Imeri n’agha a na-ebuso obi ịda mbà
OTU ihe kasị rie m ahụ́ nke m na-aghaghị ibuso agha,” ka Lola kwupụtara, “bụ ikpe ọmụma nke inwe mmetụta onye na-enweghị olileanya ebe ọ bụ na, dị ka otu onye n’ime ndị ohu Jehova, echere m na ekwesịghị m inwe mmetụta dị otú ahụ.” Nghọtahie nkịti nke a na-abụkari onyeiro mbụ nke onye Kraist dara mbà n’obi na-aghaghi imeri. Lola kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla m kwụsịrị ipịa onwe m ụtarị n’uche maka ụdị mmetụta ahụ ma tụkwasi uche n’ahụ́ ịdị m mma, apụrụ m ịnagide ịda mbà ahụ n’ụzọ ka mma.” Ee, ịda mbà n’obi abụghị n’onwe ya ihe mere ị ga-eji chee na i mechuwo Chineke ihu.
Dị ka e hotara n’isiokwu mbụ, ihe na-akpata ịda mbà n’obi nwere ike ịbụ ọrịa anụ ahụ́. Na 1915, ogologo oge tupu nchọpụta ọhụrụ ndị na-ejikọ ọrịa anụ ahụ́ na ịda mbà n’obi, Ulọ Nche kwuru, si: “Ihe mgbu nke a nke mmụọ, ma ọ bụ mmetụta nke owu ọmụma na ịda mbà n’obi, bụ ihe a na-ahụ ná ndụ mgbe ụfọdụ nye ihe nile a kpọrọ mmadụ . . . Ọnọdụ nke ahụ ike anụ ahụ́ na-eme [ya] ka ọ dịwanye njọ ruo n’ókè ụfọdụ.” Otú a, ọ bụrụ na ọnọdụ ịda mbà n’obi anọgide na-aga n’ihu, nnyocha nke onye dibịa ga-eme pụrụ inye aka. Ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ dị oké njọ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka onye ahụ jekwuru onye ọkachamara n’ihe banyere ịda mbà n’obi ka ọ gwọọ ọrịa ahụ.a
Ma ọbụna mgbe ihe kpatara ya na-abụghị ọrịa anụ ahụ́, ọ bụ ihe na-ezighị ezi iche na otu n’ime ndị ohu Chineke adịghị mgbe obi ga-ajọ ya njọ ma ọ bụ nwee nkụda mmụọ. Tụlee nnọọ otú Hana kwesịrị ntụkwasị obi si nwee ‘obi ilu ma kwasie ákwá ike.’ (1 Samuel 1:7, 10) Nehemaịa ‘kwakwara ákwá, ruo újú ụbọchị ụfọdụ’ ma nweekwa “obi jọrọ njọ.” (Nehemaịa 1:4; 2:2) Job kpọrọ ndụ ya asị ma chee na Chineke agbahapụwo ya. (Job 10:1; 29:2, 4, 5) Eze Devid kwuru na mmụọ ya koropụrụ n’ime onwe ya, na obi ya makwara etili. (Abụ Ọma 143:4) Pọl onyeozi kwukwara banyere inwe “egwu dị n’ime” na ịbụ onye ‘dị ala n’obi’ ma ọ bụ onye ‘a tụdara n’ala’ n’ụzọ mmetụta uche. —2 Ndị Kọrint 4:9; 7:5, 6.
Ọ bụ ezie na ndị a nile bụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ihe mwute dị iche iche, ụjọ, ma ọ bụ mmechu ihu dị iche iche dị mgbe ọ kpataara ha iru újú. Ma, Chineke agbahapụghị ha ma ọ bụ wepụ mmụọ nsọ ya n’ebe ha nọ. Ọnọdụ ịda mbà n’obi ha abụghị n’ihi ọdịda ha dara n’ihe ime mmụọ. N’otu oge mgbe Devid nọ ná nsogbu, ọ rịọrọ n’ekpere, sị: “Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa.” Chineke kasiri Devid obi ‘n’ụbọchị iru újú’ nke a ma nyere ya aka mgbe e mesịrị ịṅụrị ọṅụ. (Abụ Ọma 86:1, 4, 7) N’otu aka ahụ Jehova ga-enyere ndị ohu ya aka ugbu a.
Ebe ọ bụ na ịda mbà n’obi abụghị n’onwe ya ihe na-egosi ịda ada n’ime mmụọ ma ọ bụ adịghị ike n’uche, onye Kraịst o ji aka ekwesịghị ịgbachi nkịtị n’ihere. Kama nke ahụ, o kwesịrị ime otu ihe kachasị mkpa n’ibuso ọrịa nke a agha. Gịnị ka ọ bụ?
Kwupụta Mmetụta Gị Nile
O kwesịrị ịgwa onye ọzọ banyere ya. Ilu 12:25 kwuru, sị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi ruru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ịdị ukwu nke nchegbu obi gị ma ọ bụghị ma i meghere ọnụ ma kwuo banyere ya. Site n’ịkọrọ onye nwere ọmịiko bụ́ onye pụrụ inye aka, o doro anya na ị ga-achọpụta na ndị ọzọ enwewo ụdị mmetụta na nsogbu ndị ahụ. Ọzọkwa, ikwupụta mmetụta bụ usoro na-agwọ ọrịa, n’ihi na ọ na-adajụ obi ikwupụta ahụmahụ ndị na-egbu mgbu n’obi kama ibu ha n’obi. Ya mere, ndị dara mbà n’obi kwesịrị ịkọrọ onye bụ di ma ọ bụ nwunye ha, nne ma ọ bụ nna, ma ọ bụ enyi nke nwere ọmịiko ma ruo eruo n’ime mmụọ.—Ndị Galetia 6:1.
Otu akụkụ nke nsogbu Marie (onye e hotara n’isiokwu mbụ) bụ na o bugidere nsogbu mmetụta uche ndị ahụ n’obi nke dubara ya n’ịda mbà n’obi. “Eri ọtụtụ afọ, anọwo m na-egosi na nsogbu adịghi,” ka o kwuru. “Ọ dịghi mgbe ndị ọzọ ga-eche na m na-enwe ihe isi ike dị otú ahụ ibuso mmetụta ndị a nke abaghi uru ọ bụla agha.” Ma Marie kwupụtara obi ya gwa otu onye okenye nọ n’ọgbakọ ha. Onye okenye ahụ site n’ịjụ ajụjụ ndị e ji aghọta ihe ‘dọpụtara’ site n’obi ya nchegbu o bu ma nyere ya aka ịghọta onwe ya n’ụzọ ka mma. (Ilu 20:5) Okwu ọma ya ndị sitere n’Akwụkwọ nsọ nyere ya nchekwube. “Na nke mbụ ya, amalitere m inweta enyemaka iji chee mmetụta ụfọdụ ndị so kpatara m ịda mbà n’obi ihu,” ka Marie kọwara.
Ya mere ịkọrọ otu onye okenye na-aghọta ihe nwere ike ịbụ “mmiri” ime mmụọ na-enye ume ọhụrụ nye onye ahụ nke ‘mkpụrụ obi ya dị ka ala nke ịda mbà.’ (Aịsaịa 32:1, 2; Abụ Ọma 143:6) Onye ndụmọdụ ime mmụọ na-aghọta ihe nwere ike ọbụna inyere gị aka ịhụ ụzọ ndị ị pụrụ isi mee ihe ndị bara uru n’ibuso ihe ị pụrụ iche na ọ bụ ọnọdụ olileanya na-adịghi ya agha. (Ilu 24:6) Ma a ga-eme ihe karịrị naanị ịkọrọ onye ọzọ.
