Jehova Chineke nke Nzube
“N’ezie dị ka M cheworo, otú a ka ọ ga-adị; na dị ka M zubeworo, nke ahụ ga-eguzosi ike.”—AỊSAỊA 14:24.
1, 2. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-ekwu banyere nzube nke ndụ?
NDỊ mmadụ n’ebe nile na-ajụ, sị: “Gịnị bụ nzube nke ndụ?” Otu onye ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Ebe Ọdịda Anyanwụ kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ na-ajụ sị, ‘Ònye ka anyị bụ? Gịnị bụ nzube anyị?’” Mgbe otu akwụkwọ akụkọ jụrụ ndị ntorobịa ihe bụ echiche ha n’okwu banyere ihe bụ nzube nke ndụ, ụdị nzaghachi ndị e nyere bụ: “Ime ihe ọ bụla bụ ọchịchọ obi gị.” “Ibi ndụ n’ime oge ọ bụla ruo n’ókè kasị ukwuu.” “Ibi ndụ rie ṅụọ.” “Ịmụ ụmụ, inwe obi ụtọ, e mesịakwa ịnwụ.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ chere na ndụ nke a bụ nanị ndụ dịnụ. Ọ dịghị onye kwuru banyere nzube ogologo oge ọ bụla nke ndụ ọdịnihu n’elu ala.
2 Otu onye mmụta n’okpukpe Confucius kwuru, sị: “A na-achọta ihe bụ isi ndụ pụtara n’ime ịdị adị efu anyị dị ka ụmụ mmadụ.” N’echiche nke a, a ga-anọgide na-amụ ụmụ mmadụ, dọlịa ruo 70 ma ọ bụ 80 afọ, mgbe ahụ nwụọ ma ghara ịdịkwa adị ruo mgbe ebighị ebi. Otu onye mmụta sayensị evolushọn kwuru, sị: “Anyị pụrụ inwe agụụ maka azịza ‘ka elu’—ma ọ dịghị nke dị.” Nye ndị evolushọn ndị a, ndụ bụ ndọlị maka nlanarị, na ọnwụ dị ka njedebe ya nile. Ụdị nkà ihe ọmụma ndị a na-enye echiche olileanya na-adịghị ya banyere ndụ.
3, 4. Olee otú ọnọdụ ụwa si emetụta ụzọ ọtụtụ ndị si ele ndụ anya?
3 Ọtụtụ na-arụ ụka na ndụ nwere nzube mgbe ha hụrụ na ịdị adị ụmụ mmadụ ejupụtawo ná nhụjuanya dị ukwuu. N’ime oge anyị, mgbe mmadụ kwesịworo iru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu nke ihe nkà mmepụta na sayensị rụzuworo, ihe dị ka otu ijeri mmadụ gburugburu ụwa na-arịa ọrịa nke ukwuu ma ọ bụ ghara ịdị na-eri ihe ahụ chọrọ. Ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ kwa afọ site n’ihe ndị dị otú a. Ọzọkwa, narị afọ nke 20 nke a enwewo ndị nwụrụ site n’agha okpukpu anọ nke ngụkọta nke narị afọ anọ bu ụzọ. Mpụ, ime ihe ike, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ndakpọ ezinụlọ, ọrịa AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebufe site ná mmekọahụ—ndepụta nke ihe ndị na-adịghị mma na-arị elu. Ndị ndú ụwa enweghị ngwọta nye nsogbu ndị a.
4 N’ihi ọnọdụ ndị dị otú a, otu onye kwupụtara ihe ọtụtụ ndị kwere: “Ndụ enweghị nzube ọ bụla. Ọ bụrụ na ihe ọjọọ ndị a nile na-eme, mgbe ahụ ndụ enweghị oké ihe ọ pụtara.” Otu nwoke meworo agadi kwukwara, sị: “Anọwo m na-ajụ ihe mere m ji nọrọ n’ebe a n’oge dị ukwuu karị nke ndụ m. Ọ bụrụ na e nwere nzube, achọkwaghị m ịma ma ọlị.” Ya mere n’ihi na ọnụ ọgụgụ bara ụba amaghị ihe mere Chineke ji kwere ka nhụsianya dịrị, ọnọdụ ahụhụ nke ụwa na-eme ka ha ghara inwe ezi olileanya ọ bụla maka ọdịnihu.
5. N’ihi gịnị ka okpukpe nile nke ụwa nke a ji eme ka e nwewanye nghọtahie banyere nzube nke ndụ?
5 Ọbụna ndị ndú okpukpe kewara ekewa n’ihe bụ nzube nke ndụ, ha ejighịkwa ya n’aka. Onye bụbu onye isi nlekọta nke St. Paul’s Cathedral na London sịrị: “Eri ndụ m nile, emewo m mgbalị ịchọta nzube nke ịdị ndụ. . . . Adawo m.” N’eziokwu, ọtụtụ ndị ụkọchukwu na-akụzi na n’ọnwụ ndị ezi omume na-eje eluigwe ma ndị ajọ omume na-eje ọkụ hell ruo mgbe ebighị ebi. Ma echiche nke a ka na-ahapụ ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ụwa ịnọgide n’ụzọ ya nke mmekpa ahụ. Ọ bụrụkwa na ọ bụ nzube Chineke ime ka ụmụ mmadụ biri n’eluigwe, n’ihi gịnị ka ọ na-emeghị ha nnọọ ihe ndị e kere n’eluigwe na mbụ, dị ka o mere ndị mmụọ ozi, wee si otú a gbochiere ụmụ mmadụ oké nhụsianya nke a? Ya mere mgbagwoju anya banyere ihe bụ nzube nke ndụ n’elu ala ma ọ bụ ịjụ ikweta na o nwere nzube ọ bụla bụ ihe a na-ahụkarị.
Chineke nke Nzube
6, 7. Gịnị ka Bible na-agwa anyị banyere Ọkaaka Eluigwe na Ala?
6 Ma, akwụkwọ a kasị na-ekesa n’akụkọ ihe mere eme, bụ́ Bible Nsọ, na-agwa anyị na Jehova, Ọkaaka nke Eluigwe na Ala, bụ Chineke nke nzube. Ọ na-egosi anyị na e nwere nzube ogologo oge n’ọdịnihu, n’ezie, nke na-adịru ebighị ebi maka ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ala. Mgbe Jehova zubekwara ihe, ọ ghaghị iwere ọnọdụ. Dị nnọọ ka mmiri ozuzo na-eme ka mkpụrụ pulite, ka Chineke na-ekwu, “otú a ka okwu m dị nke na-esi n’ọnụ m pụta: ọ gaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.” (Aịsaịa 55:10, 11) Ihe ọ bụla Jehova kwuru na ya ga-emezu, “nke ahụ ga-eguzosi ike.”—Aịsaịa 14:24.
7 Anyị bụ́ mmadụ pụrụ inwe nchekwube zuru ezu na Onye Pụrụ Ime Ihe Nile gaemezu nkwa ya, n’ihi na Chineke ‘apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Taịtọs 1:2; Ndị Hibru 6:18) Mgbe ọ gwara anyị na ya ga-eme ihe, okwu ya bụ ihe e ji n’aka na ọ ga-emezu. Ọ bụ ihe meworo nnọọ. Ọ na-ekwupụta, sị: “Mụ onwe m bụ Chineke, ọ dịghịkwa Chineke ọzọ dị; abụ m Chineke, ọ dịghịkwa otù efu dị ka Mụ onwe m; na-egosi ikpeazụ site ná mbụ, na-egosikwa ihe nke a na-emeghị eme site na mgbe ochie; na-asị, Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme: . . . ekwuwo m, M ga-eme ka o mee; ezubewo m, M ga-emekwa ya.”—Aịsaịa 46:9-11.
8. Ọ̀ pụrụ ikwe omume ka ndị nile chọrọ ịmata Chineke n’ezie chọta ya?
8 Ọzọkwa, Jehova ‘ezubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) N’ihi nke a, ọ chọghị ka onye ọ bụla nọrọ n’ìsì banyere ya. Otu onye amụma aha ya bụ Azaraịa sịrị: “Ọ bụrụkwa na unu achọọ [Chineke], Ọ ga-emekwa ka unu chọta Ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ Ya, Ọ ga-ahapụkwa unu.” (2 Ihe Emere 15:1, 2) Ya mere, ndị ji obi eziokwu chọọ ịmata Chineke na nzube ya nile ga-eme otú ahụ kpọmkwem ma ọ bụru na ha emee mgbalị iji chọọ ya.
9, 10. (a) Ihe dị aṅaa ka e nyeworo ndị chọrọ ịmata Chineke? (b) Gịnị ka inyocha Okwu Chineke na-eme ka anyị nwee ike ime?
9 Olee ebe a ga-achọ ya? Nye ndị na-achọ Chineke n’ezie, o nyewo Okwu ya, bụ́ Bible. Site na mmụọ nsọ ya, otu ike ọrụ ahụ o ji kee eluigwe na ala, Chineke duziri ndị ikom kwesịrị ntụkwasị obi idetu ihe ndị dị anyị mkpa ịma banyere nzube ya nile. Dị ka ihe atụ, banyere amụma Bible, Pita onyeozi kwuru, sị: “Ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:21) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi kwupụtara, sị: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.”—2 Timoti 3:16, 17; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
10 Rịba ama na Okwu Chineke na-eme ka anyị bụrụ, ọ bụghị n’akụkụ ụfọdụ ma ọ bụ n’ụzọ na-ezughị okè, kama ‘ndị zuru okè, ndị e mere ka ha zuo okè.’ Ọ na-eme ka mmadụ jide n’aka onye Chineke bụ, ihe nzube ya nile bụ, na ihe ọ chọrọ n’aka ndị na-ejere ya ozi. Nke a bụ ihe a ga-atụ anya ya site n’akwụkwọ nke ọ bụ Chineke mere ka e dee. Ọ bụkwa isi iyi e nwere nanị ya nke anyị pụrụ ịchọ inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke site na ya. (Ilu 2:1-5; Jọn 17:3) Site n’ime otú ahụ, anyị ‘agaghị abụ ụmụ ọhụrụ ọzọ, ndị ifufe nile ọ bụla nke ozizi na-efegharị na-ebugharịkwa, n’ime ịtụ ntụ nke mmadụ, n’ime aghụghọ, nke ha ji ezupụta nduhie.’ (Ndị Efesọs 4:13, 14) Onye ọbụ abụ ahụ kwupụtara echiche ziri ezi: “Okwu Gị [Chineke] bụ oriọna dịịrị ụkwụ m, ọ bụkwa ìhè dịịrị okporo ụzọ m.”—Abụ Ọma 119:105.
E Ji Nwayọọ Nwayọọ Na-ekpughe Ha
11. Olee otú Jehova siworo kpughee nzube ya dị iche iche nye ihe a kpọrọ mmadụ?
11 Kpọmkwem ná mmalite nke ezinụlọ mmadụ, Jehova kpughere nzube ya n’ebe ụwa nke a na ụmụ mmadụ ndị nọ n’elu ya dị. (Jenesis 1:26-30) Ma mgbe nne na nna anyị mbụ jụrụ ọkaaka Chineke, ihe a kpọrọ mmadụ dabara n’ọchịchịrị ime mmụọ na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Ka o sina dị, Jehova matara na a gaje inwe ndị ga-achọ ife ya ofufe. Ya mere, eri ọtụtụ narị afọ, o jiriwo nwayọọ nwayọọ kpughee nzube ya nye ndị na-ejere ya ozi kwesịrị ntụkwasị obi. Ụfọdụ n’ime ndị o sooro nwee nkwurịta okwu bụ Enọk (Jenesis 5:24; Jud 14, 15), Noa (Jenesis 6:9, 13), Abraham (Jenesis 12:1-3), na Mosis (Ọpụpụ 31:18; 34:27, 28). Onye amụma Chineke bụ́ Emọs dere, sị: “Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe, ma ọ bụrụ na O kpugheghị izu nzuzo Ya nye ndị ohu Ya, bụ́ ndị amụma Ya.”—Emọs 3:7; Daniel 2:27, 28.
12. Olee otú Jisọs si nyekwuo ihe ọmụma ná nzube Chineke?
12 Mgbe Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, nọ n’elu ala n’ihe dị ka 4,000 afọ mgbe nnupụisi ahụ n’Iden gasịrị, e kpughekwuru ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke nzube Jehova. Nke a dị nnọọ otú ahụ karịsịa banyere nzube Chineke iguzobe Alaeze eluigwe ka ọ chịa ụwa. (Daniel 2:44) Jisọs mere Alaeze ahụ isiokwu nke nkụzi ya. (Matiu 4:17; 6:10) Ya na ndị na-eso ụzọ ya kụziri na n’okpuru Alaeze ahụ, a ga-emezu nzube mbụ nke Chineke maka ụwa na maka ihe a kpọrọ mmadụ. A ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs nke ụmụ mmadụ ndị zuru okè ga-ebi na ya, ndị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; Matiu 5:5; Luk 23:43; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:4) Ọzọkwa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gosipụtara ihe ga-ewere ọnọdụ n’ụwa ọhụrụ ahụ site n’ọrụ ebube ndị Chineke nyere ha ike ka ha rụọ.—Matiu 10:1, 8; 15:30, 31; Jọn 11:25-44.
13. Banyere otú Chineke si emeso ụmụ mmadụ ihe, mgbanwe dị aṅaa weere ọnọdụ na Pentikọst 33 O.A.?
13 Na Pentikọst 33 O.A., 50 ụbọchị mgbe mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, a wụsara ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ Kraịst mmụọ nsọ Chineke. Ọ nọchiri Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi dị ka ndị ha na Jehova gbara ndụ. (Matiu 21:43; 27:51; Ọrụ 2:1-4) Mwụpụ nke mmụọ nsọ n’oge ahụ bụ ihe àmà na, site n’oge ahụ gaa n’ihu, Chineke ga-ekpughe eziokwu dị iche iche banyere nzube ya dị iche iche site ná ngwá ọrụ ọhụrụ nke a. (Ndị Efesọs 3:10) N’ime narị afọ mbụ O.A., e guzobere ntọala nke ọgbakọ ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 12:27-31; Ndị Efesọs 4:11, 12.
14. Olee otú ndị na-achọ eziokwu ga-esi mata ezi ọgbakọ ndị Kraịst?
14 Taa, ndị na-achọ eziokwu pụrụ ịmata ezi ọgbakọ ndị Kraịst ahụ site ná ngosipụta ya na-adịghị agbanwe agbanwe nke àgwà bụ isi nke Chineke, ịhụnanya. (1 Jọn 4:8, 16) N’ezie, ịhụnanya ụmụnna bụ otu akara e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” “Nke a bụ ihe M nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka M hụrụ unu n’anya.” (Jọn 13:35; 15:12) Jisọs chetakwaara ndị na-ege ya ntị, sị: “Unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe Mụ onwe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:14) Ya mere ezi ndị na-ejere Chineke ozi bụ ndị na-egosipụta iwu ahụ nke ịhụnanya. Ha adịghị ekwu ya nanị n’ọnụ, n’ihi na “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya.”—Jemes 2:26.
Nghọta
15. Banyere gịnị ka ndị na-ejere Chineke ozi pụrụ inwe obi ike?
15 Jisọs buru amụma na ka oge na-aga, a ga-enyekwu ezi ọgbakọ ndị Kraịst nghọta na-amụba amụba banyere nzube Chineke. O kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa, sị: “Onye nkasi obi ahụ, bụ́ Mmụọ Nsọ, Onye Nna m ga-ezite n’aha m, Onye ahụ ga-ezi unu ihe nile.” (Jọn 14:26) Jisọs kwukwara, sị: “Lee, Mụ onwe m nọnyeere unu ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:20) Otú a, nghọta banyere eziokwu nke Chineke na nzube ya dị iche iche na-amụba n’etiti ndị ohu Chineke. Ee, “okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.”—Ilu 4:18.
16. Gịnị ka nghọta anyị nke ime mmụọ na-agwa anyị banyere ebe anyị nọ n’ihe banyere nzube Chineke?
16 Taa, ìhè ime mmụọ ahụ na-achasi ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ, n’ihi na anyị nọ n’oge mgbe ọtụtụ n’ime amụma dị iche iche nke Bible na-emezu ma ọ bụ na-eru nso mmezu. Ihe ndị a na-egosi anyị na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe ọjọọ nke a. Nke a bụ oge a kpọrọ “ọgwụgwụ oge a”; ụwa ọhụrụ Chineke ga-esochi ya. (2 Timoti 3:1-5, 13; Matiu 24:3-13) Dị ka Daniel buru n’amụma, n’isi nso Alaeze eluigwe Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Daniel 2:44.
17, 18. Amụma ndị dị aṅaa dị ebube na-enwe mmezu ugbu a?
17 Otu n’ime amụma ndị na-emezu ugbu a bụ nke e dekọrọ n’amaokwu nke 14 nke Matiu isi 24. N’ebe ahụ Jisọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” N’ụwa nile, a na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ site n’aka ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ narị puku mmadụ na-esonyekwara ha kwa afọ. Nke a kwenyekọrọ n’amụma ahụ dị n’Aịsaịa 2:2, 3, nke na-asị na “n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a” nke ụwa ọjọọ nke a, mmadụ ndị sitere n’ọtụtụ mba dị iche iche ga-abịa n’ezi ofufe nke Jehova, ‘ọ ga-ezikwa ha ụzọ ya ụfọdụ, ha ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.’
18 Ndị ọhụrụ ndị a na-enubata n’ofufe Jehova n’ìgwè “dị ka igwe ojii,” dị ka e buru ya n’amụma n’Aịsaịa isi 60, amaokwu nke 8. Amaokwu nke 22 na-agbakwụnye, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” Oge ahụ, dị ka ihe àmà na-egosi, bụ ugbu a. Ndị ọhụrụ pụkwara ijide n’aka na site n’isoro Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta, ha esonyeworo ezi ọgbakọ ndị Kraịst ahụ.
19. Gịnị mere anyị ji kwuo na ndị ọhụrụ naesonyere Ndịàmà Jehova na-abịa n’ezi ọgbakọ ndị Kraịst?
19 N’ihi gịnị ka anyi pụrụ iji kwuo nke a dị ka ihe e ji n’aka? N’ihi na ndị ọhụrụ ndị a, tinyere ọtụtụ nde ndị nọwororịị n’ime nzukọ Jehova, ararawo ndụ ha nye Chineke, na-emekwa uche ya. Nke a gụnyere ibi ndụ kwekọrọ n’iwu nke ịhụnanya Chineke. Dị ka otu ihe àmà nke a, ndị Kraịst ndị a ‘akpụgharịwo mmà agha ha nile ka ha bụrụ mmà ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mmà ịkwa osisi, ha adịghịkwa amụta agha ọzọ.’ (Aịsaịa 2:4) Ndịàmà Jehova nile gburugburu ụwa emewo nke a n’ihi na ha na-ahụ n’anya. Nke a pụtara na ha apụghị iweli ngwá agha ọ bụla megide onwe ha ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ. Ha pụrụ iche na nke a—n’adịghị ka okpukpe nile nke ụwa. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 3:10-12, 15) Ha adịghị etinye aka n’ịhụ mba n’anya nke na-akpata nkewa, n’ihi na ha bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke e jiri ịhụnanya jikọta, bụ́ “ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:14; Matiu 23:8; 1 Jọn 4:20, 21.
Ihe Ka n’Ọnụ Ọgụgụ Họọrọ Ịhapụ Ịmara
20, 21. N’ihi gịnị ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ihe a kpọrọ mmadụ ji nọrọ n’ọchịchịrị ime mmụọ? (2 Ndị Kọrint 4:4; 1 Jọn 5:19)
20 Ka ìhè ime mmụọ nke dị n’etiti ndị na-ejere Chineke ozi na-achasiwanye ike, ihe fọdụrụ n’ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa na-agbada n’ime ọchịchịrị ime mmụọ dị ukwuu karị. Ha amaghị Jehova ma ọ bụ nzube ya nile. Onye amụma Chineke kọwara oge a mgbe o kwuru, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche.” (Aịsaịa 60:2) Nke a bụ n’ihi na ndị mmadụ adịghị egosipụta mmasị si n’ezi obi ịmụta ihe banyere Chineke, ha adịghịkwa egosi ọchịchọ nke ịgbalị ime ihe dị ya ụtọ. Jisọs kwuru, sị: “Ma nke a bụ ikpe ahụ, na Ìhè ahụ abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama Ìhè ahụ; n’ihi na ọrụ ha jọrọ njọ. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ Ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa Ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya.”—Jọn 3:19, 20.
21 Mmadụ ndị dị otú ahụ enweghị ezigbo mmasị ịchọpụta ihe bụ uche Chineke. Kama, ndụ ha na-adabere n’ime ihe bụ uche nke aka ha. N’ihi ileghara nzube Chineke anya, ha na-edebe onwe ha n’ọnọdụ dị ize ndụ, n’ihi na Okwu ya na-ekwu, sị: “Onye na-ewezụga ntị ya n’ịnụ iwu, ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.” (Ilu 28:9) Ha ga-eburu ihe si n’ụzọ ha họrọwooro pụta. Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”—Ndị Galetia 6:7.
22. Ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị chọrọ ịmata Chineke na-eme gịnị ugbu a?
22 Otú ọ dị, e nwere ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị chọrọ ịmata uche Chineke, ndị ji obi eziokwu na-achọ ya, ndị a na-adọtakwa n’ebe ọ nọ. “Bịaruonụ Chineke nso, Ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka Jemes 4:8 na-asị. Banyere ndị dị otú ahụ Jisọs na-asị: “Onye na-eme ihe bụ eziokwu na-abịakwute Ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.” (Jọn 3:21) Leekwa ụdị ọdịnihu dị ebube Chineke zubeworo maka ndị bịakwutere ìhè ahụ! Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle olileanya ahụ na-akpali akpali.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ka ọtụtụ ndị na-ekwu banyere nzube nke ndụ?
◻ Olee otú Jehova si ekpughe onwe ya dị ka Chineke nke nzube?
◻ Oké nghọta dị aṅaa weere ọnọdụ na narị afọ mbụ O.A.?
◻ Olee otú a pụrụ isi mata ezi ọgbakọ ndị Kraịst taa?