Olè Ndị Na-agbaso Ìhè Nke Ụwa?
‘Unu bụ ndị na-enye ìhè n’ụwa.’—NDỊ FILIPAỊ 2:15.
1. Gịnị ka Bible na-ekwu banyere ìhè adịgboroja dị iche iche nke okpukpe?
BIBLE mere ka a mara Jisọs n’ụzọ doro anya dị ka “ìhè ukwu,” “ìhè nke ụwa.” (Aịsaịa 9:2; Jọn 8:12) Ma, ihe dị nta n’ọ̀tụ̀tụ̀ gbasoro ya mgbe ọ nọ n’ụwa. Ihe ka ọtụtụ họọrọ ịgbaso ìhè adịgboroja dị iche iche, ndị bụ n’ezie, ndị na-enye ọchịchịrị. Banyere ndị a Okwu Chineke na-asị: “Mmadụ ndị dị otú a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ na-atụ ntụ, ndị na-eme onwe ha ka ha yie ndị ozi Kraịst. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya; n’ihi na Setan onwe ya na-eme onwe ya mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị ihe ukwu ma a sị na ndị na-ejere ya ozi na-emekwa onwe ha ka ha yie ndị na-eje ozi ezi omume; ndị ọgwụgwụ ha ga-adị ka ọrụ ha si dị.”—2 Ndị Kọrint 11:13-15.
2. Gịnị ka Jisọs sịrị ga-abụ ihe ndabere maka ikpe ndị mmadụ ikpe?
2 Ya mere, ọ bụghị mmadụ nile chọrọ ìhè ahụ, n’agbanyeghị otú o si dị ebube. Jisọs sịrị: “Ma nke a bụ ikpe ahụ, na ìhè ahụ abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ; n’ihi na ọrụ ha jọrọ njọ. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya.”—Jọn 3:19, 20.
Ndị Hụrụ Ọchịchịrị n’Anya
3, 4. Olee otú ndị ndú okpukpe n’oge Jisọs si gosi na ha achọghị ịgbaso ìhè ahụ?
3 Tulee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu mgbe Jisọs nọ n’ụwa. Chineke enyewo Jisọs ike ịrụ ọrụ ebube ndị na-akpali akpali dị ka ụzọ nke igosipụta na ọ bụ Mesaịa ahụ. Dị ka ihe atụ, otu Ụbọchị Izu Ike, o mere ka onye kpuru ìsì site n’ọmụmụ malite ịhụ ụzọ. Lee ngosipụta dị ebube nke ebere ọ bụ! Lee aha obi ekele nwoke ahụ nwere! Ọ pụrụ ịhụ ụzọ nke mbụ ná ndụ ya! Otú ọ dị, gịnị bụ mmeghachi omume nke ndị ndú okpukpe ahụ? Jọn 9:16 na-akọ, sị: “Ụfọdụ n’etiti ndị Farisii na-asị [banyere Jisọs], Nwoke a esiteghị n’ebe Chineke nọ, n’ihi na ọ dịghị edebe Ụbọchị Izu Ike.” Lee ka obi ha si bụrụ nke hiere uzọ! N’ebe a, a gwọwo mmadụ n’ụzọ dị ebube, ma kama igosipụta ọṅụ maka nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ, na ekele maka onye ahụ gwọrọ ya, bụ́ onye ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o nwere mmụọ Chineke, ha katọrọ Jisọs! Site n’ime otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha mehiere megide ngosipụta nke mmụọ nsọ Chineke, bụ́ mmehie a na-adịghị agbaghara agbaghara.—Matiu 12:31, 32.
4 Ka e mesịrị, mgbe ndị ihu abụọ ahụ jụrụ nwoke ahụ kpuru ìsì na mbụ ajụjụ banyere Jisọs, nwoke ahụ sịrị: “Ihe ebube dị na nke a, na unu onwe unu amaghị ebe o [Jisọs] si pụta, ma o meghere anya m. Anyị matara na Chineke adịghị anụ olu ndị mmehie: kama ọ bụrụ na onye ọ bula na-ebi isiala nye Chineke, na-emekwa ihe ọ na-achọ, onye ahụ ka ọ na-anụ. Site ná mmalite oge a ọ dịghị mgbe a nụrụ na onye ọ bụla meghere anya onye a mụrụ n’ìsì. Ọ bụrụ na onye a [Jisọs] esiteghị n’ebe Chineke nọ, ọ pụghị ime ihe ọ bụla.” Olee otú ndị ndú okpukpe ahụ si meghachi omume? “Ha zara, sị ya, A mụrụ nnọọ gị onwe gị n’ime mmehie, ọ̀ bụ gị onwe gị na-ezikwa anyị ihe? Ha wee chụpụ ya n’èzí.” Lee enweghị obi ebere ọ bụ! Ha nwere obi nkume. Ya mere Jisọs gwara ha na ọ bụ ezie na ha pụrụ iji anya nkịtị ha hụ ụzọ, ma ha kpuru ìsì n’ụzọ ime mmụọ.—Jọn 9:30-41.
5, 6. Gịnị ka ndị ndú okpukpe nke narị afọ mbụ mere iji gosi na hụrụ ọchịchịrị n’anya?
5 Na ndị okpukpe ihu abụọ ndị a na-emehie megide mmụọ nsọ Chineke bụ nke a hụrụ nke ọma n’oge ọzọ, mgbe Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. N’ihi ọrụ ebube ahụ, ọtụtụ n’ime ndị nkịtị nwere okwukwe na Jisọs. Otú ọ dị, rịba ama ihe ndị ndú okpukpe ahụ mere. “Ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọrọ nnọkọ ikpe ka ha zukọọ, sị, Gịnị ka anyị na-eme? n’ihi na nwoke a na-eme ọtụtụ ihe dị ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” (Jọn 11:47, 48) Ha na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ ha na ọbụbụ ha bụ ndị a ma ama. N’agbanyeghị ihe ọ ga-ewe, ha chọrọ ime ihe ga-atọ ndị Rom ụtọ, ọ bụghị Chineke. Ya mere gịnị ka ha mere? “Ya mere site n’ụbọchị ahụ ha gbara izu ka ha wee gbuo [Jisọs].”—Jọn 11:53.
6 Ọ̀ gwụla nke ahụ? Ee e. Ihe ọzọ ha mere na-egosi otú ha si hụ ọchịchịrị n’anya: “Ndị isi nchụàjà gbara izu ka ha wee gbuokwa Lazarọs; n’ihi na ọ bụ n’ihi ya ka ọtụtụ n’ime ndị Juu na-apụ, na-ekwerekwa na Jisọs.” (Jọn 12:10, 11) Lee obi ịta mmiri nke a bụ! Ọ bụ ezie na ha mere ihe ndị a nile ka ha chebe ọnọdụ ha, gịnị mere? N’otu ọgbọ ahụ, ha nupụụrụ ndị Rom isi, bụ ndị bịakwasịrị ha na 70 O.A. ma were ọnọdụ ha, mba ha, nakwa ndụ ha!—Aịsaịa 5:20; Luk 19:41-44.
Ebere Jisọs
7. N’ihi gịnị ka ndị hụrụ eziokwu n’anya ji nusoo Jisọs?
7 Otú ahụkwa n’oge anyị, ọ bụghị mmadụ nile chọrọ ìhè ime mmụọ. Ma ndị hụrụ eziokwu n’anya na-achọ ịbịa n’ìhè ahụ. Ha na-achọ ka Chineke bụrụ Ọkaaka ha, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi na-echigharịkwuru Jisọs, bụ́ onye ahụ Chineke zitere ịkọwa ihe ìhè ahụ bụ ma gbasoo ya. Nke ahụ bụ ihe ndị dị umeala n’obi mere mgbe Jisọs nọ n’ụwa. Ha nusoro ya. Ọbụna ndị Farisii ahụ kwetara nke ahụ. Ha kpesara, sị: “Ụwa ejesowo ya n’azụ.” (Jọn 12:19) Ndị yiri atụru hụrụ Jisọs n’anya n’ihi ha ọ dị nnọọ iche ná ndị ndú okpukpe ahụ na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, dị mpako ma nwee agụụ inweta ikike, bụ́ ndị Jisọs kwuru banyere ha, sị: “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ; ma ha onwe ha achọghị iji otu mkpịsị aka ha wezụga ha. Ma ọrụ ha nile ka ha na-arụ ka mmadụ wee kirie ha.”—Matiu 23:4, 5.
8. N’ụzọ dị iche na nke ndị okpukpe ahụ nwere ihu abụọ, àgwà dị aṅaa ka Jisọs nwere?
8 N’ụzọ megidere nke ahụ, rịba àgwà obi ebere nke Jisọs ama: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ nile, o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Gịnịkwa ka o mere banyere ya? Ọ gwara ndị ahụ usoro ihe Setan rikpuworo, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:28-30) Jisọs mere ihe e kwuru banyere ya n’Aịsaịa 61:1, 2, nke na-agụ, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; o zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ; ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere; ịkasi ndị nile na-eru újú obi.”
Ịchịkọta Ndị Na-enye Ìhè
9. Gịnị bụ oké ihe omume ndị mere na 1914?
9 Ka ọ laghachisịrị n’eluigwe, Jisọs ga-echere ruo mgbe oge ruru ka Chineke nye ya ikike Alaeze. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekewapụta “atụrụ” site “n’ụmụ ewu.” (Matiu 25:31-33; Abụ Ọma 110:1, 2) Oge ahụ ruru, oge “mgbe ikpeazụ” malitere na 1914. (2 Timoti 3:1-5) Jisọs, onye e nyere ikike dị ka Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke malitere ịchịkọta ndị chọrọ ịgbaso ìhè ahụ gaa n’akụkụ aka nrị nke amara ya. Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, ọrụ nchịkọta ahụ jiri oké ọsọ gaa n’ihu.
10. Ajụjụ dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ banyere ndị ahụ Jisọs ji eme ihe n’ọrụ nchịkọta ahụ?
10 N’okpuru idu ndú nke Kraịst Jisọs, e jiriwo oké ihe ịga nke ọma gọzie ọrụ nchịkọta ahụ. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme mgbe e nwere ọtụtu mmadụ ndị sitere ná mba dị iche iche zukọtaworo ọnụ n’ezi ofufe nke e mere ka ìhè mụkwasị. Ọ bụkwa olè ndị taa na-agbaso ìhè ahụ sitere n’ebe Chineke na Kraịst nọ abịa? Olè ndị na-eme ihe Ndị Filipaị 2:15 na-ekwu, “ndị na-enye ìhè n’ụwa,” na-akpọ ndị ọzọ òkù ka ha ‘bịa nara mmiri nke ndụ n’efu’?—Mkpughe 22:17.
11. Gịnị bụ ọnọdụ Krisendọm n’ihe banyere ìhè ime mmụọ?
11 Krisendọm ọ̀ na-eme nke ahụ? Krisendom na okpukpe ya nile kewasịrị ekewasị n’ezie adịghị enwupụ dị ka ihe na-enye ìhè. N’ezie ndị ụkọchukwu dị nnọọ ka ndị ndú okpukpe nke oge Jisọs. Ha adịghị enwupụta ezi ìhè si n’aka Chineke na Kraịst. Iri afọ atọ na atọ gara aga, magazin bụ́ Theology Today sịrị: “Ọ dị nwute na a ghaghị ikwenye na ìhè nke a adịghị enwupụta nke ọma na Chọọchị. . . . Chọọchị yikwara ka ọ na-adịwanye ka òtù ụmụ mmadụ ndị gbara ya gburugburu. Ọ bụkebeghị ìhè nke ụwa otú o si bụrụ nnwupụta nke ìhè ndị na-enwu n’ụwa n’onwe ya.” Ọbụna ọnọdụ nke Krisendọm kakwa njọ taa. Ihe nke a kpọrọ ìhè nke ọ na-enwupụta site n’ụwa bụ n’ezie ọchịchịrị n’ihi na nke ahụ bụ nanị ihe Setan na ụwa ya nwere inye. Ee e, e nweghị ìhè eziokwu ọ bụla na-abịa site n’okpukpe ụwa ndị na-eburịta iro nke Krisendọm.
12. Olè ndị mejupụtara ezi nzukọ ahụ na-enye ìhè taa?
12 A pụrụ iji obi ike kwuo na ọ bụ nanị òtù ụwa ọhụrụ nke Ndịàmà Jehova bụ nzukọ nke bụ ezie, nke na-enye ìhè taa. N’ịdị n’otu, ndị òtù ya nile—ndị ikom, ndị inyom, na ndị ka na-eto eto kwa—na-eme ka ìhè ha sitere n’aka Jehova na Kraịst nwuo n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ. N’afọ gara aga, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 70,000 ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, ihe gafere nnọọ nde ndị na-enye ìhè anọ na-arụsi ọrụ ike n’ịgwa ndị ọzọ banyere Chineke na nzube ya dị iche iche. Ugbu a kwa, kwa afọ anyị na-ahụ oké nchịkọta na-aga n’ihu nke ndị chọrọ inweta nghọta n’ụzọ ime mmụọ. A na-eme ọtụtụ narị puku baptism mgbe ha mụsịrị Bible ma nweta ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ. N’eziokwu, Chineke “na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.
13. Gịnị ka anyị pụrụ iji tụnyere ìhè ahụ nke na-esi n’ebe Jehova nọ abịa?
13 Anyị pụrụ iji ihe ọmụma si n’aka Jehova na-abịa tụnyere ihe mere mgbe ndị Chineke nke oge ochie hapụrụ Ijipt: “Jehova na-eje n’ihu ha n’ehihie n’ogidi igwe ojii, iduru ha n’ụzọ; na n’abalị n’ogidi ọkụ, inye ha ìhè; ka ha wee na-eje ehihie na abalị.” (Ọpụpụ 13:21, 22) Igwe ojii n’ehihie na ọkụ n’abalị bụ ihe nduzi ndị a pụrụ ịdabere na ha ndị sitere n’aka Chineke. Ha kwesịrị ndabere dị ka anyanwụ nke Chineke kere iji nye anyị hour nile nke ìhè n’ụbọchị. Otú ahụkwa, anyị pụrụ ijide n’aka na anyị pụrụ ịdabere na Jehova ime ka ìhè dị n’ụzọ ime mmụọ maka ndị na-achọ eziokwu n’oge ikpeazụ ndị a jọrọ njọ. Ilu 4:18 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ma okporo ụzọ nke onye ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”
Inwupụta Ìhè nke Alaeze
14. Gịnị ga-abụrịrị nzube bụ isi nke ndị na-enye ìhè?
14 Ọ bụ ezie na Jehova bụ Isi Iyi nke inye ìhè, Kraịst bụrụkwa Onye Bụ Isi Na-enwupụta ìhè ahụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị inwupụtakwa ya. O kwuru banyere ha, sị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu nke bi n’eluigwe.” (Matiu 5:14, 16) Gịnịkwa bụ isiokwu bụ isi nke ìhè nke a nke ndị na-eso ụzọ ya ga-eme ka o nwuo n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ? Gịnị ka ha ga-akụzi n’ọgwụgwụ nke a nke akụkọ ihe mere eme nke ụwa? Jisọs asịghị na ndị na-eso ụzọ ya ga-ekwusa ọchịchị onye kwuo uche ya, ọchịchị o kwuchaa ọgwụ, njikọ nke Chọọchị na Ọchịchị, ma ọ bụ echiche ọ bụla ọzọ nke ụwa. Kama nke ahụ, na Matiu 24:14 o buru amụma na n’ihu mkpagbu ụwa nile, “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Otú a, ndị na-enye ìhè taa na-agwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke, nke ga-eweta ụwa Setan ná njedebe ma webata ụwa ọhụrụ nke ezi omume.—1 Pita 2:9.
15. Ndị chọrọ ìhè ahụ ga-eche ihu n’olè ebe?
15 Agaghị eji okwu ọnụ na ihe mgbaru ọsọ ụwa nke a dọpụ uche nke ndị hụrụ ìhè n’anya. Nzọrọ na ihe mgbaru ọsọ ndị ahụ ga-ekupụsị dị ka úzù n’oge na-adịghị anya, ebe ụwa na-erute ọgwụgwụ ya. Kama nke ahụ, ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-achọ ichigharịkwuru ozi ọma nke ndị na-eme ka ìhè nke Alaeze Chineke nwuo n’akụkụ nile nke ụwa, na-ekwusa. Ndị a bụ ndị e buru n’amụma ná Mkpughe 7:9, 10, nke na-asị: “M wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si na mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze [Chineke] na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ [Kraịst] . . . ha wee were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” Amaokwu nke 14 na-asị: “Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” Ee, ha lanarịrị ọgwụgwụ nke ụwa nke a baa n’ụwa ọhụrụ na-adịghị agwụ agwụ n’okpuru Alaeze Chineke.
Ụwa Ọhụrụ E Mere Ka Ìhè Mụkwasị
16. Gịnị ga-eme ụwa Setan n’oké mkpagbu ahụ?
16 A ga-erikpu ụwa ọhụrụ ahụ n’ime ìhè na-egbukepu egbukepu nke eziokwu. N’ezie, cheedị ihe ọnọdụ ga-abụ n’ụbọchị na-esochi mgbe Chineke wetasịrị usoro ihe nke a ná ngwụsị. Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na okpukpe ya ga-apụ n’anya—ha nile! Ụzọ nile nke Setan si agbasa ozi ụgha ga-apụkwa n’anya. Otú a, mgbe Amagedọn gasịrị, a gaghị enwe ọbụna otu akwụkwọ akụkọ, magazin, akwụkwọ, akwụkwọ nta, ma ọ bụ mpempe akwụkwọ e biri ebi nke na-akwado ụwa ajọ omume nke a. A gaghị enwe ihe ọ bụla na-emerụ emerụ nke a na-ewepụta site n’ụlọ ọrụ telivishọn ma ọ bụ redio. A ga-eji otu oké ihe otiti kpochapụ mmetụta nile na-egbu egbu nke ụwa Setan!—Matiu 24:21; Mkpughe 7:14; 16:14-16; 19:11-21.
17, 18. Olee otú ị ga-esi kọwaa ọnọdụ ga-adị mgbe ụwa Setan bịasịrị ná njedebe?
17 Lee oké nnwere onwe nke ahụ ga-abụ! Site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu, ọ ga-abụ nanị ìhè ime mmụọ nke dị ọcha, na-ewuli elu, nke sitere n’aka Jehova na Alaeze ya, ga-enwe mmetụta n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ. Aịsaịa 54:13 buru n’amụma, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” Mgbe ọchịchị Chineke malitere inwe ike n’elu ụwa nile, dị ka Aịsaịa 26:9 na-ekwu, nkwa ya bụ na “ezi omume ka ndị bi n’elu ụwa dum mmadụ bi mụtaworo.”
18 Ngwa ngwa, ọnọdụ nile nke uche na nke ime mmụọ ga-agbanwe gaa n’ihe ka mma. Ihe ndị na-ewuli elu ga-ejupụta n’ebe nile kama ihe ndị na-akụda mmụọ ndị rụrụ arụ, jupụtara n’ebe nile ugbu a. A ga-akụziri onye ọ bụla dị ndụ mgbe ahụ eziokwu banyere Chineke na nzube ya. N’echiche kasị zuo ezu, amụma nke Aịsaịa 11:9 ga-emezu, nke na-asị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”
Ọ Dị Ngwa Ịgbaso Ìhè Ahụ
19, 20. N’ihi gịnị ka ndị chọrọ ịgbaso ìhè ahụ na-aghaghị iji nọrọ na nche?
19 Ugbu a, n’afọ ndị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe nke a, ọ dị ngwa ịgbaso ìhè nke ụwa. Anyị kwesịkwara ịnọ na nche, n’ihi na e nwere oké agha a na-alụ iji gbochie anyị ịga ije n’ìhè ahụ. Mmegide nke a na-abịa site n’ike nile nke ọchịchịrị—site n’aka Setan, ndị mmụọ ọjọọ ya, na nzukọ elu ala ya. Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji na-adọ aka na ntị, sị: “Nweenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.”—1 Pita 5:8.
20 Setan ga-etinye ihe mgbochi n’ụzọ nke ndị na-abịakwute ìhè ahụ, n’ihi na ọ chọrọ ka ha nọgide n’ọchịchịrị. Ọ pụrụ ịbụ nrụgide site n’aka ndị ikwu ma ọ bụ ndị bụbu enyi, ndị na-emegide eziokwu. Ọ pụrụ ịbụ ịrụ Bible ụka n’ihi mmadụ ịbụ onye e meworo ka o kpuo ìsì site n’ozizi okpukpe ụgha ma ọ bụ ozi ụgha nke ndị na-ekweghị na Chineke na ndị na-amaghị ma Chineke ọ dị. Ọ pụrụ ịbụ ọchịchọ mmadụ ime ihe ọjọọ na-eme ka o siere ya ike ịdị ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Chineke chọrọ.
21. Gịnị ka ndị nile chọrọ ịdị ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwesịrị ime?
21 N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a pụrụ inwe, ị̀ chọrọ ịdị ndụ n’ụwa nke a na-enweghị ịda ogbenye, mpụ, ikpe na-ezighị ezi, na agha? Ị̀ chọrọ n’ezie inwe ahụ ike zuru okè na ndụ ebighị ebi n’ụwa nke bụ paradaịs? Mgbe ahụ nabata Jisọs n’ezie dị ka ìhè nke ụwa, geekwa ntị n’ozi nke ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-ejisi “okwu nke ndụ” ike na “ndị na-enye ìhè n’ụwa.”—Ndị Filipaị 2:15, 16.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú ndị ndú okpukpe si egosi na ha bụ ndị hụrụ ọchịchịrị n’anya?
◻ Àgwà dị aṅaa ka Jisọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ?
◻ Olee otú nchịkota nke ndị na-enye ìhè siworo gaa n’ihu?
◻ Oké mgbanwe dịgasị aṅaa ga-ewere ọnọdụ n’isi nso?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ịgbaso ìhè nke ụwa taa?
[Foto dị na peeji nke 14, 15]
Ndị Farisii ahụ obi kpọrọ nkụ chụpụrụ nwoke ahụ Jisọs megheworo anya ya