Ịmata Uru Ị Bara n’Ezie
Mmetụta nke abaghị uru ọ bụla bụ oké ihe na-eso akpata ịda mbà n’obi. Ma eleghi anya n’ihi enweghi obi ụtọ n’oge mmadụ bụ nwatakịrị, ndị Kraịst ụfọdụ na-enwe ùgwù onwe onye dị ala. Ma ọ bụ ezie na mmejọ n’ụzọ anụ ahụ́, nke uche, ma ọ bụ nke mmekọahụ e mere n’oge gara aga ebowo àpà ná mmetụta uche, nke a adịghị agbanwe uru mmadụ bara. Otú a, ị ghaghị ịgba mbọ inwe echiche ziri ezi banyere uru ị bara n’ezie dị ka mmadụ. Pọl onyeozi gbara ume kwuo, sị: “Aga m agwa onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ ghara ibuli onwe ya elu karia uru ọ bara n’ezie, kama ka o jiri nlezianya tụọ onwe ya n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.” (Ndị Rom 12:3, Charles B. Williams) Ka ị nọ na nche megide ịdị mpako, i kwesịrị ịgba mbọ ka ị ghara iru nsọtụ nke dị iche. Ndị ha na Chineke na-enwe mmekọrita bụ ndị dị oké ọnụ ahia, ndị ọ na-achọsi ike, n’ihi na ọ na-ahọpụta ụmụ mmadụ ighọ “ihe nke aka” ya. Lee ihe ùgwù pụrụ iche nke a bụ! —Malakaị 3:17; Hagaị 2:7.
Ọzọkwa, lee ihe ùgwù ọ bụ ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” site n’ikere òkè n’ọrụ ndị Kraịst nke ime ndị na-eso ụzọ. (1 Ndị Kọrint 3:9; Matiu 28:19, 20) Ọtụtụ ndị Kraịst dara mbà n’obi achọpụtawo na ọrụ nke a na-ewelite abamuru onwe onye. “Ọbụna mgbe m ghọsiri onye Kraịst, enwere m mmetụta nke ịbụ onye na-erughi eru ma ọlị,” ka Marie kwetara. Ọzọ, ọ nọgidere n’ọrụ ime nkwusa, n’otu ụbọchị o zutekwara otu nwa agbọghọ nwere ọrịa ụbụrụ nke chọrọ ka a kuziere ya Bible. “Ọ chọrọ onye ga-eji nwayọọ soo ya, ebe ọ bụ na ọ naghị amụta ihe ọsọ ọsọ,” ka Marie kwuru. “N’ihi na atụkwasiri m uche hie nne n’ebe ọ nọ, echezọrọ m banyere onwe m na erughi eru m nile. Enyemaka m dị ya mkpa, achọpụtakwara m na apụrụ m inyere ya aka site n’ike Jehova. Ịhụ ka o mere baptism gbara m ume karịrị okwukwu. Ùgwù onwe onye m mụbara, oké ịda mbà n’obi ahụ hapụkwara m aka.” Lee ka o si bụrụ eziokwu na “onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ”!—Ilu 11:25.
Ma, ọtụtụ ndị dara mbà n’obi ekwuwo dị ka otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nke dara oké mbà n’obi, bụ́ onye kwetara, sị: “Ọ bụ ezie na m na-arụsi ọrụ ike idebe ihe ọcha na isi nri na ịnabata ndị ọbịa nke ọma, e mesịa ana m akatọ onwe m banyere ihe ọ bụla nke m mehiere.” Ịta ụta dị otú ahụ ezi uche na-adịghi na ya na-emebi ùgwù onwe onye. Cheta na Chineke anyi na-aghọta otú ọ dị anyi n’obi, na ọ bụghi “mgbe nile ka ọ ga-ese okwu.” (Abụ Ọma 103:8-10, 14) Ọ bụrụ na Jehova, bụ́ onye nwere nghọta nke ihe dị mma karia otú anyị nwere, adịghị agbọja anyị banyere obere adịghị ike ọ bụla anyị nwere ma dị njikere inwe ndidi, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgba mbọ iṅomi ya ná mmeso anyi na-emeso onwe anyị?
Anyi nile nwere ntụpọ na adịghị ike dị iche iche. Ma, anyị nwere ike n’otu aka ahụ. Pọl onyeozi atụghị anya na ya onwe ya ga-eme nke ọma ná mgbalị ya nile. “Ma a si na ọ bụ ezie na abụ m onye na-amụtaghị akwụkwọ n’ụzọ ikwu okwu, ma abụghị m otú a n’ụzọ ihe ọmụma,” ka o kwuru. Pọl enweghi mmetụta ịbụ onye dị ala naani n’ihi na ọ pụrụ ibụ na o meghi nke ọma dị ka onye ọkàokwu n’ihu ọha. (2 Ndị Kọrint 11:6) N’otu aka ahụ, ndị dara mbà n’obi kwesịrị ịtụgharị uche n’ihe ndị ahụ ha na-eme nke ọma na ha.
“N’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị,” ma ọ bụ n’ebe ndị ahụ matara ma nakwere na ọ dị ihe ndị ha na-apụghi ime. (Ilu 11:2) Onye ọ bụla n’ime anyị bụ mkpụrụ obi pụrụ iche na-enwe ọnọdụ, ike ọkpụkpụ aka, na ikike dị iche iche. Ka i ji obi gi nile na-ejere Jehova ozi, na-eme ihe i nwere ike ime, ọ na-amasi ya. (Mak 12:30-33) Chineke abụghi onye afọ na-adịghi eju mgbe ọ bụla site ná mgbalị nile nke ndị ji obi ha na-efe ya. Leora, bụ́ onye Kraịst nwere ihe ịga nke ọma n’ibuso ịda mbà n’obi ya agha, kwuru, sị: “Adịghị m emecha nke ọma dị ka onye ọ bụla ọzọ na-eme n’ụfọdụ ihe, dị ka iche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ n’ozi ubi. Ma ana m anwa. Ihe m na-eme bụ otú ike m hà.”
Idozi Ngahie na Nghọtahie Dị Iche Iche
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na i mehie n’oké ihe? Ma eleghị anya ị na-enwe mmetụta dị ka Eze Devid, bụ onye ‘jegharịrị na-eyi uwe mkpé ruo ogologo ụbọchị’ n’ihi njehie ya nile, ma ọ bụ mmehie. Ma mmetụta nke a ị na-enwe bụ ihe àmà na ị gabigabeghị ókè ma mee mmehie na-enweghị mgbaghara! (Abụ Ọma 38:3-6, 8) Inwe mmetụta nke ikpe ọmụma nwere ike igosi na onye ahụ meworo mmehie nwere ezi obi na akọ na uche dị mma. Ya mere olee otú a pụrụ isi dozie ikpe ọmụma ahụ? Ọ dị mma, ì kpewo ekpere maka mgbaghara Chineke ma mee ihe dị iche iche iji dozie ihe ahụ e mebiri? (2 Ndị Kọrint 7:9-11) Ọ bụrụ otú ahụ, nwee okwukwe n’obi ebere nke Onye ahụ na-agbaghara n’ụzọ dị ukwuu, ma na-ekpebisi ike ịghara ime mmehie ahụ ọzọ. (Aịsaịa 55:7) Ọ bụrụ na a dọwo gị aka ná ntị, ‘adala mbà mgbe a na-atụ gị mmehie gị n’anya, n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.’ (Ndị Hibru 12: 5, 6) Nzube nke mgbazi dị otú ahụ bụ iji nyere atụrụ na-akpafu akpafu aka ịkwụsi ike ọzọ. Ọ naghị ewetu ùgwù o nwere dị ka mmadụ ala.
Ọbụna ma ọ bụrụ na obi anyị amaa anyị ikpe, ọ dịghị mkpa ka anyị kwubie na Jehova amawo anyị ikpe. “Meekwa ka obi anyị kwenye ekwenye n’ihu ya, n’ihe ọ bụla nke obi anyị na-ama anyị ikpe n’ime ya; n’ihi na Chineke ka obi anyị ukwu, ọ makwaara ihe nile.” (1 Jọn 3:19, 20) Jehova na-ahụ ihe karịrị mmehie na njehie anyị. Ọ maara banyere ọnọdụ ndị siri oké ike, ụzọ ndụ anyị nile, ebumnuche na izu anyi nile. Ịdị ukwu nke ihe ọmụma ya na-eme ka o nwee ike iji ọmịiko nụ ekpere anyị sitere n’obi maka mgbaghara, dị ka ọ nụrụ nke Devid.
Gị na ndị ọzọ inwe nghọtahie na mmadụ ichegbu onwe ya banyere ịnata ihu ọma ha na-akpatakwa enweghi ùgwù onwe onye, ma eleghi anya ọbụna na-enwe mmetụta nke ịbụ onye a jụrụ ajụ. N’ihi ezughi okè, onye Kraịst ibe gị nwere ike ịgwa gị okwu n’ụzọ yiri nke enweghi mmetụta ma ọ bụ enweghi obi ebere. Ma, a pụrụ idozi ọtụtụ nghọtahie site n’ịgwa onye ahụ otú ihe o kwuru si metụta gị. (Tụlee Matiu 5:23, 24.) Ọzọkwa, Solomọn nyere ndụmọdụ, sị: “Atụkwasila obi gi n’okwu nile a na-ekwu.” N’ihi gini? “N’ihi na ọtụtụ mgbe obi gi mawooro na gi onwe gi akọchawo ndị ọzọ.” (Eklisiastis 7:21, 22) Atụla anya izu okè nke onwe gi n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya ma ọ bụ ná mmekọrịta gị na mmadụ ndị ọzọ ndị na-ezughi okè. Dị ngwa ịgbaghara ma soro ndị ọzọ na-akpakọrịta.—Ndị Kọlọsi 3:13.
Ọzọkwa, uru ị bara n’ezie abụghị nke a na-atụ n’ihe ọ̀tụ̀tù n’ụzọ bụ́ isi ma ị bụ onye ndị ọzọ hụrụ n’anya ma ọ bụ na ị bụghị. Kraịst bụ onye ‘a na-agụghị . . . n’ihe,’ ọ bụkwa onye ‘e weere site n’otú ndị ọzọ si ele ihe anya’ dị ka onye dị nnọọ ala. (Aịsaịa 53:3; Zekaraịa 11:13) Nke a ọ̀ gbanwere uru ọ bara n’ezie ma ọ bụ otú Chineke si were ya? Ee e, n’ihi na ọbụna ma ọ bụrụ na anyị zuru okè, dị ka Jisọs, anyị apụghi ime ihe na-amasị onye ọ bụla.
Inwe Ike Ịtachi Obi
Mgbe ụfọdụ, oké ịda mbà n’obi pụrụ ịdịgide n’agbanyeghị mgbalị anyị nile imeri ya. Ihe mgbu nke mmetụta uche nwere ike ọbụna mee ka ụfọdụ ndị Kraịst chee dị ka Jona: “Ọ ka m mma ịnwụ anwụ karịa ịdị ndụ.” (Jona 4:1-3) Ma, ihe mgbu ya anọgideghị na-adị. O meriri ya. Ya mere ọ bụrụ na ịda mbà n’obi emee ka ndụ gị yie nke a na-apụghị ịnọ na-adị, cheta na ọ dị ka mkpagbu ahụ Pọl sịri na ọ ga-adịru “nwa oge.” (2 Ndị Kọrint 4:8, 9, 16-18) Ọ ga-abịa ná ngwụsị! Ọ dịghị ọnọdụ ọ bụla a na-enweghị olileanya na ya. Jehova kwere nkwa “ime ka obi nke ndị nọ n’ihe mgbu dịghachi mma.”—Aịsaịa 57:15, Lamsa.
Ya adịla mgbe ị kwụsiri ikpe ekpere, ọbụna ma ọ bụrụ na ekpere gị eyie nke na-adịghị arụpụta ihe. Devid rịọrọ, sị: “Chineke, nụrụ olu iti mkpu m, . . . mgbe, obi m na-adịghị ike: ruo n’oké nkume nke ka m elu ka ị ga-eduru m jee.” (Abụ Ọma 61:1, 2) Olee otú Chineke si eduru anyị gaa n’inwe obi ike n’ime onwe onye nke na-eyi ihe na-apụghị ikwe omume site n’ike nke anyị? Eileen, bụ́ onye gbasoworo ịda mbà n’obi mgba ruo ọtụtụ afọ, zara, sị: “Jehova ekwebeghị ka ike gwụ m. Nke a na-eme ka m nwee olileanya na ọ bụrụ na m anọgide na-etinye mgbalị, ọ ga-anọgide na-enyere m aka. Ịmata eziokwu Bible emewo nnọọ ka m nọgịde na-adị ndụ. Site n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche—ekpere, ije ozi, nzukọ dị iche iche, akwụkwọ dị iche iche, ezinụlọ, na ndị enyi—Jehova enyewo m ike ịnọgide na-agbalị.”
Na-ele ọrịa ahụ anya dị ka ọnwụnwa a na-anwa okwukwe gị. “Ị pụrụ ịtụkwasị Chineke obi,” ka Pọl onyeozi mesiri anyị obi ike. “Ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ka unu pụrụ ịnagide. Ma mgbe a na-anwa unu, ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike ịnagide ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13, Beck) Ee, Jehova ga-enye gị “ọkịka nke ike” iji bugide ibu ọ bụla nke mmetụta uche.—2 Ndị Kọrịnt 4:7.
Ụwa Ọhụrụ nke Ịda Mbà n’Obi Na-adịghị!
Chineke kwere nkwa iwepụ n’oge na-adịghị anya site n’Alaeze eluigwe ya, ọnọdụ nile na-akpata ịda mbà n’obi n’ime ụwa anyị. Okwu ya kwupụtara, sị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mgbu nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebị n’ihi ihe nke mụ onwe m na-eke.” (Aịsaịa 65:17, 18) Okwu ndị ahụ mezuru na nke mbụ ya laa azụ n’afọ 537 T.O.A., n’oge ahụ mgbe e weghachiri mba ochie nke Israel n’ala ya. Mgbe ahụ ndị ya bụrụ abụ, si: “Anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. Mgbe ahụ ọchị na-eju anyị ọnụ, iti mkpu ọṅụ na-ejukwa anyị ire.” (Abụ Ọma 126:1, 2) Lee ka o si dị ukwuu bụ mmezu ikpeazụ a ga-emezu amụma nke a na-enye obi ụtọ n’oge na-adịghị anya n’ime ụwa ọhụrụ Chineke!--2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1-4.
N’okpuru Alaeze Chineke (“eluigwe ọhụrụ” ahụ), ọha mmadụ nke ndị ezi omume bi n’elu ụwa (“ụwa ọhụrụ” ahụ) ga-abụ ndị e weghachiri n’ahụ́ ike zuru okè nke mmetụta uche, anụ ahụ́, na ime mmụọ. Ọ bụghị na ndị a agaghị echetakwa ihe mere n’oge gara aga, ma n’ihi ihe obi ụtọ nile ha ga-eche banyere ha ma nweekwa ọṅụ n’ihi ya n’oge ahụ, ọ dịghi ihe mere ha ga-eji cheta ma ọ bụ tụkwasị uche ahụmahụ nile nke na-adịghị enye obi ụtọ ndị mere n’oge gara aga. Cheedị echiche, ibilite n’ụtụtụ ọ bụla na-enwe uche dị ọcha obi ụtọ jupụtara, na-adị njikere ịmalite ihe omume nke ụbọchị ahụ—n’enweghịkwa nsogbu nke ịnọ n’ọnọdụ ịda mbà n’obị!
N’ịbụ onye obi siri ike banyere izi ezi nke olileanya nke a, Lola (bụ́ onye e hotara ná mmalite) kwuru, sị: “Icheta na Alaeze Jehova ga-ewepụ nsogbu nke a bụ ihe kachasị nyere m aka. Amatara m na ịda mbà n’obi ahụ agaghị adịgide ruo mgbe ebighi ebi.” Ee, ị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-eme ka o kwe omume imeri ịda mbà n’obi kpam kpam n’oge na-adịghi anya!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Lee “Ibuso Oké Ịda Mbà n’Obi Agha—Ọgwụgwọ nke Onye Ọkachamara” ná mbipụta nke Teta! (Bekee), October 22, 1981.