Mmụọ Nsọ—Ike Ọrụ Chineke
DỊ KA ozizi Atọ n’Ime Otu si kwuo, mmụọ nsọ bụ onye nke atọ nke Chiatọ ahụ, onye ya na Nna ahụ na Ọkpara ahụ hà nhata. Dị ka akwụkwọ ahụ bụ Our Orthodox Christian Faith si na-ekwu: “Mmụọ Nsọ bụ Chineke n’ụzọ nile.”
N’akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru, okwu e jikarị mee ihe maka “mmụọ” bụ ruʹach, nke pụtara “umere; ifufe, mmụọ.” N’akụkụ Akwụkwọ nsọ Grik, okwu e ji mee ihe bụ pneuʹma, na-enwekwa otu ụdị nkọwa ahụ. Okwu ndị a hà na-egosi na mmụọ nsọ bụ otu akụkụ nke Atọ n’Ime Otu?
Ike Ọrụ
OTÚ Bible si jiri “mmụọ nsọ” mee ihe na-egosi ike e jikwara ejikwa nke Jehova Chineke ji eme ihe iji mezuo nzube ya dị iche iche. Ruo n’ókè ụfọdụ, a pụrụ iji ya tụnyere ike eletrik, bụ́ ike nke a pụrụ iji mee ihe n’ịrụ oké ọrụ dị iche iche.
Na Jenesis 1:2 (NW) Bible na-ekwu na “ike ọrụ Chineke [“mmụọ” (Hibru, ruʹach)] na-erugharị n’elu ogbu mmiri ahụ.” N’ebe a, mmụọ Chineke bụ ike ọrụ ya nke na-arụ ọrụ iji kpụọ ụwa.
Chineke na-eji mmụọ ya eme ihe iji nye ndị na-ejere ya ozi nghọta. Devid kpere ekpere, sị: “Zi m ime ihe dị gị ụtọ; n’ihi na gị onwe gị bụ Chineke m: mmụọ [ruʹach] gị dị mma; duru m n’ala dị larịị.” (Abụ Ọma 143:10) Mgbe a họpụtara 70 ndị ikom ruru eru inyere Moses aka, Chineke gwara ya, sị: “M ga-anarakwa ụfọdụ n’ime mmụọ [ruʹach] ahụ nke dịkwasị gị, tụkwasị ha.”—Ọnụ Ọgụgụ 11:17.
E dekọrọ amụma Bible mgbe ‘mmụọ nsọ [Grik, site na pneuʹma] na-eme ka ndị ikom Chineke kwuo okwu.’ (2 Pita 1:20, 21) N’ụzọ dị otú a, ihe e deworo na Bible “si n’obi Chineke pụta,” nke okwu Grik e nwere maka ya bụ The·oʹpneu·stos, nke pụtara “umere nke Chineke.” (2 Timoti 3:16) Mmụọ nsọ duzikwara ndị ụfọdụ ka ha hụ ọhụụ ma ọ bụ rọọ nrọ amụma.—2 Samuel 23:2; Joel 2:28, 29; Luk 1:67; Ọrụ 1:16; 2:32, 33.
Mmụọ nsọ kwaliri Jisọs ka ọ gaa n’ime ọhịa mgbe o mesịrị baptism. (Mak 1:12) Mmụọ ahụ dị ka ọkụ n’ebe ndị ohu Chineke nọ, na-eji ike ahụ mee ka ha dị ike. O mekwara ka ha jiri obi ike kwuo okwu n’atụghị egwu.—Maịka 3:8; Ọrụ 7:55-60; 18:25; Ndị Rom 12:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:19.
Site na mmụọ ya, Chineke na-ekpe ụmụ mmadụ na mba dị iche iche ikpe. (Aịsaịa 30:27, 28; 59:18, 19) Mmụọ Chineke pụkwara irute n’ebe ọ bụla, na-emere ndị mmadụ ihe ma ọ bụ na-emegide ha.—Abụ Ọma 139:7-12.
“Ọkịka nke Ike”
MMỤỌ Chineke pụkwara inye ndị na-ejere ya ozi “ọkịka nke ike.” (2 Ndị Kọrint 4:7) Nke a na-enyere ha aka inwe ntachi obi mgbe a na-anwa okwukwe ha ma ọ bụ ime ihe ndị ha na-apụghị inwe ike ime n’onwe ha.
Dị ka ihe atụ, banyere Samson, Ndị Ikpe 14:6 na-akọ, sị: “Mmụọ nke Yahweh jigidere ya, ọ bụkwarịị eziokwu na o jighị ngwá ọgụ ọ bụla n’aka ya, ọ dọwasịrị ọdụm ahụ.” (JB) Onye bụ chi ọ̀ banyere n’ezie ma ọ bụ jigide Samson, na-akpali ahụ ya ime ihe ọ mere? Ee e, ọ bụ n’ezie, “ike nke ONYENWE anyị mere ka Samson dị ike.”—TEV.
Bible na-ekwu na mgbe e mere Jisọs baptism, mmụọ nsọ dakwasịrị ya, na-adị n’ụdị nke nduru, ọ bụghị n’ụdịdị nke mmadụ. (Mak 1:10) Ike ọrụ nke a nke Chineke bụ ihe mere ka Jisọs gwọọ ndị ọrịa ma kpọlie ndị nwụrụ anwụ. Dị ka Luk 5:17 si na-ekwu: “Ike nke Onyenwe anyị [Chineke] dinyeere ya [Jisọs] n’ọrụ ya nke ịgwọ ọrịa.”—JB.
Mmụọ Chineke nyekwara ndị na-eso ụzọ Jisọs ike ịrụ ọrụ ebube dị iche iche. Ọrụ Ndị Ozi 2:1-4 na-akọ na ndị ahụ na-eso ụzọ zukọrọ ọnụ na Pentikọst mgbe e nwere “na mberede ụ̀zụ̀, dị ka nke oké ifufe nke na-efesi ike, . . . ha nile wee jupụta ná mmụọ nsọ, ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, dị ka mmụọ ahụ na-enye ha ike ikwuwa okwu.”
Ya mere mmụọ nsọ ahụ nyere Jisọs na ndị ohu ndị ọzọ nke Chineke ike ime ihe ụmụ mmadụ nkịtị na-apụghị ime.
Ọ Bụghị Onye
OTÚ ọ dị, ọ̀ bụ na e nweghị amaokwu Bible ndị na-ekwu banyere mmụọ nsọ dị ka onye? Ee, ma rịba ama ihe onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ́ Edmund Fortman na-ekwu banyere nke a n’akwụkwọ bụ The Triune God: “Ọ bụrịị eziokwu na a na-ekwu okwu mgbe mgbe banyere mmụọ nsọ dị ka onye, o yiri ka ọ bụ ihe doro anya nke ọma na ndị ahụ dere ihe odide dị nsọ [nke Akwụkwọ nsọ Hibru] adịghị mgbe ọ bụla ha chere ma ọ bụ dee banyere mmụọ nke a dị ka onye dịịrị onwe ya.”
N’Akwụkwọ nsọ, ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkebe na a na-eme ka ihe yie ka a ga-asị na ọ bụ onye. E kwuru na amamihe nwere ụmụ. (Luk 7:35) A kpọrọ mmehie na ọnwụ ndị eze. (Ndị Rom 5:14, 21) Na Jenesis 4:7 The New English Bible (NE) na-asị: “Mmehie bụ mmụọ ọjọọ nke na-amakpu n’ọnụ ụzọ,” na-enye mmehie ụdịdị nke ịbụ onye, dị ka mmụọ ọjọọ nke na-amakpu n’ọnụ ụzọ Ken. Ma, n’ezie, mmehie abụghị onye bụ mmụọ; otú ahụkwa, ịkọwa mmụọ nsọ dị ka onye adịghị eme ya ka ọ bụrụ onye bụ mmụọ.
N’otu aka ahụ, na 1 Jọn 5:6-8 (NE) ọ bụghị nanị mmụọ ahụ, kamakwa “mmiri, na ọbara” ka a sịrị na ha bụ “ndịàmà.” Ma o doro anya na mmiri na ọbara abụghị ndị, otú ahụkwa ka mmụọ nsọ na-abụghị onye.
Ihe kwekọrọ na nke a bụ ojiji Bible na-ejikarị “mmụọ nsọ” na-eme ihe n’ụzọ na-adịghị egosi ịbụ onye, dị ka iji ya tụnyere mmiri na ọkụ. (Matiu 3:11; Mak 1:8) A na-agba ụmụ mmadụ ume ka ha jupụta ná mmụọ nsọ kama ijupụta ná mmanya. (Ndị Efesọs 5:18) A na-ekwu okwu banyere ha dị ka ndị jupụtara ná mmụọ nsọ n’otu ụzọ ahụ ha jupụtara n’àgwà ndị ahụ dị ka amamihe, okwukwe, na ọṅụ. (Ọrụ 6:3; 11:24; 13:52) Ná 2 Ndị Kọrint 6:6 a gụnyekwara mmụọ nsọ n’àgwà dị iche iche. A gaghị ahụkarị okwu ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ bụ onye n’ezie.
Ọzọkwa, ebe amaokwu ụfọdụ ndị dị na Bible na-asị na mmụọ nsọ kwuru okwu, amaokwu ndị ọzọ na-egosi na n’ezie, ọ bụ site n’ọnụ ụmụ mmadụ ma ọ bụ ndị mmụọ ozi. (Matiu 10:19, 20; Ọrụ 4:24, 25; 28:25; Ndị Hibru 2:2) Ọrụ nke mmụọ nsọ ahụ n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ yiri nke ikuku redio, bụ́ nke na-ezipụ ozi site n’aka otu onye gaa na nke onye ọzọ nọ n’ebe dị anya.
Na Matiu 28:19 e zoro aka “n’aha . . . nke mmụọ nsọ.” Ma okwu ahụ bụ “aha” adịghị egosi aha mmadụ mgbe nile, ma n’asụsụ Grik ma n’asụsụ Igbo. Mgbe anyị na-asị “n’aha iwu,” anyị adịghị ezo aka n’ebe mmadụ nọ. Anyị na-ekwu banyere ihe iwu nọchiri anya ya, ikike o nwere. Akwụkwọ Robertson nke bụ Word Pictures in the New Testament na-asị: “Ojiji e ji aha (onoma) mee ihe n’ebe a bụ nke a na-ahụkarị na Septuagint ahụ nakwa n’ihe odide papyrus iji nọchie anya ike ma ọ bụ ikike.” Ya mere, baptism ‘baa n’aha nke mmụọ nsọ’ na-amata ikike nke mmụọ ahụ nwere, na o sitere n’ebe Chineke nọ ma na-arụ ọrụ dị ka Chineke si chọọ.
“Onye Inyeaka” ahụ
JISỌS kwuru okwu banyere mmụọ nsọ ahụ dị ka “onye inyeaka,” o kwukwara na ọ ga-akụzi ihe, duzie ụzọ, ma kwuo okwu. (Jọn 14:16, 26; 16:13) Okwu Grik o ji mee ihe maka onye inyeaka (pa·raʹkle·tos) dị n’ụdị e ji eme ihe maka ihe bụ oké. Ya mere, mgbe Jisọs na-ezo aka n’ihe onye inyeaka ahụ ga-eme, o ji nnọchiaha ndị na-egosi onye bụ oké mee ihe. (Jọn 16:7, 8) N’aka nke ọzọ, mgbe e ji okwu Grik ahụ na-egosi ihe nkịtị (pneuʹma) mee ihe maka mmụọ ahụ, a na-eji okwu na-anọchite anya ihe nkịtị mee ihe n’ụzọ ziri ezi.
Ihe ka ukwuu ná ndị nsụgharị kwere n’Atọ n’Ime Otu adịghị eme ka a mara eziokwu nke a, dị ka New American Bible nke ndị Katọlik kwetara banyere Jọn 14:17, sị: “Okwu Grik e nwere maka ‘Mmụọ’ na-egosi ihe nkịtị, ebe ọ bụkwa eziokwu na anyị na-eji nnọchiaha nke mmadụ eme ihe n’asụsụ Bekee, ọtụtụ MSS [ihe odide] nke Grik na-eji nnọchiaha nke na-egosi ihe nkịtị na-eme ihe.”
Ya mere mgbe Bible na-eji nnọchiaha nke onye bụ nwoke na-eme ihe n’ihe metụtara pa·raʹkle·tos na Jọn 16:7, 8, ọ bụ ihe kwekọro n’ụkpụrụ nile nke ụtọ asụsụ, ọ dịghị egosipụta nkwenkwe.
Ọ Bụghị Akụkụ nke Atọ n’Ime Otu
ỌTỤTỤ ndị na-amata na Bible adịghị akwado echiche ahụ bụ na mmụọ nsọ bụ onye atọ nke Atọ n’Ime Otu. Dị ka ihe atụ:
Akwụkwọ bụ The Catholic Encyclopedia: “Ọ dịghị ebe ọ bụla n’Agba Ochie nke anyị na-ahụ ihe ọ bụla doro anya nke na-egosi Onye nke Atọ.”
Onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ Fortman: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla ndị Juu ji lee mmụọ ahụ anya dị ka onye; ọ dịghịkwa ihe àmà ọ bụla siri ike e nwere na ọ dị onye ọ bụla so dee Agba Ochie nke nwere echiche dị otú ahụ. . . . Dị ka o si adịkarị, e dere ihe banyere Mmụọ Nsọ n’Akwụkwọ [Oziọma] Atọ Ndị Mbụ nke Agba Ọhụrụ na n’Ọrụ Ndị Ozi, dị ka ike ma ọ bụ ikike Chineke.”
Akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia: “A[gba] O[chie] n’ụzọ doro anya akọwaghị mmụọ Chineke dị ka onye . . . mmụọ Chineke bụ nanị ike Chineke. Ọ bụrụ na a na-ewere ya mgbe ụfọdụ dị ka ihe dị iche n’ebe Chineke nọ, ọ bụ n’ihi na ike Yahweh na-arụ ọrụ n’ụzọ dịịrị onwe ya.” Ọ na-ekwukwa, sị: “Ihe ka ukwuu n’ihe odide A[gba] Ọ[hụru] na-egosi mmụọ Chineke dị ka ihe, ọ bụghị onye; nke a bụ nke a na-ahụ karịsịa ná myirịta dị n’etiti mmụọ ahụ na ike nke Chineke.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
Akwụkwọ bụ A Catholic Dictionary: “N’ozuzu ya, Agba Ọhụrụ, dịkwa ka nke Ochie, na-ekwu banyere mmụọ ahụ dị ka ume ma ọ bụ ike Chineke.”
N’ihi nke a, ma ndị Juu ma ndị Kraịst oge gboo adịghị nke lere mmụọ nsọ anya dị ka akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. Ozizi ahụ bịara mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị. Dị ka akwụkwọ bụ A Catholic Dictionary si na-ekwu: “E wepụtara onye nke atọ na Kansụl nke Alexandria na 362 . . . e mesịakwa, na Kansụl Constantinople nke 381”—ihe dị ka narị afọ atọ na ọkara mgbe mmụọ nsọ dakwasịchara ndị ahụ na-eso ụzọ na Pentikọst!
Ee e, mmụọ nsọ abụghị onye, ọ bụghịkwa akụkụ nke Atọ n’Ime Otu. Mmụọ nsọ bụ ike ọrụ Chineke nke o ji eme ihe n’imezu nzube ya. Ya na Chineke ahaghị nhata, kama ọ dị ya n’aka mgbe nile iji mee ihe ma ma na-arụkwa ihe ọ chọrọ ka ọ rụọ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]
“N’ozuzu ya, Agba Ọhụrụ, dịkwa ka nke Ochie, na-ekwu banyere mmụọ ahụ dị ka ume ma ọ bụ ike Chineke.”—A Catholic Dictionary
[Foto ndị dị na peeji nke 21]
N’otu oge, mmụọ nsọ bịara dị ka nduru. N’oge ọzọ, ọ bịara n’ụdịdị nke ire ọkụ—ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ bịara dị ka onye