Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • od isi 8 p. 71-86
  • Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
  • Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ NKWUSA ỌHỤRỤ
  • IHE E JI AMA NA MMADỤ ERUOLA ỊBỤ ONYE NKWUSA
  • INYERE ỤMỤAKA AKA
  • MMADỤ INYEFE CHINEKE ONWE YA NA IME BAPTIZIM
  • AKỤKỌ GBASARA OTÚ OZI ANYỊ SI AGA N’ỤWA NIILE
  • AKỤKỌ OZI GỊ
  • KAADỊ ONYE NKWUSA
  • IHE MERE ANYỊ JI ENYE AKỤKỌ OZI ANYỊ
  • IKPEBI OTÚ Ị GA-ESI EJEKWU OZI
  • Nlekọta Dị Nro Dị Atụrụ Jehova Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Na-efe Ofufe Dị Nsọ Ehihie na Abalị
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Na-anụ Ọkụ n’Obi Maka Ezi Ihe!
    Ozi Alaeze Anyi—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
od isi 8 p. 71-86

ISI NKE 8

Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma

JEHOVA nyere anyị Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst ka anyị na-eṅomi ya. (1 Pita 2:21) Mgbe mmadụ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, onye ahụ ga na-ekwusa ozi ọma n’ihi na ọ bụzi onye ozi Chineke. Jizọs kwuru na onye na-eso ụzọ ya ga na-enwe obi ụtọ. O kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi, mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.” (Mat. 11:​28, 29) Onye ọ bụla bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs ma na ihe a Jizọs kwuru bụ eziokwu.

2 Jizọs bụ Onyeisi Ndị Ozi Chineke. Ọ bụ ya mere o ji kpọọ ndị mmadụ ka ha bịa bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 9:9; Jọn 1:43) Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi ekwusa ozi ọma ma zipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma otú o si eme. (Mat. 10:1–11:1; 20:28; Luk 4:43) O mechakwara zipụ ndị na-eso ụzọ ya dị iri asaa ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. (Luk 10:​1, 8-11) Mgbe ọ na-ezipụ ha, ọ gwara ha, sị: “Onye na-ege unu ntị na-egekwa m ntị. Onye na-eleda unu anya na-eledakwa mụ onwe m anya. Ọzọkwa, onye na-eleda m anya na-eledakwa onye ahụ nke zitere m anya.” (Luk 10:16) Jizọs ji ihe a o kwuru mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta na ha kwesịrị iji ozi ọma kpọrọ ihe. Ha ga-anọchite anya Jizọs na Chineke, bụ́ Onye Kasị Ihe Niile Elu. N’oge anyị a, ndị niile ga-aza òkù Jizọs na-akpọ ka ‘a bịa bụrụ ndị na-eso ụzọ ya’ ga-anọchitekwa anya ya na Chineke. (Luk 18:22; 2 Kọr. 2:17) Ha ga na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-enyere ndị mmadụ aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.​—Mat. 24:14; 28:​19, 20.

3 Ebe ọ bụ na anyị aghọọla ndị na-eso ụzọ Jizọs, Jehova Chineke emeela ka anyị ‘mata’ ya na Jizọs Kraịst nke ọma. (Jọn 17:3) A kụzierela anyị ọtụtụ ihe gbasara Jehova. Jehova enyekwarala anyị aka ime ka uche anyị dị ọhụrụ, ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ ma na-akpa àgwà otú ọ chọrọ. (Rom 12:​1, 2; Efe. 4:​22-24; Kọl. 3:​9, 10) Ihe ndị a o meere anyị mere ka anyị jiri obi anyị niile nyefee ya onwe anyị, e meekwa anyị baptizim. Si mgbe ahụ gawa, anyị ghọrọ ndị ozi Chineke.

4 O nwere ihe anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-ejere Chineke ozi. Ihe ahụ bụ na anyị kwesịrị ịkwụwa aka anyị ọtọ ma mee ka obi anyị dị ọcha. (Ọma 24:​3, 4; Aịza. 52:11; 2 Kọr. 6:14–7:1) Akọnuche anyị adịla ọcha n’ihi na anyị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst. (Hib. 10:​19-23, 35, 36; Mkpu. 7:​9, 10, 14) Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto ka ndị ọzọ ghara ịsụ ngọngọ. Pita onyeozi kwukwara na ọ bụrụ na Ndị Kraịst ana-akpa àgwà ọma, o nwere ike ime ka ndị na-anaghị efe Chineke fewe ya. (1 Kọr. 10:​31, 33; 1 Pita 3:1) Olee otú i nwere ike isi nyere mmadụ aka ka ọ ghọọ onye nkwusa?

NDỊ NKWUSA ỌHỤRỤ

5 Gị na mmadụ malite ịmụ Baịbụl, gwa onye ahụ ka ọ na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. O nwere ike ịkọrọ ndị ikwu ya, ndị enyi ya, ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ọzọ ihe ọ na-amụta na Baịbụl. Nke a bụ otu ụzọ anyị nwere ike isi kụziere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ma na-ekwusa ozi ọma. (Mat. 9:9; Luk 6:40) Ka onye ahụ ị na-amụrụ Baịbụl na-emekwu nke ọma n’ọgbakọ ma na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọ na-amụta, ọ ga-ekwu na ya chọrọ iso ọgbakọ na-aga ozi ọma.

IHE E JI AMA NA MMADỤ ERUOLA ỊBỤ ONYE NKWUSA

6 Tupu gị na onye ị na-amụrụ Baịbụl esoro gaa ozi ọma, o nwere ihe ụfọdụ e kwesịrị ịchọpụta gbasara ya. Ihe mere o ji dị otú ahụ bụ na ọ bụrụ na mmadụ esoro anyị gaa ozi ọma, onye hụrụ ya ga-asị na ọ bụ Onyeàmà Jehova. N’ihi ya, ọ ga-abụ onye ndị mmadụ ma na ọ na-akpa àgwà otú Jehova chọrọ, nakwa na ọ ga-abụli onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

7 Ka gị na mmadụ na-amụ Baịbụl, gị ana-akụziri ya ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme, ọ ga-abụ na ị matala ihe ụfọdụ banyere onye ahụ. O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ọ na-eme ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. Ma, e nwere ihe ụfọdụ gbasara ya ndị okenye ga-achọ ka unu na ha kwurịta.

8 Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ga-agwa ndị okenye abụọ ka ha soro unu kwurịta ihe ndị ahụ. Otu n’ime ndị okenye ahụ ga-abụ onye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ. N’ọgbakọ e nwere ndị okenye ole na ole, e nwere ike ịgwa ohu na-eje ozi ruru eru ka ya na otu okenye soro leba ihe ndị ahụ anya. Ụmụnna ndị a gwara ka ha leba ya anya kwesịrị ime ya ozugbo. Ọ bụrụ na ọ bụ n’ọmụmụ ihe ka a gwara ha hụ gị na onye ahụ ị na-amụrụ ihe, ha nwere ike ịhụ unu ma a gbasaa. Unu niile nọkọọ, ha kwesịrị ime ka ahụ́ ruo onye ahụ ị na-amụrụ ihe ala. Tupu onye a na-amụrụ Baịbụl abụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, a ga-ejide n’aka na:

  1. (1) O kwetara na e si n’ike mmụọ nsọ dee Okwu Chineke bụ́ Baịbụl.​—2 Tim. 3:16.

  2. (2) Ọ ma ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi, kwerekwa na ha bụ eziokwu. Ọ bụrụkwa na mmadụ ajụọ ya ajụjụ banyere ihe ndị ahụ, ọ ga-ejili Baịbụl zaa ya, kama ikwuwe ihe o chere ma ọ bụ ihe na-abụghị eziokwu a kụziiri ya na chọọchị.​—Mat. 7:​21-23; 2 Tim. 2:15.

  3. (3) Ọ na-agachi ọmụmụ ihe anya otú Baịbụl kwuru ma ọ bụrụ na ahụ́ dị ya.​—Ọma 122:1; Hib. 10:​24, 25.

  4. (4) Ọ ma ihe Baịbụl kwuru gbasara ịkwa iko, di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, nwoke ịlụ ihe karịrị otu nwaanyị, na nwoke idina nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị ibe ya. Aka ya adịghịkwa na nke ọ bụla n’ime ihe ndị a. Ọ bụrụ na ya na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya bi, ya abụrụkwa na onye ahụ abụghị onye ikwu ya, ha kwesịrị ịlụ otú iwu kwuru.​—Mat. 19:9; 1 Kọr. 6:​9, 10; 1 Tim. 3:​2, 12; Hib. 13:4.

  5. (5) Ọ naghị aṅụbiga mmanya ókè, ọ naghịkwa aṅụ ọgwụ ike ma ọ bụ ọgwụ ndị na-akpaghasị uche.​—2 Kọr. 7:1; Efe. 5:18; 1 Pita 4:​3, 4.

  6. (6) Ya na ndị na-akpa àgwà ọjọọ anaghị akpa. ​—1 Kọr. 15:33.

  7. (7) O meela ka ndị chọọchị ya mbụ mara na o nweghịzi ihe jikọrọ ya na ha. Ọ naghịzi aga chọọchị ahụ ma ọ bụ soro ha na-eme ihe ọ bụla ha na-eme.​—2 Kọr. 6:​14-18; Mkpu. 18:4.

  8. (8) Ọ naghị etinye aka n’ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.​—Jọn 6:15; 15:19; Jems 1:27.

  9. (9) O kwetara na ihe e kwuru n’Aịzaya 2:4 bụ eziokwu, na-emekwa ya eme.

  10. (10) O ji obi ya niile chọọ ịbụ Onyeàmà Jehova.​—Ọma 110:3.

9 Ọ bụrụ na o nwere nke ọ bụla n’ime ihe ndị a ndị okenye na-amachaghị ihe onye ahụ chere banyere ya, ha nwere ike ịgụ amaokwu Baịbụl ndị ahụ ma jiri ha jụọ ya ajụjụ. E kwesịrị ime ka ọ ghọta na onye ọ bụla na-eso Ndịàmà Jehova ekwusa ozi ọma kwesịrị ịna-eme ihe amaokwu Baịbụl ndị e depụtara ebe a kwuru. Ihe ọ bụla o kwuru ga-enyere ndị okenye aka ịma ma ọ̀ ma ihe o kwesịrị ime nakwa ma ò ruru eru ịgawa ozi ọma.

10 Ndị okenye ekwesịghị igbu oge ịgwa ya ma ò ruru eru ịgawa ozi ọma ma ọ bụ na o rughị. Ọ na-abụkarị mgbe ha chọrọ imechi nnọkọ ahụ ka ha na-agwa ya onye ahụ. Ọ bụrụ na o ruru eru, ndị okenye ga-eji obi ụtọ gwa ya na o ruru eru ịbụ onye nkwusa. (Rom 15:7) Ha ga-agwa ya ka o bido gawa ozi ọma nakwa ka o nye akụkọ ozi ya ma ọnwa gwụ. Ha nwekwara ike ịgwa ya na ọ bụrụ na onye a na-amụrụ Baịbụl abụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma nye akụkọ ozi ya nke mbụ ma ọnwa gwụ, a na-emepere ya kaadị a na-akpọ Kaadị Onye Nkwusa ma tinye ya na faịlụ ọgbakọ. Ndị okenye na-anata onye nkwusa ihe ndị a ga-ede na kaadị ahụ ka nzukọ Jehova nwee ike iji ha na-arụ ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa niile nakwa ka onye nkwusa nwee ike iso ọgbakọ na-eme ihe gbasara ofufe Chineke, ndị okenye ana-agbakwa ya ume. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ga-eme ka obi sie onye nkwusa ahụ ike na ha ga-eji ihe ọ bụla ọ gwara ha banyere onwe ya eme ihe otú Iwu Zuru Ụwa Ọnụ Ndịàmà Jehova Na-eso ma A Bịa n’Ihe Mmadụ Gwara Ha Gbasara Onwe Ya, nke dị na jw.org kwuru.

11 Ọ bụrụ na anyị amata onye nkwusa ọhụrụ nke ọma ma na-aja ya mma maka mbọ ọ na-agba n’ozi ya, ọ ga-enyere ya ezigbo aka. O nwere ike ime ka ọ gbakwuo mbọ na-ejere Jehova ozi ma na-enye akụkọ ozi ya mgbe niile.​—Fil. 2:4; Hib. 13:2.

12 Ndị okenye kpebihaala na onye a na-amụrụ Baịbụl ruru eru ịgawa ozi ọma, ha ga-enye ya akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. O nye akụkọ ozi mbụ ya, a ga-amara ọgbakọ ọkwa na ọ ghọọla onye nkwusa a na-emebeghị baptizim.

INYERE ỤMỤAKA AKA

13 Ụmụaka nwekwara ike ịbụ ndị nkwusa. A kpọtaara Jizọs ụmụaka, ya agọzie ha. (Mat. 19:​13-15; 21:​15, 16) Ọ bụ eziokwu na ọ bụ nne na nna kwesịrị ịna-akpọ ụmụ ha aga ozi ọma, ụmụnna ndị ọzọ nwekwara ike inyere ụmụaka ndị a aka ma ọ bụrụ na ha ji obi ha niile chọọ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, otú i si jiri ozi ọma kpọrọ ihe ga-enyere ụmụ gị aka iji ya kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na nwatakịrị nke na-akpa àgwà ọma ejiri obi ya niile kwuo na ya chọrọ ịbụ onye nkwusa, olee ihe e nwere ike ime?

14 Ọ ga-adị mma ka nne ya ma ọ bụ nna ya gwa ya otu n’ime ndị okenye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ka ha kwurịta ma nwa ahụ ò ruru eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ha kwurịtachaa ya, nne ma ọ bụ nna ahụ echee na nwa ya ruru eru, okenye ahụ ga-agwa ya onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ ga-agwa ndị okenye abụọ ka ha na nwa ahụ na nne ya ma ọ bụ nna ya ma ọ bụ ha abụọ ma ọ bụkwanụ onye na-azụ ya nọkọọ. Otu n’ime ndị okenye ahụ ga-abụ onye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ. Ọ bụrụ na nwa ahụ amụtala ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi ma kwuo na ọ chọrọ ịgawa ozi ọma, ọ na-egosi na ọ na-eme nke ọma. Ndị okenye abụọ ahụ tụlechaa ihe ndị a na ihe ndị ọzọ ahụ a na-achọpụtakwa gbasara ndị torola eto, ha ga-ekpebi ma nwa ahụ ò ruru eru ịbụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. (Luk 6:45; Rom 10:10) Ọ gaghị adị mkpa ka ha na ya kwurịtawa ihe ụfọdụ gbasara naanị ndị torola eto ma ọ bụ ihe ndị o doro anya na ọ gbasaghị nwatakịrị.

15 Ndị okenye ahụ kwesịrị ịja nwa ahụ mma maka otú o si eme nke ọma ma gbaa ya ume ka ọ gbaa mbọ ruo eruo ime baptizim. E kwesịkwara ịja nne na nna ya mma n’ihi na ha gbara mbọ kụziere ya Okwu Chineke. Ndị okenye ahụ kwesịrị ịgwa nne na nna ya ka ha gụọ isiokwu bụ́ “Ihe A Chọrọ Ka Ndị Nne na Nna Bụ́ Ndị Kraịst Mee.” Ọ dị na peeji nke 179 ruo 181 n’akwụkwọ a. Isiokwu a ga-enyere nne na nna nwa ahụ aka ịma otú ha ga-esi na-enyere ya aka.

MMADỤ INYEFE CHINEKE ONWE YA NA IME BAPTIZIM

16 Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Jehova chọrọ ma na-aga ozi ọma n’ihi na ị mụtala banyere Jehova, hụkwa ya n’anya, i kwesịrị ime ka adịm ná mma gị na ya sikwuo ike. Ma, olee otú ị ga-esi eme ya? Ọ bụ inyefe ya onwe gị na ime baptizim.​—Mat. 28:​19, 20.

17 I nyefee Chineke onwe gị, o gosiri na i wepụtala onwe gị ijere ya ozi dị nsọ. Olee otú ị ga-esi nyefee Chineke onwe gị? Ọ bụ ịgwa ya n’ekpere na malite mgbe ahụ gawa, na ị ga-eji ndụ gị jeere ya ozi ma na-eme uche ya. Ọ pụtara na ị ga na-efe naanị ya ruo mgbe ebighị ebi. (Diut. 5:9) Ọ bụ naanị gị ga-eme ya. O nweghị onye ga-emechitere gị ya.

18 Ma, ihe ị ga-eme abụghị naanị ịgwa Jehova na ị chọrọ ịbụ nke ya. I kwesịrị ime ka ndị ọzọ mara na i nyefeela Chineke onwe gị. Otú ị ga-esi eme ya bụ ime baptizim otú ahụ Jizọs mere. (1 Pita 2:21; 3:21) Ọ bụrụ na i kpebiela ijere Jehova ozi ma chọọ ka e mee gị baptizim, gịnị ka i kwesịrị ime? I kwesịrị ịgwa ya onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ unu. Ọ ga-agwa ndị okenye ole na ole ka gị na ha nọkọọ ka ha mara ma ì ruru eru ime baptizim. Ị chọọ ịmatakwu ihe ị ga-eme, biko gụọ isiokwu bụ́ “Ihe A Chọrọ Ka Onye Nkwusa A Na-emebeghị Baptizim Mee.” Ọ dị na peeji nke 182 ruo 184 n’akwụkwọ a. Gụọkwa isiokwu bụ́ “Ajụjụ A Ga-ajụ Ndị Chọrọ Ime Baptizim.” Ọ dị na peeji nke 185 ruo 207 n’akwụkwọ a.

AKỤKỌ GBASARA OTÚ OZI ANYỊ SI AGA N’ỤWA NIILE

19 Kemgbe ụwa, akụkọ ndị na-efe Chineke na-anụ gbasara otú ozi Jehova si aga n’ihu n’ihu n’ụwa niile na-agba ha ume. Malite mgbe ahụ Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile, ezigbo Ndị Kraịst na-achọsi ike ịma otú ha ga-esi eme ya.​—Mat. 28:​19, 20; Mak 13:10; Ọrụ 1:8.

20 Ndị mbụ soro ụzọ Jizọs kọrọ otú ozi ọma ha ziri ebe dị iche iche si gaa nke ọma. Akụkọ a gbakwara ha niile ume. (Mak 6:30) Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na Chineke wụkwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs zukọtara otu ebe mmụọ nsọ ya na Pentikọst afọ 33. Ha dị ihe dị ka otu narị mmadụ na iri abụọ. Obere oge ihe a mechara, ha ruru ihe dị ka puku atọ, mechaakwa ruo ihe dị ka puku ise. A kọrọ na “Jehova nọkwa na-atụkwasịrị ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta” nakwa na “oké ìgwè ndị nchụàjà malitekwara irube isi n’okwukwe Ndị Kraịst.” (Ọrụ 1:15; 2:​5-11, 41, 47; 4:4; 6:7) O doro anya na akụkọ ozi ndị a gbara ndị na-eso ụzọ Jizọs ume. O dokwara anya na o mere ka ha na-ekwusasi ozi ọma ike n’agbanyeghị nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ ndị ndú okpukpe ndị Juu na-enye ha.

21 N’agbata afọ 60 na afọ 61, Pọl kọọrọ ndị Kọlọsi n’akwụkwọ ozi o degaara ha na ozi ọma “na-amị mkpụrụ ma na-amụba n’ụwa niile” nakwa na ‘e kwusaala ya n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.’ (Kọl. 1:​5, 6, 23) Ndị mbụ soro ụzọ Kraịst mere ihe Okwu Chineke kwuru, mmụọ nsọ nyekwaara ha aka ha ezie ozi ọma n’ọtụtụ ebe n’ụwa tupu e bibie obodo ndị Juu n’afọ 70. N’eziokwu, akụkọ gbasara otú ozi ọma si aga n’ọtụtụ ebe n’ụwa gbara ndị na-eso ụzọ Kraịst ume n’oge ahụ.

Ị̀ na-agbalị ike gị ịhụ na e kwusara ozi ọma nke ọma tupu Chineke ebibie ụwa ọjọọ a?

22 Otú ahụ ka ọ dịkwa ndị Jehova taa. Ha na-enwe ebe ha na-edekọ otú ozi ọma ha na-ezi si aga n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ozi ọma a na-emezu ihe Jizọs kwuru na Matiu 24:14. Ebe ahụ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” Anyị niile nyeferela Chineke onwe anyị kwesịrị ịghọta na a chọrọ ka e kwusaa ozi ọma a ngwa ngwa. Anyị kwesịkwara ịhụ na e kwusara ya nke ọma tupu Chineke ebibie ụwa ọjọọ a. Jehova ga-ahụ na e kwusara ozi ọma a otú ọ chọrọ. Ọ bụrụ na anyị esoro kwusaa ya, Jehova ga-agọzi anyị.​—Ezik. 3:​18-21.

AKỤKỌ OZI GỊ

23 Gịnị na gịnị ka anyị ga-ede n’akụkọ ozi anyị? Ihe ndị a chọrọ ka anyị dee dị n’akwụkwọ anyị ji enye akụkọ ozi. Ma, ihe ndị anyị na-aga ịkpọ aha ugbu a nwere ike inyere gị aka ịma ihe ndị ị ga-ede nakwa ebe ị ga-ede ha.

24 N’akwụkwọ ahụ anyị ji enye akụkọ ozi, ị ga-ahụ ebe e dere “Ihe E Nyefere (n’Ụdị Ya Ọ Bụla),” dee akwụkwọ ole na vidio ole i si n’Ịntanet ma ọ bụ n’ekwentị zigara ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova ma ọ bụkwanụ ndị i ji aka gị nye ha. N’ebe e dere “Ugboro Ole E Gosiri Vidio,” dee ugboro ole i gosiri mmadụ otu n’ime vidio anyị.

25 Ihe ị ga-ede n’ebe e dere “Nletaghachi” bụ ugboro ole ị gaghachiri na nke onye i ziri ozi ọma kụzikwuoro ya ihe. Ọ bụrụ na nwanna ejiri ekwentị ma ọ bụ akwụkwọ ozi kụzikwuoro mmadụ Baịbụl, o nwere ike ịgụrụ nletaghachi. Ọ bụrụkwa na o si n’ekwentị ma ọ bụ n’iimel zigara mmadụ ozi iji kụzikwuoro ya Baịbụl, ma ọ bụ gaghachi na nke mmadụ wegara ya akwụkwọ anyị, o nwekwara ike ịgụrụ nletaghachi. Mgbe ọ bụla nwanna duziiri mmadụ Baịbụl, o nwere ike ịgụrụ nletaghachi. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna eduzie Ofufe Ezinụlọ mgbe nwa ya na-emebeghị baptizim nọ ya, ọ ga-agụrụ otu nletaghachi n’izu ahụ o duziri ya.

26 Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike ịmụrụ mmadụ ihe ọtụtụ ugboro n’ọnwa, ọ bụ naanị otu ọmụmụ Baịbụl ka anyị na-agụrụ n’isi onye ahụ kwa ọnwa. Ọnwa gwụ, onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ide mmadụ ole ọ mụụrụ ihe n’ọnwa ahụ. Ndị anyị ga-agụrụ ọmụmụ Baịbụl n’isi ha bụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova anyị na-amụrụ Baịbụl nakwa ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ọ bụrụ na otu n’ime ndị so na kọmitii ije ozi ọgbakọ agwa anyị ka anyị na-eduziri nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị kwụsịrịla ije ozi ọma ihe, anyị nwere ike ịgụrụ ọmụmụ Baịbụl n’isi ya n’ọnwa ọ bụla anyị mụụrụ ya ihe. Anyị nwekwara ike ịgụrụ ọmụmụ Baịbụl n’isi onye ọhụrụ e mere baptizim na-amụchabeghị akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? na akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.

27 Anyị kwesịrị ịna-ede naanị awa ole anyị rụtara. Anyị ga-ede ya n’ebe e dere “Awa.” O kwesịrị ịbụ awa ole i ji gaa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ, gaa nletaghachi, duzie ọmụmụ Baịbụl, ma ọ bụ zie mmadụ ozi ọma mgbe ị nọ n’ozi ma ọ bụ mgbe ị na-anọghị n’ozi. Ọ bụrụ na ụmụnna abụọ esoro gaa ozi ọma, ha abụọ ga-agụrụ awa. Ma, ọ bụrụ na ha gaara mmadụ nletaghachi ma ọ bụ mụọrọ mmadụ ihe, ọ bụ onye nwe nletaghachi ahụ ma ọ bụ ọmụmụ Baịbụl ahụ ga-agụrụ nletaghachi ma ọ bụ ọmụmụ Baịbụl. N’izu ọ bụla nne na nna gbakọrọ aka kụziere ụmụ ha ihe n’Ofufe Ezinụlọ, ha abụọ nwere ike ịgụrụ otu awa otu awa n’izu ahụ. Ụmụnna ndị na-ekwu okwu ihu ọha nwekwara ike ịgụrụ oge ha ji kwuo okwu ihu ọha. Ọ bụrụkwa na nwanna na-asụgharị okwu ihu ọha mgbe a na-ekwu ya, o nwere ike ịgụrụ oge o ji sụgharịa ya. Ma, anyị anaghị agụ oge anyị ji ejikere ịga ozi ọma, oge anyị ji nwee nzukọ ozi ubi, na oge anyị ji jee ozi ndị ọzọ na-agbasaghị ozi ọma.

28 Ọ bụ onye nkwusa ọ bụla ga-eji aka ya kpebie awa ole o ji zie ozi ọma. Ụfọdụ ndị nkwusa na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ bijuru ebiju. Ma, ndị ọzọ na-ezi ozi ọma n’ebe mmadụ ole na ole bi. Ọ na-ewekwa ha oge iru n’ebe ndị ahụ. Ókèala niile abụghị otu. Otú otu onye nkwusa si agụ oge o ji zie ozi ọma nwekwara ike ịdị iche n’otú ibe ya si agụ. E nweghị ọgbakọ ọ bụla Òtù Na-achị Isi gwara otú a ga-esi na-agụrụ awa e ji jee ozi ọma, e nwebeghịkwa onye ha gwara ka ọ na-ekpebiri ụmụnna otú ha ga-esi na-agụ awa ole ha ji gaa ozi ọma.​—Mat. 6:1; 7:1; 1 Tim. 1:5.

29 Ọ bụ naanị awa ole e ji jee ozi ọma ka e kwesịrị inye n’akụkọ ozi, ọ bụghị nkeji ole ọ bụla na-erughị otu awa. Naanị ndị nwere ike inye ihe na-erughị otu awa n’akụkọ ozi bụ ndị merela ezigbo agadi, ndị ọrịa na-ekweghị pụta èzí, ndị nọ ebe a na-elekọta ndị ahụ́ na-esighị ike, ma ọ bụ ndị na-anọzi otu ebe n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ. Ụdị onye nkwusa a nwere ike inye nkeji iri na ise, nkeji iri atọ, ma ọ bụkwanụ nkeji iri anọ na ise n’ọnwa. A ga-agụnye ya ná ndị nkwusa na-ejechi ozi anya. Ọ bụrụkwa na onye nkwusa emerụọ ezigbo ahụ́ ma ọ bụ rịa ọrịa nke na o nweghị ike ịpụta èzí ruo otu ọnwa ma ọ bụ karịa, o nwekwara ike inye otu n’ime nkeji ole ndị ahụ. Ọ bụ naanị ndị nọ n’ụdị ọnọdụ ndị a anyị kọwara ebe a nwere ike inye malite ná nkeji iri na ise gawa n’akụkọ ozi ha. Ọ bụ kọmitii ije ozi ọgbakọ ga-ekpebi onye nkwusa okwu a gbasara.

KAADỊ ONYE NKWUSA

30 A na-ede ihe ị rụtara n’ozi ọma n’ọnwa ọ bụla na Kaadị Onye Nkwusa. Kaadị a bụ nke ọgbakọ. Ị chọọ ịgafe n’ọgbakọ ọzọ, gwa ndị okenye unu. Odeakwụkwọ ọgbakọ ga-ahụ na e zigara kaadị gị n’ọgbakọ ọhụrụ ị nọ na ya. Ndị okenye ọgbakọ ị nọ na ya ugbu a nweta kaadị gị, ha ga-anabata gị nke ọma ma nyere gị aka ịna-emekwu nke ọma n’ọgbakọ. Ma, ọ bụrụ na ị gaa n’ọgbakọ ọhụrụ ma ị gaghị anọru ọnwa atọ ebe ahụ, biko, na-ezigara ọgbakọ unu akụkọ ozi gị.

IHE MERE ANYỊ JI ENYE AKỤKỌ OZI ANYỊ

31 Ị̀ na-echefu inye akụkọ ozi gị mgbe ụfọdụ? Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịrị ichetara anyị mgbe ụfọdụ ka anyị nye akụkọ ozi anyị. Ma ọ bụrụ na anyị ejiri ya kpọrọ mkpa, ghọtakwa ihe mere anyị ji enye ya, anyị ga na-echeta inye akụkọ ozi anyị.

32 Ụfọdụ ndị ajụọla, sị: “Ebe Jehova ma otú m si ejere ya ozi, gịnị mere m ga-eji na-enye akụkọ ozi?” O doro anya na Jehova ma otú anyị si ejere ya ozi, marakwa ma ànyị ji obi anyị niile na-ejere ya ozi. Ma cheta na Jehova dekọrọ abalị ole Noa nọrọ n’ụgbọ, dekọọkwa afọ ole ụmụ Izrel nọrọ n’ala ịkpa. Chineke dekọkwara ụmụ Izrel ole rubeere ya isi na ole nupụụrụ ya isi. O dekọkwara otú ụmụ Izrel si jiri nwayọọ nwayọọ merie ndị Kenan nakwa ihe dị iche iche ndị ikpe ụmụ Izrel mere. O doro anya na Jehova dekọrọ ọtụtụ ihe ndị ohu ya mere nakwa otú ha si mee ha. O nyere ụfọdụ ndị ohu ya mmụọ nsọ ya, ha edekọọ ihe ndị a. O si otú ahụ mee ka anyị mara na o ji idekọ ihe ndị mere eme kpọrọ ihe.

33 Ihe ndị a kọrọ na Baịbụl gosiri na ndị Jehova ji dekọọ ha dere ihe mere eme. N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru ole mmadụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ a na-akọ akụkọ ha dị, ka anyị nwee ike ịghọta ha nke ọma. Lee ebe ndị ị ga-ahụ ụfọdụ n’ime ha: Jenesis 46:27; Ọpụpụ 12:37; Ndị Ikpe 7:7; 2 Ndị Eze 19:35; 2 Ihe E Mere 14:​9-13; Jọn 6:10; 21:11; Ọrụ Ndịozi 2:41; 19:19.

34 Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị ozi niile anyị jeere Jehova ka anyị na-ede n’akụkọ ozi anyị, ma akụkọ ozi anyị na-aba uru ná nzukọ Jehova. N’otu oge ndịozi Jizọs gachara ozi ọma lọta, ha kọọrọ Jizọs “ihe niile ha mere nakwa ihe ha kụziri.” (Mak 6:30) Mgbe ụfọdụ, akụkọ ozi anyị na-eme ka a mata ebe anyị ga-emezi n’ozi anyị. Ọ bụ eziokwu na akụkọ ozi anyị nwere ike igosi ebe ndị anyị mere nke ọma, ha nwekwara ike igosi ebe ndị anyị na-emechaghị nke ọma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike igosi na ndị ghọrọ ndị nkwusa ehichaghị nne. O nwere ike ịbụ na ihe ga-enye aka bụ ịgba ụmụnna ume ma ọ bụ ileba anya ná nsogbu ụfọdụ ha nwere. Ndị okenye ndị ji ọrụ ha kpọrọ ihe na-eleru anya n’akụkọ ozi ọgbakọ ma gbaa mbọ hụ na e nyeere ọgbakọ ma ọ bụ ụmụnna ụfọdụ aka ka ha mezie ebe ha na-anaghị emecha nke ọma n’ozi ha.

35 Akụkọ ozi anyị na-enyekwara nzukọ Jehova aka ịma ebe a chọkwuru ụmụnna ga na-ezi ozi ọma. E nwere ike iji ya chọpụta ebe ndị mmadụ na-aka abata n’ọgbakọ ma ọ bụ ebe ndị mmadụ na-anaghị eji ike abata n’ọgbakọ. E nwekwara ike iji ya mata akwụkwọ a ga-eji enyere ndị mmadụ aka ịmụta Baịbụl. Akụkọ ozi anyị na-enyekwara nzukọ a aka ịma akwụkwọ ole ndị e nwere ike iji jee ozi n’ebe dị iche iche n’ụwa nakwa ịhụ na akwụkwọ ndị ahụ agaghị akọ ụkọ.

36 Ihe ọzọ bụ na akụkọ ozi anyị na-agba anyị ume. Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị nụ otú ụmụnna anyị si ekwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche. Akụkọ ozi anyị na-emekwa ka anyị mara otú ọtụtụ ndị si na-abata ná nzukọ Jehova. Akụkọ gbasara ozi anyị niile jere na-atọ anyị ụtọ, na-emekwa ka anyị na-ejesi ozi ọma ike. (Ọrụ 15:3) Anyị kwesịrị ịna-enye akụkọ ozi anyị kwa ọnwa n’ihi na ọ na-egosi na anyị na-echebara ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile echiche. Ọ na-egosikwa na anyị na-eme ihe nzukọ Jehova na-agwa anyị.​—Luk 16:10; Hib. 13:17.

IKPEBI OTÚ Ị GA-ESI EJEKWU OZI

37 Anyị ekwesịghị iji akụkọ ozi anyị atụnyere nke ndị ọzọ. (Gal. 5:26; 6:4) Ọnọdụ anyị dị iche iche. Ma, ọ bụrụ na anyị enwee ihe ndị anyị kpebiri imekwu n’ikwusa ozi ọma, ọ ga-eme ka anyị mata ma ànyị na-eme nke ọma n’ozi anyị ma ọ bụ na anyị anaghị eme. Anyị mee ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime, obi ga-atọ anyị ụtọ.

38 O doro anya na ọ bụ Jehova na-eme ka ndị mmadụ na-abata n’ọgbakọ n’ike n’ike. Ọ ga-echebekwa ha “n’oké mkpagbu.” E nwere otu amụma Aịzaya buru na-emezu n’oge anyị a. Amụma ahụ bụ: “Onye nta ga-aghọ otu puku mmadụ, onye kasị nta ga-aghọkwa mba dị ike. Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka o mezuo ọsọ ọsọ n’oge ya.” (Mkpu. 7:​9, 14; Aịza. 60:22) Obi dị anyị ụtọ na anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’oge ikpeazụ a. N’eziokwu, ọ bụ ihe ọma Jehova meere anyị.​—Mat. 24:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya