Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ws isi 3 p. 21-28
  • Ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ n’Etiti Ndị Iro

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ n’Etiti Ndị Iro
  • Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmezu Ka Ukwuu nke Abụ Ọma nke 2
  • E Mee Ka “Nwa Devid” Nọkwasị n’Ocheeze n’Eluigwe
  • E Wedara Ya n’Ala, Ekwensu Wee Buo Agha
  • ‘Ụkpụrụ Jehova’ Apụghị Ịda Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Idozi Ihe Iseokwu Eluigwe Na Ala Ahụ Ruo Mgbe Ebighị Ebi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nweenụ Ekele—Alaeze Mesaịa nke Jehova Na-achị Achị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
ws isi 3 p. 21-28

Isi 3

Ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ n’Etiti Ndị Iro

1, 2. (a) Okwu dị aṅaa nke o ji sị ha nọdụ nke ọma ka Jisọs Kraịst gwara otu ìgwè nke ndị na-eso ụzọ ya? (b) Nke a ọ̀ pụtara ịtọghata ụwa dum tupu mgbe ọ ga-amalite ịchị dị ka “Onyeisi Udo”?

N’OGE na-adịghị anya tupu ọ rịgoro n’eluigwe ihe karịrị narị afọ 19 gara aga, onye ahụ gaje ịbụ “Onyeisi Udo” n’ọdịnihu bụ́ Jisọs Kraịst, gwara otu ìgwè nke ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi okwu ndị a o ji sị ha nọdụ nke ọma: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptism baa n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke mmụọ nsọ . . . ma lee, mụ onwe m, nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.”​—⁠Matiu 28:​19, 20.

2 Okwu ndị ahụ nke Jisọs ọ̀ pụtara na a gaatọghata ụwa nile tupu “ọgwụgwụ oge a” nke malitere na 1914? Ee e. Taa, n’oge dị nso n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke 20, ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ dị anya n’ịbụ nke a tọghataara Jisọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta ya na Eze ya nke o ruuru. Otú ọ dị, nke a emebeghị ka mmezu nke ihe Jehova buworo ụzọ kwuo n’amụma dị iche iche nke Bible laa azụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụ nzube Chineke ka a tọghata ụwa dum nke ihe a kpọrọ mmadụ tupu Jisọs Kraịst amalite ịchị dị ka “Onyeisi Udo.” Kpọmkwem n’ụzọ megidere nke ahụ, e buwo ụzọ gwa ya ka ọ malite ịchị n’etiti ndị iro ya.

3. Olee otú nhota Jisọs hotara Abụ Ọma nke 110 si egosi na ọ ga-achị n’etiti ndị iro?

3 Ọbụna mgbe ọ nọ n’ebe a n’elu ala, Jisọs Kraịst maara eziokwu nke a. N’oge na-adịghị anya tupu ọ nwụọ dị ka onye e gburu n’ihi okwukwe ya, ya na ndị okpukpe na-emegide ya sere okwu o wee zoo aka n’Abụ Ọma 110. Anyị na-agụ banyere nke a na Luk 20:​41-⁠44, sị: “O wee sị ha, Hà si aṅaa kwuo na Kraịst ahụ bụ nwa Devid? N’ihi na Devid onwe ya na-ekwu n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, Onyenwe anyị sịrị onyenwe m, nọdụ ala n’aka nri m, ruo mgbe m ga-edo ndị iro gị ka ihe mgbakwasị ụkwụ nke ụkwụ gị abụọ. Ya mere, Devid na-akpọ ya Onyenwe ya, Ò sikwa aṅaa bụrụ nwa ya?”

4-6. (a) Olee otú Abụ Ọma nke 2 n’otu aka ahụ si egosi na Jisọs agaghị echere ntọghata nke ụwa dum tupu ọ malite ọchịchị ya dị ka “Onyeisi Udo” ahụ? (b) Olee oge e mezuru Abụ Ọma 2:7?

4 Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, Jisọs Kraịst, dị ka Nwa Devid, agaghị amalite ịchị mgbe a tọghatasịrị ụwa. Kama nke ahụ, ọ gaje ịmalite ịchị n’etiti ndị iro bụ́ ndị Jehova Chineke ga-eji agha mee ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka Ọkpara ya o chiworo eze. N’otu aka ahụ, Abụ Ọma nke 2 n’okwu ndị na-esonụ na-egosi mmalite nke ịchịisi ya dị ka “Onyeisi Udo” n’etiti ndị iro:

5 “N’ihi gịnị ka mba nile meworo oké mkpọtụ? N’ihi gịnị ka ndị nile dị n’ụwa na-atụgharị ihe efu uche? Ndị eze nke ụwa na-eguzo onwe ha, ndị isi na-agbakọtakwa izu, imegide Jehova, na imegide onye ya e tere mmanụ [Kraịst ya], sị, Ka anyị tijie agbụ nile ha, tụfuo ụdọ nile ha n’ahụ anyị. Onye na-anọdụ n’eluigwe na-achị ọchị: Onyenwe anyị na-akwa ha emo. Mgbe ahụ ọ ga-agwa ha okwu n’iwe ya, ọ bụkwa n’iwe ya dị ọkụ ka ọ ga-eme ka ha maa jijiji: ma mụ onwe m emewo ka eze m guzosie ike n’elu Zaịọn, bụ́ ugwu nsọ m.

6 “M ga-akọ akụkọ banyere ụkpụrụ: Jehova sịrị m [Kraịst], Ọkpara m ka gị onwe gị bụ; mụ onwe m amụwo gị taa. [E mezuru Abụ Ọma 2:7 mgbe Jehova kpọlitere Ọkpara ya site ná ndị nwụrụ anwụ, wee si otú a bụrụ Nna nke mgbe ebighị ebi nye Jisọs. (Ndị Rom 1:4)] Rịọ m, na aga m enye gị mba nile ka ha bụrụ ihe nketa gị, na nsọtụ ụwa ka ha bụrụ ihe onwunwe gị. Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisịa ha; dị ka ihe ọkpụ ite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha. Ma ugbu a, ndị eze, nweenụ uche: ka a dọọ unu aka ná ntị, ndị ikpe nke ụwa. Werenụ egwu fee Jehova ofufe, werekwanụ ọma jijiji tegharịa egwu ọṅụ. Sutunụ onye a họpụtaworo ọnụ, ka ọ ghara iwe iwe, unu wee laa n’iyi n’ụzọ, n’ihi na iwe ya ga-ere ọkụ na mgbe nta. Ndị ihe na-agara nke ọma ka ha bụ, bụ́ ndị nile na-agbaba n’ime ya.”

7. Nhota dị aṅaa n’Abụ Ọma nke 2 ka ndị ozi Jisọs Kraịst mere mgbe ụbọchị Pentikọst gasịrị?

7 Dị ka Ọrụ 4:​24-⁠27 si kwuo, ndị ozi Jisọs Kraịst hotara abụ ọma nke abụọ nke a mgbe ụbọchị Pentikọst, 33 O.A., gasịrị: “Ha weere otu obi welie olu ha kpọkuo Chineke, sị, Onyenwe anyị, gị onwe gị bụ Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri, na ihe nile dị ha n’ime: onye sitere n’aka mmụọ nsọ, site n’ọnụ nna anyị Devid onye na-ejere gị ozi, sị, N’ihi gịnị ka mba nile mere oké mkpọtụ, ndị nile dị n’ụwa na-atụgharịkwa ihe efu uche? Ndị eze ụwa guzoro onwe ha n’otu, ndị isi zukọkwara, imegide Onyenwe anyị, na imegide Kraịst ya: n’ihi na ọ bụ ezie na n’ime obodo a Herọd na Pọntiọs Paịlet, ha na ndị mba ọzọ na ndị Israel nile, zukọrọ imegide onye nsọ ahụ na-ejere gị ozi, bụ́ Jisọs, onye i tere mmanụ n’isi.”

