“Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
1, 2. (a) Gịnị na-akpata mgbanwe dị iche iche ná ndụ nke ndị ghọrọ ndị Kraịst? (b) Ruo ókè ha aṅaa ka Bible pụrụ imetụta mmadụ?
N’ETITI narị afọ mbụ O.A., Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Rom akwụkwọ. N’ime ya, o mere ka ọ pụta ìhè, bụ́ ihe ahụ a chọrọ ezi ndị Kraịst n’aka, bụ ha ime mgbanwe dị iche iche. Ọ sịrị: “Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ, ka unu wee nwapụta ihe bụ ihe Chineke na-achọ, bụ ezi ihe nke dịkwa ya ezị ụtọ nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Gịnị bụ ihe ahụ nke na-enwogha ndị na-eso ụzọ Jisọs, na-agbanwe ụzọ ha sị eche echiche? N’ụzọ bụ isi, ọ bụ ike nke Okwu Chine-ke, bụ́ Bible.
2 Pọl gosiri ụzọ dị omịmi Bible pụrụ isi metụta anyị mgbe o dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsịkwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karị mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) N’eziokwu, ike ahụ pụrụ iche Bible nwere n’ịrụpụta mgbanwe ndị dị otú ahụ n’ime ụmụ mmadụ bụ ihe àmà na-akpali akpali nke na-akwado na ọ bụ ihe karịrị okwu mmadụ efu.
3, 4. Ruo ókè ha aṅaa ka a na-agbanwe ọdịdị mmadu nke ndị Kraist?
3 Okwu Grik nke a sụgharịrị ịbụ “ka e nwoghaa unu” ná Ndị Rom 12:2 sitere n’okwu ahụ bụ me-ta-mor-pho’o. Ọ na-egosi mgbanwe zuru ezu, dị ka mgbanwe ọbụbụ na-eme ịji ghọọ urukurubụba. O zuru nnọọ ezu nke na Bible na-ekwu okwu banyere ya dị ka mgbanwe nke ọdịdị mmadụ. N’amaokwu ọzọ nke Bible, anyị na-agụ, sị: “Ebe unu yipụchasịworo mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile, yikwasịkwa mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-eme ya ka ọ dị ọhụrụ ruo ná mmazu dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.”—Ndị Kọlọsi 3:9, 10.
4 Mgbe ọ na-edegara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ, Pọl gosiri ókè e nweruru ná mgbanwe ọdịdị mmadụ n’ime narị afọ mbụ ahụ. Ọ sịrị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbịga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu.” (1 Ndị Kọrint 6:9-11) Ee, ndị rụrụ arụ na ndị na-ese okwu, ndị ohi na ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, abụwo ndị e nwoghara gaa n’ịghọ ndị Kraịst bụ ezi ihe nlereanya.
Ịgbanwe Ọdịdị Mmadụ n’Oge a
5, 6. Olee ụzọ ike Bible si gbanwee ọdịdị nke otu nwa okorobịa kpam kpam?
5 A na-ahụkwa mgbanwe ọdịdị mmadụ ndị dị otú ahụ taa. Dị ka ihe atụ, otu nwa okoro nta bi na South America bụ onye nne na nna ya nwụrụ mgbe ọ dị afọ itoolu. O tolitere n’enweghị nduzi nke nne na nna, wee wulitekwa ihe isi ike dị iche iche n’ọdịdị mmadụ ya. Ọ kọrọ, sị: “Tupu m gbaa afọ iri na asatọ, abụwo m onye ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ, anọwokwa m n’ụlọ mkpọrọ n’ihi izu ohi iji kwadoo àgwà ahụ.” Ma, nwanne nne ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, o mesịkwara nwee ike inyere ya aka.
6 Nwa okorobịa ahụ kọrọ, sị: “Nwanne nne m malitere iduziri m ọmụmụ Bible, mgbe ọnwa asaa gasịkwara, enwere m ike imeri àgwà ahụ nke ịṅụ ọgwụ ọjọọ.” Ọ kwụsịkwara mkpakọrịta nke ya na ndị bụbu ndị enyi ya, wee nweta ndị enyi ọhụrụ n’etiti Ndịàmà Jehova. Ọ gara n’ihu ịkọ, sị: “Ndị enyi ọhụrụ ndị a, ha na ọmụmụ Bible m na-enwe mgbe nile, nyeere m aka inwe ọganihu, mesiakwa ịrara ndụ m nye ijere Chineke ozi.” Ee, onye nke a ọgwụ ọjọọ riburu ahụ, onye bụbukwa onye ohi bụzi onye Kraịst na-arụsi ọrụ ike ugbu a, nke na-adịkwa ndụ dị ọcha. È si aṅaa nweta oké mgbanwe dị otú a n’ọdịdị mmadụ ya? Ọ bụ site n’ike nke Bible.
7, 8. Kọwaa ụzọ e si jiri enyemaka Bible dozie otu oké ihe isi ike banyere ọdịdị mmadụ.
7 Ihe atụ ọzọ sitere n’ebe ndịda Europe. N’ebe ahụ, otu nwa okorobịa tolitere na-enwe nsogbu siri ike nke metụtara ọdịdị mmadụ ya: ọ na-ewe iwe ọkụ nke ukwuu. Ọ na-alụ ọgụ ọtụtụ mgbe. N’otu mgbe ha na-enwe nrụrịta ụka n’ezinụlọ ha, o tiri ọbụna nna ya ihe, na-akụda ya n’ala! Ma mgbe e mesirị, o sooro Ndịàmà Jehova mụọ Bible wee rịba ama ihe ahụ Chineke nyere n’iwu n’akwụkwọ Ndị Rom: “Unu enyeghachila onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ. . . . A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ̀bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:17-19.
8 Okwu ndị a nyeere ya aka ịghọta otú adịghị ike ya ahụ siruru n’ike. Ihe ọmụma na-abawanye ụba ọ na-enweta na Bible mere ka akọ na uche ya dịwanye mma, bụ́ nke nyeere ya aka ịkwụsịlata iwe ọkụ ya. N’otu mgbe, mgbe o nwetụworo ọganihu n’ọmụmụ ihe ya, otu onye ọ na-amaghị were iwe wee gwa ya okwu mkparị dị iche iche. Nwa okorobịa ahụ nwere mkpali nke ụdị iwe ahụ ọ na-ewebu n’ime onwe ya. Mgbe ahụ o nwere mmetụta nke ike ọzọ n’ahụ ya: echiche nke ihere; nke a gbochikwara ya ikwe ka iwe ahụ kpalie ya ime ihe na-ezighị ezi. O wulitewo njide onwe onye, bụ́ mkpụrụ dị mkpa nke mmụọ Chineke. (Ndị Galetia 5:22, 23, NW) Ugbu a, o nwere ọdịdị mmadụ dị iche, bụ́ nke sitere n’ike nke Okwu Chineke.
9. Dị ka Pọl si kwuo, ọ̀ bụ site na gịnị ka a na-agbanwe ọdịdị mmadụ anyị?
9 Ma olee ụzọ Bible na-esi enwe mmetụta dị ike otú a? Pọl, ná Ndị Kọlọsi 3:10, kwuru na a na-agbanwe ọdịdị mmadụ anyị site n’ezi ihe ọmụma, bụ́ ihe ọmụma nke a na-achọta na Bible. Ma olee otú ihe ọmụma na-esi agbanwe ndị mmadụ?
Ọrụ Ezi Ihe Ọmụma Na-arụ
10, 11. (a) Mgbe anyị na-amụ Bible, gịnị ka anyị na-amụta banyere àgwà ndị dị mma na ndị na-adịghị mma? (b) Gịnị ka ọ dị mkpa inwe tụkwasị n’ihe ọmụma iji mee mgbanwe n’ọdịdị mmadụ anyị?
10 Nke mbụ, Bible mere ka a mata ụdị akparamagwa na-adịghị mma ndị e kwesịrị iwepụ. Ndị a gụnyere ihe ndị dị ka “anya dị elu, na ire okwu ụgha, na aka na-awụsi ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; na obi nke na-echepụta echiche ajọ ihe, na ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ; na onyeàmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume, na onye na-ezisa iseokwu n’etiti ụmụnne.” (Ilu 6:16-19) Nke abụọ, Bible kọwara ezi àgwà ndị anyị kwesịrị ịzụlite, bụ́ ndị gụnyere “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, [njide onwe onye, NW].”—Ndị Galetia 5:22, 23.
11 Ezi ihe ọmụma dị otú ahụ na-enyere onye nwere obi eziokwu aka inyocha onwe ya iji hụ ụdị àgwà ndị ọ dị mkpa ka ọ zụlite na ndị a na-aghaghị ịrụ ọrụ iji wepụsịa. (Jemes 1:25) Otú o sina dị, nke ahụ bụ nanị mmalite. Tụkwasị n’ihe ọmụma, ọ dị mkpa inwe mkpali, bụ́ ihe ga-akwali ya ịchọ ime mgbanwe. N’ebe a, ọ dịkwa ya mkpa inwe ezi ihe ọmụma sitere na Bible.
Ịbụ Onye A Kpaliri Ịbụ Ezi Mmadụ
12. Olee ụzọ inwe ihe ọmụma banyere ụdị onye Chineke bụ na-esi enyere anyị aka ime mgbanwe?
12 Pọl kwuru na ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ nke dị mkpa bụ nke e dokwara “dị ka onyinyo nke Onye kere ya si dị.” (Ndị Kọlọsi 3:10) Ya mere, àgwà onye Kraịst aghaghị iyi àgwà nke Chineke n’onwe ya. (Ndị Efesọs 5:1) A na-esi na Bible kpugheere anyị ụdị onye Chineke bụ. Anyị na-ahụ ụzọ o si emeso ụmụ mmadụ íhe, na-ahụtakwa àgwà ọma ya dị iche iche, ndị dị ka ịhụnanya, ọmịiko, ịdị mma, obi ebere, na ezi omume. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-akpali onye obi ya ziri ezi ịhụ Chineke n’anya na ịchọ ịbụ ụdị onye Chineke na-akwado. (Matiu 22:37) Dị ka ụmụ nke na-ahụ n’anya, anyị chọrọ ime ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ, ya mere anyị na-agbalị iṅomi ọdịdị ya ruo ókè anyị nwere ike ime n’ọnọdụ anyị nke na-adịghị ike, nke na-ezughịkwa okè.—Ndị Efesọs 5:1.
13. Ihe ọmụma dị aṅaa na-akuziri anyị ‘ịhụ ezi omume n’anya ma kpọọ ajọ omume asị’?
13 A na-emesiwanye mkpali anyị ike site n’ihe ọmụma nke Bible na-enye banyere ebe ma àgwà ọma ma àgwà ọjọọ na-eduje. (Abụ Ọma 14:1-5; 15:1-5; 18:20, 24) Anyị na-amụta na a gọziri Devid n’ihi omume nsọpụrụ Chineke ya na ịhụnanya ọ hụrụ ezi omume, kama na ọ tara ahụhụ mgbe ọ na-enweghị ike ijide onwe ya. Anyị na-ahụ ihe di mwute ndị si na ya pụta mgbe e bibiri àgwà ọma nile nke Solomọn n’oge agadi ya. E gosiri ọdịiche dị n’etiti ngọzi ndị bịara site n’ezi omume nke Josaịa na Hezekaịa na ihe ọjọọ ndị dapụtara site n’adịghị ike nke Ehab na ajọ ndapụ n’ezi ofufe nke Manase. (Ndị Galetia 6:7) Anyị na-esi otú a mụta ‘ịhụ ezi omume n’anya na ịkpọ ajọ omume asị.’—Ndị Hibru 1:9; Abụ Ọma 45:7; 97:10.
14. Gịni bụ nzube Jehova maka ụwa na ndị mmadụ bi n’ime ya n’otu n’otu?
14 A na-emesiwanye ihe mkpali nke a ike ọbụna karị site n’inweta ezi ihe ọmụma nke nzube nile nke Chineke. Ihe ọmụma dị otú ahụ na-enye aka ịgbanwe ‘ike nke na-akpali uche anyị,’ bụ mmụọ nke na-akpali echiche na ihe omume anyị. (Ndị Efesọs 4:23, 24) Mgbe anyị na-amụ Bible, anyị na-amụta na Jehova agaghị agbachi ajọ omume nkịtị ruo mgbe ebighị ebi. N’oge na-adịghi anya, ọ gaje ibibi ụwa ajọ omume nke a, wee weta ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume ga-ebi n’ime ha.’ (2 Pita 3:8-10, 13) Ònye ga-ebi n’ime ụwa ọhụrụ nke a? “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.
15. Ọ bụrụ na anyị kwere n’ezie n’ihe Bible kwuru banyere nzube nile nke Jehova, olee ụzọ nke a ga-esi metuta anyị di ka ndị mmadụ n’otu n’otu?
15 Ọ bụrụ na anyị ekwere nkwa nke a n’ezie, ọ ga-emetụta ụzọ nile anyị si eche echiche. Pita onyeozi, mgbe o busịrị amụma banyere mbibi nke ajọ omume, kwuru, sị: “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ nke [Jehova, NW].” (2 Pita 3:11, 12) Ọchịchọ siri ike anyị nwere iso ná ndị ezi omume ga-afọdụ mgbe e bibiri ndị ajọ omume kwesịrị ịbụ ihe ga-ewulite ọdịdị mmadụ anyị.
16. Ụdị àgwà dị aṅaa ka a na-agaghị achọta n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, oleekwa ụzọ ihe ọmụma nke a kwesịrị isi metụta anyị?
16 Akwụkwọ Mkpughe kwere ndị ezi omume nkwa na, mgbe ọgwụgwụ ụwa nke a gasịrị, “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.” Mgbe ahụ, ọ dọrọ aka ná ntị na a ga-ajụ “ndị na-atụ ụjọ, na ndị na-ekweghị ekwe, na ndị arụ, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị [na-ekpere ndị mmụọ ọjọọ, NW] na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile.” (Mkpughe 21: 4, 8) Lee ka o si bụrụ ihe amamihe dị na ya izere àgwà ọjọọ ndị ahụ ndị Chineke na-agaghi ekwe ka ha banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ!
Enyemaka Sitere n’Ebe Ndị Ọzọ
17. Ụdị enyemaka dị aṅaa ka Bible nyere anyị ndụmọdụ ka anyị na-achọ?
17 Otú ọ dị, ụmụ mmadụ bụ ndị na-esighi ike, ọ na-abụkarịkwa na e nwere ihe ọzọ dị ha mkpa tụkwasị n’ihe ọmụma na mkpali ka ha wee mee mgbanwe. Enyemaka onwe onye dị ha mkpa, Bible gosikwara anyị ebe anyị pụrụ inweta enyemaka nke a. Dị ka ihe atụ, ọ na-asị: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.” (Ilu 13:20) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị esoro ndị nwere àgwà ndị ahụ anyị chọrọ iwulite na-akpakọ, a ga-enyere anyị aka nke ukwuu ịbụ ndị yiri ha karị.—Jenesis 6:9; Ilu 2:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.
18, 19. Gịnị ka ọ dị mkpa ka anyị mee iji wee kpughee uche anyị na obi anyị nye mmụọ Chineke?
18 Tụkwasị na nke a, Jehova n’onwe ya na-ewetakwa enyemaka n’ụdị nke mmụọ nsọ ya—bụ́ otu mmụọ ahụ o jiri mee ihe ịrụzu ọrụ ebube dị iche iche n’oge ndị gara aga. N’eziokwu, àgwà ndị a mara oké mma, bụ “ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obi ọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, [njide onwe onye, NW],” bụ ndị a kpọrọ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Ndị Galetia 5:22, 23) Olee ụzọ anyị na-esi enweta enyemaka nke mmụọ nsọ? Ebe ọ bụ na e dere Bible site n’ike mmụọ nsọ, mgbe anyị na-agụ ya ma ọ bụ soro ndị ọzọ na-ekwurịta okwu banyere ya, anyị na-emeghe uche anyị na obi anyị nye ike mkpali nke mmụọ ahụ. (2 Timoti 3:16) N’eziokwu, Jisọs kwere nkwa na mgbe anyị sooro ndị ọzọ kwurịta okwu banyere olileanya anyị, anyị pụrụ inwe mmetụta nke ọrụ mmụọ ahụ na-arụ n’onwe anyị.—Matiu 10:18-20.
19 Tụkwasị na nke a, Bible nyere iwu, sị: ‘Nọgidesienụ ike n’ekpere.’ (Ndị Rom 12:12) Site n’ekpere, anyị na-agwa Jehova okwu, na-enye ya otuto, na-ekele ya, na-arịọkwa enyemaka ya. Ọ bụrụ na anyị arịọ enyemaka iji merie àgwà ụfọdụ ndị na-ekwesịghị ekwesị, dị ka oké iwe, isi ike, enweghị ndidi, ma ọ bụ mpako, mmụọ Chineke ga-akwado mgbalị nile anyị na-eme n’ụzọ kwekọrọ n’ekpere ahụ.—Jọn 14:13, 14; Jemes 1:5; 1 Jọn 5:14.
20. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị Kraịst nọgide na-arụ ọrụ iji yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ?
20 Mgbe Pọl dere, sị: “Ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ,” ndị o degaara akwụkwọ ahụ bụ ọgbakọ ndị Kraịst meworo baptism, ndị e tekwara mmanụ. (Ndị Rom 1:7; 12:2) N’asụsụ Grik mbụ ahụ, o jikwara ụdị ngwaa ahụ nke pụtara ihe omume a nọgidere na-eme, mee ihe. Nke a na-egosi na mgbanwe nke ezi ihe ọmụma sitere na Bible na-eweta n’ebe anyị nọ na-anọgide na-abịa. Anyị onwe anyị taa—dịkwa ka ndị Kraịst biri n’oge Pọl—bi n’ime ụwa nke jupụtara ná mmetụta na-emerụ emerụ. Anyị onwe anyị—dịkwa ka ha—bụkwa ndị na-ezughị okè, ndị na-adabakarị n’ime ihe ọjọọ. (Jenesis 8:21) N’ihi ya, anyị aghaghị ịnọgịde na-arụ ọrụ iji merie mmadụ ochie ahụ nke na-achọ ọdịmma onwe onye, na ịjikwa yikwasị nke ọhụrụ ahụ, dị ka ha onwe ha mere. Ndị Kraịst oge ochie nwere ihe ịga nke ọma ruo n’ókè nke na ha guzopụrụ nnọọ iche site n’ụwa nke gbara ha gburugburu. Ndị Kraịst taa na-emekwa otu ihe ahụ.
‘Ndị Jehova Ziri Ihe’
21. Olee amụma ụfọdụ ndị mezuworo n’isi ndị Chineke n’oge ikpeazụ ndị a?
21 N’eziokwu, mmụọ Chineke na-arụ ọrụ taa, ọ bụghị nanị n’isi ndị mmadụ n’otu n’otu, kama ná nzukọ nke ndị Kraịst nile, ndị ruru ọtụtụ nde mmadụ n’ọnụ ọgụgụ. A na-emezu n’isi nzukọ nke a, amụma Aịsaịa nke bụ: “Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.” (Aịsaịa 2:3) E mezuwokwa amụma ọzọ nke Aịsaịa n’ọnọdụ ha: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.” (Aịsaịa 54:13) Òle ndị bụ ndị a nwere udo n’ihi na ha bụ ndị Jehova zịworo ihe?
22. (a) Òle ndị taa bụ ndị Jehova na-ezi ihe? (b) Nye ihe atụ iji gosi na ndị nọ n’èzí na-ahụta na Ndịàmà Jehova bụ ndị dị iche.
22 Ọdị mma, rịba ama ihe odide nke a sitere n’otu akwụkwọ ozi e degaara New Haven Register, bụ́ otu akwụkwọ akụkọ dị na North America: “Ma ịga nkwusa ha ọ̀ kpasuwo gị iwe dị ka ọ kpasuworo m, ị ghaghị ịja ha mma n’ihị nrara ha raara onwe ha nye, ịdị mma ha, ezị ihe nlereanya ha na-egosịpụta n’àgwà mmadụ na ibi ndụ n’ụzọ na-enye ezi ahụ ike.” Òle ndị ka onye dere ihe a na-ekwu banyere ha? Ọ bụ otu ìgwè ndị ahụ akwụkwọ akụkọ Herald nke Buenos Aires, Argentina, kwuru okwu banyere ha mgbe ọ sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ, Ndịàmà Jehova egosịpụtawo onwe ha ịbụ ụmụ amaala na-arụsị ọrụ ike, ndị isi jụrụ oyị, ndị na-adịghị eme oké mmefu, ndị na-atụkwa egwu Chineke.” Otú ahụkwa, akwụkwọ akụkọ ndị Italy bụ La Stampa kwuru, sị: “Ha adịghị ezere ịkwụ taks ma ọ bụ na-achọ ụzọ ha ga-esi zere iwu ndị na-enye ha nsogbu iji nweta uru nke onwe ha. Ụkpụrụ omume ọma ndị bụ ịhụ onye agbata obi n’anya, ịjụ ịnara ike, emeghị ihe ike na onye ọ bụla ime ihe n’eziokwu . . . na-abanye ná ndụ ha na-ebi ‘kwa ụbọchị.’”
23. Gịnị mere Ndịàmà Jehova, dị ka otu òtù, ji guzopụ iche?
23 N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova, dị ka otu òtù —dịkwa ka ndị Kraịst oge gboo ahụ—jị guzopụ iche? N’ọtụtụ ụzọ, ha adịghị iche n’ebe ndị ọzọ nọ. Ha nwere otu ezughị okè mmadụ ahụ e ji mụọ mmadụ nile, ha nwekwara otu nsogbu akụ na ụba na mkpa ndị ahụ mmadụ nile na-eche ihu. Otú ọ dị, dị ka otu ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, ha na-ekwere ka Okwu Chineke nwee ike ná ndụ ha. Òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ezi ndị Kraịst, nke na-esi na nke a apụta bụ ihe àmà siri ike nke na-egosi na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 133:1.
Bible Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ
24. Gịnị bụ ekpere anyị n’isi ọtụtụ mmadụ ndị ọzọ?
24 N’ime isiokwu abụọ ndị a, anyị atụlewo nanị ihe àmà abụọ iji gosi na Bible bụ Okwu Chineke, ọ bụghị nke mmadụ. Ma hà na-atụle amamihe na-enweghị atụ nke dị n’ime Bible ma ọ bụ ike o nwere ịgbanwe ụmụ mmadụ—ma ọ bụ ọtụtụ ihe ndị ọzọ kara ya akara dị ka ihe pụrụ iche—ndị nwere obi eziokwu aghaghị nnọọ ịghọta na ọ ghaghị ịbụ ihe sitere n’ike mmụọ Chineke. Dị ka ndị Kraịst, anyị na-ekpe ekpere ka ọtụtụ ndị ọzọ ghọtakwa eziokwu nke a. Ha onwe ha ga-ekwughachikwa okwu ahụ onye ọbụ abụ ji ọṅụ kwuo, sị: “Lee otú m hụworo ihe ịrịba ama gị nile n’anya: dị ka ebere gị si dị, Jehova, mee ka m dị ndụ. Isi ihe nke okwu gị bụ eziokwu; ọzọ, ruo mgbe ebighị ebi ka ikpe ọ bụla nke ezi omume gị dị.—119:159, 160.
ị̀ Na-echeta?
◻ Mmetụta dị aṅaa ka Bible na-enwe n’ebe ezi ndị Kraịst nọ?
◻ Olee ụzọ ezi ihe ọmụma na-esi enye aka ịgbanwe anyị?
◻ Olee ụzọ Bibie na-esi enye aka ịkpali anyị ịzụlite àgwà ndị dị mma na imeri ndị ọjọọ?
◻ Enyemaka dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta n’izụlite àgwà ndị yiri nke Chineke?
◻ lhe àmà dị aṅaa nke na-egosi na Bible sitere n’ike mmụo nso ka a na-ahụ n’etiti ndị Jehova?
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Ajọ ihe nke pụtara site n’ekwesịghị ntụkwasị obi nke Solomọn n’oge agadi ya kwesịrị ịkpali anyị ịhụ ezi omume n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị
[Foto ndị dị na peeji nke 20]
Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova maka enyemaka, mmụọ ya ga-akwado mgbalị nile anyị na-eme iji merie àgwà ọjọọ