Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 11/02 p. 1
  • Mee Ka A Mata Eziokwu Banyere Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee Ka A Mata Eziokwu Banyere Jizọs
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ụzọ na Eziokwu na Ndụ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eso “Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 11/02 p. 1

Mee Ka A Mata Eziokwu Banyere Jizọs

1 Ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị atụrụ ọzọ ahụ bụ́ ndị ọrụ ibe ha na-enyere aka, ‘nwere ọrụ ịgba àmà banyere Jizọs.’ (Mkpu. 12:17) Nke a bụ ọrụ dị mkpa, ebe ọ bụ na ọ ga-ekwe omume inweta nzọpụta nanị site na ya.—Jọn 17:3; Ọrụ 4:12.

2 ‘Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ’: “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ,” ka Jizọs kwuru. “Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) Ọ bụ nanị site na Jizọs, bụ́ “ụzọ,” ka anyị pụrụ isi jekwuru Chineke n’ekpere ma soro Ya nwee ezi mmekọrịta. (Jọn 15:16) Jizọs bụ “eziokwu” n’ihi na amụma na onyinyo ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru mezuru n’ebe ọ nọ. (Jọn 1:17; Kọl. 2:16, 17) N’ezie, nzube bụ́ isi nke ezi amụma bụ ime ka a matakwuo ọrụ dị oké mkpa ọ na-arụ ná mmezu nke nzube Chineke. (Mkpu. 19:10) Ọzọkwa, Jizọs bụ “ndụ.” Iji nweta onyinye nke ndụ ebighị ebi, mmadụ nile aghaghị inwe okwukwe n’àjà mgbapụta ọ chụrụ.—Jọn 3:16, 36; Hib. 2:9.

3 Onyeisi na Eze Na-achị Achị: Ndị mmadụ aghaghịkwa ịnakwere ikike ịchịisi dị ukwuu nke Jehova nyeworo Ọkpara ya. E chiwo Jizọs Eze nke Alaeze Chineke—‘ọ bụ ya nwe ịṅa ntị ndị dị iche iche.’ (Jen. 49:10) Tụkwasị na nke a, Jehova ahọpụtawo ya ịbụ Onyeisi nke ọgbakọ. (Efe. 1:22, 23) Ọ dị anyị mkpa inyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka ịghọta otú Jizọs si eduzi ọgbakọ ma na-eji “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-enye ‘nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị.’—Mat. 24:45-47.

4 Nnukwu Onye Nchụàjà nke Na-eme Ebere: N’ịbụ onye a nwaworo ọnwụnwa ma taa ahụhụ dị ka mmadụ, Jizọs “nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” (Hib. 2:17, 18) Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ nye ụmụ mmadụ na-ezughị okè ịmata na Jizọs na-emetara ha ebere n’adịghị ike ha ma jiri obiọma na-arịọrọ ha arịrịọ! (Rom 8:34) Dabere n’àjà Jizọs nakwa site n’ije ozi ya dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà, anyị pụrụ iji “nkwuwa okwu” bịaruo Jehova nso iji nweta “enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.”—Hib. 4:15, 16.

5 Ka mgbalị anyị na-eme iji mee ka ndị ọzọ mata eziokwu banyere Jizọs kpalie ha iso anyị na-erube isi ma na-ejere ya ozi n’ịdị n’otu.—Jọn 14:15, 21.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya