkọ oge, ndị Kraịst oge mbụ ahụ amaghị mgbe mbibi Jerusalem ga-abụ. Lee aha okwukwe o were ha ịhapụ ebe obibi, ubi, na ụlọ ọrụ ha na ịpụ na Jerusalem ruo ihe dị ka afọ anọ ruo mgbe ndị agha Rom laghachiri na 70 O.A., ma kpochapụ usoro ihe ndị Juu!—Luk 19:41-44.
20. (a) Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya Noa, Mosis, na ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Judia? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
20 Dị ka Noa, Mosis, na ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Judia, anyị onwe anyị taa pụrụ iji obi ike hapụ oge na ụbọchị n’aka Jehova. Nkwenye anyị kwenyesiri ike na anyị na-ebi n’oge ọgwụgwụ nakwa na mgbapụta anyị na-eru nso na-adabere, ọ bụghị nanị n’ịgbakọ oge, kama n’ihe omume ndị na-eme eme ná mmezu nke amụma Bible. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na anyị na-ebi n’oge ọnụnọ Kraịst, a dịghị ewepụrụ anyị mkpa nke inwe okwukwe na ịnọ na nche. Anyị aghaghị ịnọgide na-adị ndụ n’iji oké mmasị na-atụ anya ihe omume ndị ahụ na-akpali akpali bụ́ ndị e buru amụma ha n’Akwụkwọ Nsọ. Nke a ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
Ná Ntụleghachi
◻ Banyere oge na ụbọchị Jehova, gịnị ka Jisọs gwara ndị ozi ya?
◻ Ruo ogologo oge ha aṅaa tupu o mee ka Noa maara mgbe Iju Mmiri ahụ ga-amalite?
◻ Gịnị na-egosi na Mosis na ụmụ Israel amaghị kpọmkwem mgbe a gaje ịgbapụta ha site n’Ijipt?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe atụ di iche iche nke Bible banyere oge na ụbọchị Jehova?
[Foto dị na peeji nke 11]
Okwukwe Noa nyeere ya aka ịhapụ ihe ndị metụtara oge n’aka Jehova