Mmezu Ka Ukwuu nke Abụ Ọma nke 2

8. (a) Olee mgbe mmezu mbụ nke Abụ Ọma 2:​1, 2 weere ọnọdụ? (b) Kemgbe ole mgbe ka mmezu ka ukwuu nke Abụ Ọma nke 2 nọworo na-ewere ọnọdụ?

8 Afọ 33 nke narị afọ mbụ hụrụ mmezu mbụ nke okwu amụma ndị ahụ nke Abụ Ọma 2:​1, 2. Nke a bụ n’ihe banyere nwoke ahụ bụ́ Jisọs Kraịst. E jiwo mmụọ nsọ Jehova tee ya mmanụ n’oge Jọn Onye Na-eme Baptism mere ya baptism. Ma mmezu ka ukwuu nke Abụ Ọma nke 2 anọwo na-ewere ọnọdụ kemgbe ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl n’afọ 1914. (Luk 21:24) E mewo ka o doo anya na “oge nke mba ọzọ,” bụ́ nke malitere ná mbibi mbụ e bibiri obodo Jerusalem na 607 T.O.A., gwụsịrị n’afọ 1914.a Mgbe ahụ mgbịrịgba ọnwụ daara mba nile nke ụwa nke a, tinyere ndị nke Krisendọm.

9. Gịnị mere ná mbibi nke mbụ nke Jerusalem n’ihe banyere Alaeze Chineke nke eriri ndị eze nke Eze Devid nọchiri anya ya?

9 Ná mbibi mbụ nke Jerusalem, site n’aka ndị Babilọn, Alaeze Jehova Chineke n’elu mba Israel, dị ka eriri ndị eze nke Eze Devid nọchiri anya ya, bịara ná njedebe. Kemgbe ahụ, ndị Juu anụ ahụ enwebeghị onye eze chịrị ha site n’eriri ndị eze nke ụlọ Devid. Ma Alaeze nke Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu nke dị n’aka nwa Devid, bụ́ onye ya na Jehova gbara ọgbụgba ndụ maka Alaeze na-adịru ebighị ebi n’eriri ya, agajeghị ikpudo ihu n’ala ruo ebighị ebi.

10, 11. (a) Gịnị ka Chineke sitere n’ọnụ Ezikiel onye amụma ya kwuo banyere ocheeze Devid? (b) Olee onye “o ruuru” nke e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze Devid? (ch) Olee ihe ìgwè ndị Juu kwuru mgbe o chere onwe ya n’ihu ha dị ka onye nketa ahụ o ruuru?

10 N’oge na-adịghị anya tupu mbibi ya mbụ, Jehova mere ka onye amụma ya bụ́ Ezikiel gwa eze Jerusalem oge ochie okwu ndị a: “Ma gị onwe gị, onye e merụworo ahụ, onye na-emebi iwu, bụ́ onyeisi Israel, onye ụbọchị ya bịaworo, na mgbe ajọ omume nke mgbe ikpeazụ; otú a ka Onyenwe anyị Jehova sịrị: Wezụga ákwà nkuku isi ahụ, bupụ okpueze ahụ: nke a agaghị abụkwa ihe ọ bụ: mee ihe nke dị ala ka ọ dị elu, meekwa ihe nke dị elu ka ọ dị ala. Mkpu ihu, mkpu ihu, mkpu ihu ka m ga-ekpu ya: nke a kwa, ọ gaghị adị ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruuru aka; m ga-ewerekwa ya nye ya.”​—⁠Ezikiel 21:​25-⁠27.

11 “Onye o ruuru aka” bịara n’onye ahụ bụ Jisọs Kraịst, e dekwara eriri ọmụmụ ya site na Devid na Matiu 1:​1-⁠16 nakwa Luk 3:​23-⁠31. Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ kpọrọ ya “Nwa Devid.” N’ụbọchị mbanye mmeri ọ banyere na Jerusalem n’elu nwa ịnyịnya ibu ná mmezu nke amụma, ìgwè ndị Juu ahụ nwere obi ụtọ bụ́ ndị sonyeere ya na ndị ozi ya tiri mkpu n’obi ụtọ, sị: “Hosanna dịrị Nwa Devid: Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị; Hosanna n’ebe kachasị ihe nile elu.”​—⁠Matiu 21:9.

E Mee Ka “Nwa Devid” Nọkwasị n’Ocheeze n’Eluigwe

12. Mgbe Oge Ndị Jentaịl gwụsịrị na 1914, olee ebe e mere ka Jisọs Kraịst, dị ka onye nketa na-adịgide adịgide nke Devid, nọkwasị n’ocheeze?

12 Nzọda n’okpuru ụkwụ nke ndị Jentaịl ga-azọda Alaeze Chineke nke nọ n’aka ụlọ Devid ruo 2,520 afọ, gwụrụ na 1914. Mgbe ahụ ka oge ruru ka Jisọs Kraịst, bụ́ “Nwa Devid,” bụrụ onye e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze, ọ bụghị n’ocheeze dị n’elu ala ebe a, kama n’eluigwe kasị elu n’aka nri nke Jehova Chineke!​—⁠Daniel 7:​9, 10, 13, 14.

13. (a) Kemgbe afọ dị aṅaa ka a tụrụ aka n’ọdịnihu n’afọ 1914 dị ka ọgwụgwụ nke Oge Ndị Jentaịl, olee ndị mekwara nke a? (b) Gịnị bụ omume nke mba dị iche iche nke elu ala n’ebe “Nwa Devid” ahụ e chiri eze ọhụrụ nọ?

13 Kemgbe 1876, ndị ahụ e jikọtara ha na Watch Tower Bible and Tract Society anọwo na-atụ aka n’ọdịnihu banyere afọ ahụ dị oké mkpa. Ma mba dị iche iche nke ụwa, ọbụna ndị nke Krisendọm, jụrụ ajụ ịmata ya dị ka oge ha ga-enyefe ịchịisi ha nke elu ala n’aka “Nwa Devid” ahụ nke e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze ọhụrụ. Ha anabataghị na ọ bụ ya ji ikike Chineke nyere ịchị elu ụwa dum, bụ́ ihe mgbakwasị ụkwụ nke Jehova Chineke. (Matiu 5:35) Ha gosipụtara ọjụjụ ha jụrụ hoo haa Eze ahụ o ruuru ịchị site n’ịlụ Agha Ụwa Mbụ.

14. (a) Mgbe Agha Ụwa Mbụ ahụ tiwapụrụ, omume dị aṅaa ka mba nile gosipụtara n’ebe ndị Kraịst ahụ e jikọtara ha na Watch Tower Society nọ? (b) N’ihi nke a, gịnị ka ọnọdụ zuru ụwa ọnụ bụ ihe àmà ya?

14 Ná mba ndị ahụ dum na-alụ agha, ndị Kraịst ahụ raara onwe ha nye e jikọtara ha na Watch Tower Society batara n’okpuru nrụgide siri ike ịhapụ mkpebi ha mere idebe aka ha ọcha pụọ n’ọmụma ikpe nke ọbara. N’oge ahụ ha aghọtaghị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị zuo ezu ihe nnọpụiche ndị Kraịst chọrọ ha n’aka. Amụma “Nwa Devid,” bụ́ Jisọs Kraịst, buuru ndị na-eso ụzọ ya banyere “ọgwụgwụ oge a” mezuru n’ụzọ dị mwute: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:9) Ịkpọasị nke a ebelatabeghị kemgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị. N’ihi ihe ndị a bụ eziokwu n’akụkọ ihe mere eme nke oge a, gịnị ka ọnọdụ ndị zuru ụwa ọnụ bụ ihe àmà ya? Ọ bụ nke a: “Onyeisi Udo” ahụ na-achị n’etiti ndị iro, bụ́ ndị nọ kpọmkwem n’elu ala ebe a!

15. Gịnị mere Setan bụ Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya mgbe agha tiwapụrụ n’eluigwe, oleekwa afọ ihe ndị si na ya pụta na-aghaghị ịbịaruworị ná njedebe?

15 Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile mere ka a mụọ Alaeze Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa n’oge ya a kara aka n’agbanyeghị ndị iro nile nọ mgbe ahụ n’eluigwe na n’elu ụwa. Mkpughe 12:​1-⁠9 na-egosi na mgbe a mụsịrị “nwa nwoke” ahụ bụ́ Alaeze n’eluigwe site n’akpa nwa nke nzukọ Jehova yiri nwunye, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ozugbo ahụ agha tiwapụrụ n’eluigwe n’onwe ya. Dragọn ihe atụ ahụ bụ́ Setan bụ Ekwensu, na ndị mmụọ ozi ya bụ́ ndị mmụọ ọjọọ, ahụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe ahụ nke dị nsọ. N’agha nke a, anya mmadụ na-ahụghị, “Nwa Devid” ahụ e nyere ikike eze buru agha mmeri wee chụpụ Setan bụ Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe wee kpaara ha ókè na gburugburu elu ụwa anyị. Ihe àmà na-egosi na mweda n’ala nke a e wedara ndị agha nke Setan bụ nke e mezuru n’ụzọ zuru ezu na 1918, n’afọ ahụ mgbe Agha Ụwa Mbụ gwụsịrị.

E Wedara Ya n’Ala, Ekwensu Wee Buo Agha

16, 17. (a) Olee ndị ka Setan bụ Ekwensu ahụ e wedara n’ala na-ebuso agha? (b) Olee ndị o ji eme ihe n’ibu agha nke a?

16 Setan bụ Ekwensu ahụ e wedara n’ala, bụ́ dragọn ihe atụ ahụ, nwere iwe dị ọkụ ugbu a karịsịa n’ebe nzukọ Jehova Chineke ahụ yiri nwunye nọ. (Mkpughe 12:17) N’ihi ya ọ na-ebu agha obi ọjọọ megide ihe fọdụrụ ahụ nke ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ, bụ́ ndị nwere ihe àmà na ọ bụ nne ha nke ime mmụọ.​—⁠Ndị Galetia 4:26.

17 Setan na-ebusokwa “atụrụ ọzọ” ahụ agha, bụ́ ndị ji nrubeisi soro ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na-arụ ọrụ n’ịgba àmà banyere ọmụmụ nke Alaeze ahụ. (Jọn 10:16) Ọ bụghị nanị na ọ na-eji usuu ndị agha ya nke ndị mmụọ ọjọọ ahụ e wedara n’ala na-eme ihe, ndị nọ ugbu a na gburugburu elu ụwa, kamakwa ọ na-eji akụkụ a na-ahụ anya nke nzukọ ya na-eme ihe n’ibu agha nke a megide ihe ahụ fọdụrụ na “atụrụ ọzọ” ahụ.

18. (a) Ọ bụ ezie na Ekwensu ji obi ọjọọ na-ebuso ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha agha, ike nchebe dị aṅaa ka ha nwere? (b) Olee akụkụ nke na-eru ọgwụgwụ ya n’ịchịisi nke “Onyeisi Udo” ahụ?

18 Ọchịchị nke “Onyeisi Udo” ahụ n’etiti ndị iro ya kpọmkwem n’elu ụwa ebe a na-eru ọgwụgwụ ya nso. O mewo ihe magburu onwe ya banyere ọnọdụ ahụ. Ehihie na abalị ndị mmụọ ozi ya na-eguzosi ike n’ihe na-adị nkwadebe, dịrị njikere ịnara ụkpụrụ iwu eze site n’aka ya na iji ọsọ mee ha. Ha na-eje ozi dị ka ike nchebe maka ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ nke “atụrụ ọzọ,” ka ndị a na-eje ozi maka ọdịmma nke Alaeze ahụ n’oge nke a ji oké ọsọ na-agwụsị, mgbe “Onyeisi Udo” ahụ na-achị n’etiti ndị iro ya.​—⁠Mkpughe 7:9.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ ahụ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, peji nke 138-⁠141, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya