Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 5/15 p. 17-22
  • Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Site N’ọchịchọ Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Site N’ọchịchọ Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịchị Ezinụlọ
  • Na-abụ Isi ‘n’Obi Na-anụ Ọkụ’
  • Ndị Na-azụ Atụrụ Site n’Ọchịchọ Obi
  • Ịdị Nwayọọ Dị Mkpa
  • Iji Nlezianya Na-azụ Atụrụ
  • “Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Nke Unu Na-elekọta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Ọzụzụ Atụrụ, Ṅomienụ Ndị Ọzụzụ Atụrụ Kacha Ukwuu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Otú Ndị Ọzụzụ Atụrụ Bụ́ Ndị Kraịst Si Na-ejere Gị Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • “Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 5/15 p. 17-22

Na-azụnụ Ìgwè Atụrụ Chineke Site N’ọchịchọ Obi

“Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi.”​—⁠1 PITA 5:2.

1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị ịtụ anya ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke site n’ọchịchọ obi’?

JEHOVA na-azụ ndị ya dị ka atụrụ site n’ọchịchọ obi. (Abụ Ọma 23:​1-⁠4) “Onye ọzụzụ atụrụ ọma,” bụ́ Jisọs Kraịst, ji ọchịchọ obi ya nye ndụ mmadụ ya zuru okè maka ndị yiri atụrụ. (Jọn 10:​11-⁠15) Ya mere, Pita onyeozi gbara ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ume ka ha ‘na-azụ ìgwè atụrụ Chineke site n’ọchịchọ obi.’​—⁠1 Pita 5:2.

2. Ajụjụ ndị dị aṅaa ka e kwesịrị ịtụle banyere ọrụ ọzụzụ atụrụ nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?

2 Ọchịchọ obi bụ ihe e ji amata ndị ohu Chineke. (Abụ Ọma 110:3) Ma a chọrọ ihe karịrị nanị ọchịchọ obi nke onye Kraịst bụ́ nwoke maka ịhọpụta ya dị ka onye nlekọta, ma ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru. Ònye ruru eru ịbụ onye ọzụzụ atụrụ dị otú ahụ? Gịnị ka ọzụzụ atụrụ ha gụnyere? Olee ụzọ kasị mma e si arụzu ya?

Ịchị Ezinụlọ

3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụzọ onye Kraịst bụ́ nwoke si elekọta ezinụlọ ya na-emetụta ma ò ruru eru ịbụ onye ọzụzụ atụrụ n’ọgbakọ?

3 Tupu nwoke abụrụ onye a pụrụ ịhọpụta ‘n’ọnọdụ onye nlekọta,’ ọ ghaghị iru ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ. (1 Timoti 3:​1-⁠7; Taịtọs 1:​5-⁠9) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi sịrị na onye nlekọta kwesịrị ịbụ “onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma, na-enwekwa ụmụ ya n’okpuru ya n’ikwesị nsọpụrụ nile.” E nwere ezi ihe kpatara nke a, n’ihi na Pọl sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla amataghị otú ọ ga-achị ezinụlọ nke aka ya, ọ̀ ga-esi aṅaa lee nzukọ Chineke anya nke ọma?” (1 Timoti 3:​4, 5) Mgbe ọ na-ahọpụta ndị okenye n’ọgbakọ ndị dị n’àgwàetiti nke Krit, a gwara Taịtọs ka ọ chọọ “onye ọ bụla bụ́ onye a na-apụghị ibo ebubo, di nke otu nwunye, na-enwe ụmụ kwere ekwe, bụ́ ndị a na-eboghị ebubo na ha na-adị ndụ ịla n’iyi, ndị na-abụghịkwa ndị na-ekweghị ịdị n’okpuru iwu.” (Taịtọs 1:6) Ee, a ghaghị ịtụle ụzọ onye Kraịst bụ́ nwoke si elekọta ezinụlọ ya iji kpebie ma ò ruru eru iwere ibu ọrụ buru ibu karị nke ịzụ ọgbakọ dị ka atụrụ.

4. Tụkwasị n’inwe ọmụmụ Bible chiri anya na ekpere, olee ụzọ ndị Kraịst mụrụ ụmụ si egosi ịhụnanya maka ezinụlọ ha?

4 Ndị ikom na-achị ezinụlọ nke aka ha nke ọma na-eme ihe karịrị isoro ezinụlọ ha na-ekpe ekpere ma na-amụ Bible n’ụzọ chiri anya. Ha na-adị njikere mgbe nile inyere ndị ha hụrụ n’anya aka. Nye ndị ahụ mụrụ ụmụ, nke a na-amalite n’ụbọchị ahụ a mụrụ nwa. Ndị mụrụ ụmụ bụ́ ndị Kraịst maara na ha rapagidesie ike n’ụkpụrụ Chineke n’ụzọ chiri anya karị, n’oge na-adịghị anya ụmụ ha ndị na-eto eto ga-ekwekọ n’usoro ihe omume ndị Kraịst ha ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Ụzọ onye Kraịst bụ́ nna si achị nke ọma n’ọnọdụ ndị a na-apụta ìhè n’iru eru ya dị ka onye okenye.​—⁠Ndị Efesọs 5:​15, 16; Ndị Filipaị 3:16.

5. Olee ụzọ onye Kraịst bụ́ nna pụrụ isi zụlite ụmụ ya “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị”?

5 N’ịchị ezinụlọ nke aka ya, onye Kraịst bụ́ nna nke na-elezi anya na-aṅa ntị ná ndụmọdụ Pọl: “Akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Isoro ezinụlọ na-enwe ọmụmụ Bible chiri anya, ma nwunye ma ụmụ, na-ewepụta ohere ndị dị mma maka ndụmọdụ ịhụnanya. Ụmụ na-esi otú a anata “ọzụzụ,” ma ọ bụ ndụmọdụ ndị na-agbazi olu. “Ịdụ ọdụ” ndị na-ewere ọnọdụ mgbe ahụ na-enyere nwa nke ọ bụla aka ịbịa mara echiche Jehova n’ihe dị iche iche. (Deuterọnọmi 4:9; 6:6, 7; Ilu 3:11; 22:6) N’ọnọdụ ntụsara ahụ nke nnọkọ ime mmụọ nke a, nna ahụ na-ahụ n’anya na-eji nlezianya ege ntị ka ụmụ ya na-ekwu okwu. A na-eji ajụjụ njụpụta nke obi ọma eme ihe ịkpali ha ikwu eziokwu banyere nchegbu na àgwà ha. Onye bụ nna adịghị eche na ya maara ihe nile na-aga n’uche ụmụ ya. N’ezie, “onye na-azaghachi okwu tupu ọ nụ, uche gbagọrọ agbagọ na ọnọdụ ihere ka ọ bụụrụ ya,” ka Ilu 18:13 na-asị. Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mụrụ ụmụ na-achọpụta na ọnọdụ ndị ụmụ ha na-ezute dị iche nke ukwuu site ná ndị ha zutere mgbe ha onwe ha na-eto eto. N’ihi nke a, onye bụ nna ga-agba mbọ ịmata ihe kpatara nsogbu na otú o si mee tupu a malite ikwu ụzọ a ga-esi lebara ya anya.​—⁠Tụlee Jemes 1:19.

6. N’ihi gịnị ka onye Kraịst bụ́ nna kwesịrị iji tụlee Okwu Chineke mgbe ọ na-enyere ezinụlọ ya aka?

6 Gịnị na-esochi mgbe mmadụ matasịrị nsogbu, nchegbu, na àgwà nke ụmụ ya? Nna nke na-achị nke ọma na-atụle Akwụkwọ Nsọ, bụ́ nke “bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.” Ọ na-akụziri ụmụ ya ụzọ isi tinye nduzi Bible sitere n’ike mmụọ nsọ n’ọrụ. N’ụzọ dị otú a, ndị ahụ ka na-eto eto n’afọ ndụ na-aghọ ‘ndị zuru okè, ndị e meworo ka ha zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’​—⁠2 Timoti 3:​16, 17; Abụ Ọma 78:​1-⁠4.

7. Ihe nlereanya dị aṅaa ka onye Kraịst bụ́ nna kwesịrị isetịpụ n’ihe banyere ekpere?

7 Ndị ntorobịa na-asọpụrụ Chineke na-ezute ọnọdụ ihe isi ike n’etiti ụmụ akwụkwọ ibe ha bụ́ ndị ụwa. Ya mere olee ụzọ onye Kraịst bụ́ nna ga-esi belata ụjọ na-atụ ụmụ ha? Otu ụzọ bụ site n’iso ha na-ekpe ekpere na ikpere ha ekpere mgbe mgbe. Mgbe ndị a na-eto eto na-ezute ọnọdụ ndị na-etinye mmadụ n’ọnwụnwa, o yikarịrị ka ha ga-eṅomi ndị mụrụ ha n’ịdabere na Chineke. Otu nwatakịrị nwanyị nke dị afọ 13, nke a gbara ajụjụ ọnụ tupu e mee ya baptism ná ngosipụta nke nrara ya nye Chineke, kọrọ na ọ natawo okwu ịkwa emo na okwu mkparị site n’aka ụmụ akwụkwọ ibe ya. Mgbe ọ kwadoro nkwenkwe ya dabeere na Bible banyere ịdị nsọ nke ọbara, ụmụ agbọghọ ndị ọzọ tiri ya ihe ma bụọ ya asọ. (Ọrụ 15:​28, 29) Ò megwaara? Ee e. “Anọgidere m na-ekpegara Jehova ekpere ka o nyere m aka ịnọ jụụ,” ka ọ kọwara. “Echetakwara m ihe ndị mụrụ m kụziwooro m n’ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị banyere mkpa ọ dị ijide onwe anyị n’okpuru ihe ọjọọ.”​—⁠2 Timoti 2:24.

8. Olee ụzọ onye okenye nke na-enweghị ụmụ pụrụ isi na-achị ezinụlọ ya nke ọma?

8 Onye okenye nke na-enweghị ụmụ pụkwara ime ndokwa ime mmụọ na nke ihe onwunwe zuru ezu maka ndị nọ n’ezinụlọ ya. Nke a na-agụnye nwunye ya na ma eleghị anya ndị Kraịst bụ́ ndị ikwu ya ọ na-azụ, bụ́ ndị bi n’ụlọ ya. (1 Timoti 5:8) Isi otú ahụ na-achị n’ụzọ dị mma bụ otu n’ime ihe ndị a chọrọ nke nwoke a họpụtara ibu ibu ọrụ dị ka onye okenye ọgbakọ na-aghaghị iru. Mgbe ahụ, olee ụzọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta kwesịrị isi lee ibu ọrụ ihe ùgwù ha anya n’ọgbakọ?

Na-abụ Isi ‘n’Obi Na-anụ Ọkụ’

9. Àgwà dị aṅaa ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye kwesịrị inwe n’ebe ozi e kenyere ha dị?

9 Na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, Pọl onyeozi jere ozi dị ka onye na-eje ozi n’ezinụlọ Chineke, bụ́ ọgbakọ ndị Kraịst nke nọ n’okpuru ịchịisi Kraịst. (Ndị Efesọs 3:2, 7; 4:15) N’akụkụ nke ya, Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume na Rom, sị: “Ebe anyị nwere onyinye amara dị iche iche dị ka amara nke e nyere anyị si dị, ma ànyị nwere ibu amụma, ka anyị na-ebu amụma ka okwukwe anyị hà; ma ọ bụ ije ozi, ka anyị na-anọ n’ije ozi anyị; ma ọ bụ onye na-ezi ihe, ya nọọ n’ozizi ya; ma ọ bụ onye na-akasi obi, ya nọọ ná nkasi obi ya: onye na-eme ka ndị ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ ofufo mee ya; onye bụ onye isi, ya were obi na-anụ ọkụ na-abụ isi; onye na-eme ebere, ya were obi ụtọ mee ya.”​—⁠Ndị Rom 12:​6-⁠8.

10. N’ilekọta ìgwè atụrụ Chineke, ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụụrụ ndị okenye n’oge a?

10 Pọl chetaara ndị Tesalonaịka, sị: “Dị ka nna si emere ụmụ nke aka ya, [anyị] na-arịọ unu, na-akasikwa unu obi, na-agwasikwa unu okwu ike, ka unu wee na-ejegharị dị ka o kwesịịrị Chineke, onye na-akpọbata unu n’alaeze na ebube nke aka ya.” (1 Ndị Tesalonaịka 1:1; 2:11, 12) E nyewo agbamume ahụ n’ụzọ ịhụnanya, nke dị nro nke na Pọl pụrụ ide, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:​7, 8) N’ikwekọ n’ihe atụ omume nna nke Pọl, ndị okenye na-anọgidesi ike n’ihe na-enwe nchegbu miri emi maka ndị nile nọ n’ọgbakọ.

11. Olee ụzọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta pụrụ isi gosi ịnụ ọkụ n’obi?

11 Ịdị nro, ya na ịnụ ọkụ n’obi, aghaghị ịbụ ihe e ji amata nlekọta ịhụnanya nke ndị Kraịst anyị bụ́ ndị ọzụzụ atụrụ na-ekwesị ntụkwasị obi na-egosipụta. Omume ha na-ekpughe ọtụtụ ihe. Pita na-enye ndị okenye ndụmọdụ ka ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke ‘ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa ha’ ma ọ bụ “n’ihi uru na-eweta ihere.” (1 Pita 5:2) N’ihe banyere nke a, onye ọkà mmụta bụ́ William Barclay kwupụtara otu okwu ịdụ ọdụ dị ịrịba ama, na-ede, sị: “Ọ dị ụzọ e si anakwere ọkwá na ụzọ e si eje ozi nke na-adị ka à ga-asị na ọ bụ ọrụ ndọlị na nke na-adịghị enye obi ụtọ, dị ka à ga-asị na ọ na-agwụ ike, dị ka à ga-asị na ọ bụ ibu arọ nke na-akpasu iwe. Ọ bụ nnọọ ihe kwere omume ịgwa mmadụ ka o mee ihe, na ya ime ya, ma mee ya n’ụzọ iwe nke na a na-emebi ihe nile e mere. . . . Ma [Pita] na-ekwu na onye Kraịst ọ bụla kwesịrị inwe ọchịchọ na-anụ ọkụ ije ozi dị otú ahụ dị ka o nwere ike, ọ bụ ezie na ọ maara nke ọma na ya erughị eru ije ya.”

Ndị Na-azụ Atụrụ Site n’Ọchịchọ Obi

12. Olee ụzọ ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ isi gosipụta ọchịchọ obi?

12 “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu . . . site n’ọchịchọ obi,” ka Pita gbakwara ume. Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta nke na-azụ atụrụ ndị ahụ na-eme otú ahụ site n’ọchịchọ obi, dị ka o si metụ ya n’obi, n’okpuru ntụziaka nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Iji ọchịchọ obi na-eje ozi pụtakwara na onye Kraịst bụ́ onye ọzụzụ atụrụ na-anọ n’okpuru ịchịisi Jehova, bụ́ ‘onye na-azụ ma na-elekọta mkpụrụ obi anyị.’ (1 Pita 2:25) Onye Kraịst bụ́ onye ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru na-eji ọchịchọ obi egosipụta nkwanye ùgwù maka ndokwa ọchịchị Chineke. Ọ na-eme otú ahụ mgbe ọ na-eduziri ndị na-achọ ndụmọdụ ụzọ gaa n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ bụ ezie na ahụmahụ ga-enyere onye okenye aka iwulite ihe ọmụma nke ndụmọdụ dabeere na Bible, nke a apụtaghị na ọ ga-ama ihe ngwọta Akwụkwọ Nsọ nye nsogbu ọ bụla n’egbughị oge. Ọbụna mgbe ọ maara azịza nye ajụjụ, ọ pụrụ ịchọpụta na amamihe dị na ya isoro onye ahụ jụrụ ajụjụ tụlee Watch Tower Publications Index ma ọ bụ akwụkwọ index ndị yiri ya. O si otú a na-akụzi ihe n’ụzọ abụọ: Ọ na-egosi ụzọ isi chọta ihe ọmụma na-enye aka ma jiri ịdị umeala na-egosi nkwanye ùgwù maka Jehova site n’ịdọrọ uche gaa n’ihe nzukọ Chineke bipụtaworo.

13. Nzọụkwụ ndị aṅaa pụrụ inyere ndị okenye aka inye ndụmọdụ dị mma?

13 Gịnị ka onye okenye pụrụ ime ma ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e bipụtaworo n’akwụkwọ Society nke na-atụle kpọmkwem nsogbu ahụ pụtaranụ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-ekpe ekpere maka nghọta, ọ ga-emekwa nnyocha ịchọta ụkpụrụ Bible ụfọdụ ndị metụtara okwu ahụ. Ọ pụkwara ịhụ ya dị ka ihe bara uru ịtụ aro ka onye ahụ na-achọ enyemaka tụlee ihe nlereanya Jisọs. Onye okenye pụrụ ịjụ, sị: “Ọ bụrụ na Jisọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu ahụ, nọ n’ọnọdụ gị, gịnị ka i chere ọ ga-eme?” (1 Ndị Kọrint 2:16) Ntụgharị uche dị otú ahụ pụrụ inyere onye ahụ na-ajụ ajụjụ aka ime mkpebi amamihe dị na ya. Ma lee ihe amamihe na-adịghị na ya ọ ga-abụ ma onye okenye ahụ kwuo nnọọ ihe bụ uche nke aka ya dị ka à ga-asị na ọ bụ ndụmọdụ dị mma nke Akwụkwọ Nsọ! Kama nke ahụ, ndị okenye pụrụ isoro ibe ha tụlee nsogbu ndị siri ike. Ha pụrụ ọbụna iwepụta okwu dị mkpa maka ntụle ná nzukọ nke òtù ndị okenye. (Ilu 11:14) Mkpebi e mere na nke ahụ ga-enyere ha nile aka ikwu otu ihe.​—⁠1 Ndị Kọrint 1:10.

Ịdị Nwayọọ Dị Mkpa

14, 15. Gịnị ka a chọrọ ndị okenye n’aka mgbe ha na-eme ka onye Kraịst guzozie bụ́ onye ‘a nwụdere mgbe ọ nọ ná ndahie’?

14 Ọ dị mkpa ka onye Kraịst bụ́ okenye na-egosipụta ịdị nwayọọ mgbe ọ na-ezi ndị ọzọ ihe, karịsịa mgbe ọ na-enye ha ndụmọdụ. “Ụmụnna m,” ka Pọl dụrụ ọdụ, “a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ.” (Ndị Galetia 6:1) N’ụzọ na-adọrọ mmasị, okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “guzozie” metụtara okwu ịwa ahụ e ji kọwaa ịgbazi ọkpụkpụ iji gbochie inwe ọrụsị n’oge nile a dị ndụ. Onye na-akọwa okwu bụ́ W. E. Vine ji nke a tụnyere mweghachi “nke ndị mmụọ nsọ na-achị na-eweghachi onye dabara ná mmehie, onye dị otú ahụ dị ka akụkụ ahụ gbajiri agbaji nke ahụ ime mmụọ.” Nsụgharị ndị a pụrụ iji mee ihe bụ, “iweghachi n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị; iweghachi n’usoro kwesịrị ekwesị.”

15 Mmadụ ime ka uche nke aka ya guzozie adịghị mfe, ọ pụkwara isi ike nke ukwuu iweghachi uche nke onye mere mmehie n’usoro kwesịrị ekwesị. Ma enyemaka e nyere ná mmụọ nke ịdị nwayọọ yikarịrị ka ọ bụ nke a ga-anakwere site n’obi ekele. N’ihi nke ahụ, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi.” (Ndị Kọlọsi 3:12) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ime mgbe onye nọ ná mkpa ime mgbanwe nwere àgwà ọjọọ? Ha kwesịrị ‘ịgbaso ịdị nwayọọ.’​—⁠1 Timoti 6:11.

Iji Nlezianya Na-azụ Atụrụ

16, 17. Megide ihe ize ndụ dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị ịnọ na nche mgbe ha na-enye ndị ọzọ ndụmọdụ?

16 E nwere ihe ọzọ dị na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ná Ndị Galetia 6:1. Ọ gbara ndị ikom ruru eru mmụọ nsọ na-achị ume, sị: “Meenụ ka [onye na-eme mmehie] guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” Lee ajọ ihe ndị pụrụ isi na ya pụta ma ọ bụrụ na a ṅaghị ntị na ndụmọdụ dị otú ahụ! N’ịbụ nke a kpaliri site n’akụkọ banyere otu onye ụkọchukwu ndị Anglikan a mara ikpe maka isoro ndị parish ya abụọ kwaa iko, akwụkwọ akụkọ The Times nke London sịrị na nke a bụ “ọnọdụ dịworo ogologo oge: nwoke na-enye ndụmọdụ, nke o doro anya na e weere dị ka nna ma ọ bụ nwanne nwoke, na-adaba n’ọnwụnwa nke isoro onye tụkwasịrị ya obi mee mmehie.” Mgbe ahụ onye ahụ na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ zoro aka n’ihe Dr. Peter Rutter kwuru nke na “omume nrigbu dị n’etiti ndị chọrọ enyemaka na ndị nwoke na-enyere ha aka​—⁠ndị dọkịta, ndị ọkà iwu, ndị ụkọchukwu na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ⁠—​aghọwo, n’ọha anyị nke na-enwe mmekọahụ aghara aghara, ntiwapụ nke a na-achọpụtabeghị, nke na-emebi ihe ma bụrụ ihe ihere.”

17 Anyị ekwesịghị iche na ndị Jehova apụghị ịdaba n’ọnwụnwa ndị dị otú ahụ. Otu onye okenye a na-akwanyere ùgwù nke jeworo ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ tinyere aka n’omume rụrụ arụ n’ihi na o mere nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe nwanna nwanyị lụrụ di nọ mgbe nanị ya nọ. Ọ bụ ezie na o chegharịrị, a napụrụ nwanna ahụ ihe ùgwù ije ozi ya nile. (1 Ndị Kọrint 10:12) Mgbe ahụ, olee ụzọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta pụrụ isi mee nleta ọzụzụ atụrụ n’ụzọ ha na-agaghị adaba n’ime ọnwụnwa? Olee ụzọ ha pụrụ isi mee ndokwa maka inwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ebe zoro ezo, maka ekpere, na maka ohere nke ịtụle Okwu Chineke na akwụkwọ ndị Kraịst?

18. (a) Olee ụzọ itinye ụkpụrụ nke ịchịisi n’ọrụ pụrụ isi nyere ndị okenye aka izere ọnọdụ ndị na-eweta nkọcha? (b) Ndokwa ndị dị aṅaa ka a pụrụ ime maka nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe nwanna nwanyị nọ?

18 Otu isi ihe ndị okenye ga-eburu n’uche bụ ụkpụrụ nke ịchịisi. (1 Ndị Kọrint 11:3) Ọ bụrụ na onye na-eto eto achọọ nduzi, gbaanụ mbọ ime ka ndị mụrụ ya nọrọ ná nkwurịta okwu ahụ n’oge kwesịrị ekwesị. Mgbe nwanna nwanyị lụrụ di rịọrọ maka enyemaka ime mmụọ, ùnu pụrụ ime ndokwa ka di ya nọrọ ya n’oge nleta ahụ? Gịnị ma ọ bụrụ na nke a agaghị ekwe omume ma ọ bụ na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe nke metọworo ya n’ụzọ ụfọdụ? Ya bụrụ otú ahụ meenụ otu ụdị ndokwa ahụ unu ga-eme mgbe a na-eme nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe nwanna nwanyị na-alụbeghị di nọ. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka ụmụnna abụọ ruru eru, ndị mmụọ nsọ na-achị, jekọọ ọnụ ileta nwanna nwanyị ahụ. Ọ bụrụ na nke a adabachaghị, ma eleghị anya a pụrụ ịhọrọ oge kwesịrị ekwesị ka ụmụnna abụọ soro ya nwee nkwurịta okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, karịsịa n’ọnụ ụlọ nke na-enye ohere maka ikwu okwu ná nzuzo. Ebe e nwere ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ọzọ nọ n’ụlọ nzukọ, ọ bụ ezie na ha anọghị n’ọnọdụ ịhụ ma nụpere nkwurịta okwu ahụ, o yikarịrị ka a ga-ezere ihe ọ bụla ga-akpata ịsụ ngọngọ.​—⁠Ndị Filipaị 1:​9, 10.

19. Ịzụ atụrụ Chineke site n’ọchịchọ obi na-emepụta ihe ọma ndị dị aṅaa, ònyekwa ka anyị na-enye ekele maka ndị na-enye ọzụzụ atụrụ site n’ọchịchọ obi?

19 Ịzụ atụrụ Chineke site n’ọchịchọ obi na-emepụta ihe ndị dị mma​—⁠ìgwè atụrụ siri ike n’ime mmụọ, nke a na-eduzi nke ọma. Dị ka Pọl onyeozi, ndị Kraịst bụ́ ndị okenye n’oge a na-enwe oké nchegbu maka ndị kwere ekwe ibe ha. (2 Ndị Kọrint 11:28) Ibu ọrụ nke ịzụ ndị Chineke dị ka atụrụ dị arọ karịsịa n’oge ndị a dị oké egwu. Ya mere, anyị nwere obi ekele n’ezie maka ọrụ ọma nke ụmụnna anyị ndị na-eje ozi dị ka ndị okenye na-arụ. (1 Timoti 5:17) Maka ịgọzi anyị site ‘n’onyinye ndị dị ná mmadụ,’ bụ́ ndị na-azụ atụrụ site n’ọchịchọ obi, anyị na-eto Onye ahụ Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè,” bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị na-ahụ n’anya nke eluigwe, bụ́ Jehova.​—⁠Ndị Efesọs 4:8; Jemes 1:17.

Olee Ụzọ Ị Ga-esi Zaa?

◻ Olee ụzọ nwoke pụrụ isi chịa ezinụlọ ya nke ọma?

◻ Àgwà ndị dị aṅaa ka e kwesịrị iji mara nlekọta nke ndị Kraịst bụ́ ndị okenye?

◻ Olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi gosi ịdị umeala na ịdị nwayọọ mgbe a na-enye ndụmọdụ?

◻ Gịnị na-enye aka ime ka mgbanwe ime mmụọ dịrị irè?

◻ Olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi zere ọnọdụ ndị na-eweta nkọcha mgbe a na-azụ ìgwè atụrụ?

[Foto dị na peeji nke 18]

Onye Kraịst bụ́ okenye aghaghị ịchị ezinụlọ nke ya nke ọma

[Foto dị na peeji nke 21]

E kwesịrị ime ọzụzụ atụrụ ndị Kraịst site n’ịdị nwayọọ na mkpebi dị mma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya