2 Ihe E Mere
24 Jehoash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịchị,+ ọ chịkwara afọ iri anọ na Jeruselem.+ Aha nne ya bụ Zibia onye Bia-shiba.+ 2 Jehoash+ wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova+ n’ụbọchị niile Jehoyada onye nchụàjà dị ndụ.+ 3 Jehoyada wee lụọrọ ya ụmụ nwaanyị abụọ, o wee mụọ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.+
4 O wee ruo mgbe e mesịrị na ọ dị Jehoash n’obi ịrụzigharị ụlọ Jehova.+ 5 O wee kpọkọta ndị nchụàjà+ na ndị Livaị, sị ha: “Gaanụ n’obodo ndị dị na Juda nata Izrel dum ego maka iji na-arụzi+ ụlọ Chineke site n’afọ ruo n’afọ;+ unu onwe unu kwa, meenụ ihe ngwa ngwa banyere ya.” Ma ndị Livaị emeghị ihe ngwa ngwa.+ 6 Eze wee kpọọ Jehoyada bụ́ onyeisi ha wee sị ya:+ “Gịnị mere ị gwabeghị ndị Livaị ka ha mee mpịazi maka ụtụ dị nsọ ha na-anata na Juda na Jeruselem dị ka Mozis ohu Jehova nyere n’iwu,+ ya bụ, nke ọgbakọ Izrel na-atụ, maka ụlọikwuu Ihe Àmà?+ 7 N’ihi na ụmụ Atalaya,+ bụ́ ajọ nwaanyị, wabara n’ụlọ ezi Chineke+ buru ọbụna ihe niile dị nsọ+ dị n’ụlọ Jehova nyefee Bel.”+ 8 Eze wee nye iwu, ha wee rụọ igbe+ ma dọba ya ná mpụga ọnụ ụzọ ámá nke ụlọ Jehova. 9 Ha wee kpọsaa n’ime Juda na Jeruselem dum ka a na-ewetara Jehova ụtụ dị nsọ+ bụ́ nke Mozis ohu ezi Chineke nyere Izrel iwu+ n’ala ịkpa ka ha na-eweta. 10 Ndị isi niile+ na mmadụ niile wee malite ịṅụrị ọṅụ,+ ha wee na-eweta ya ma na-etinye ya n’igbe+ ahụ ruo mgbe ha niile wetachara ụtụ ha.
11 Mgbe oge ruru, ọ na-eme ka ndị Livaị+ butere eze igbe ahụ ka ọ hụ maka ya, ozugbo ha hụrụ na ego dị na ya ehiwo nne,+ odeakwụkwọ+ eze na onye nlekọta nke na-enyere onyeisi nchụàjà aka na-abịa wepụta ego dị n’igbe ahụ ma bughachi ya n’ebe ọ na-adị. Ọ bụ otú ahụ ka ha na-eme ya kwa ụbọchị, nke mere na ha nwetara ego hiri nne. 12 Eze na Jehoyada na-ewere ya nye ndị na-arụ ọrụ+ n’ụlọ Jehova,+ ha wee na-ego ndị na-awa nkume+ na ndị omenkà+ maka ịrụzi ụlọ Jehova,+ tinyere ndị ọrụ ígwè na ọla kọpa maka ịrụzi ụlọ Jehova.+ 13 Ndị na-arụ ọrụ ahụ wee malite ọrụ,+ nrụzi ha na-arụzi ụlọ ahụ wee na-aga n’ihu, n’ikpeazụ, ha mere ka ụlọ ezi Chineke dịrị otú o kwesịrị, meekwa ka o sie ike. 14 Ozugbo ha rụchara, ha wetaara eze na Jehoyada ego fọdụrụ, ha wee rụọ arịa dị iche iche maka ụlọ Jehova, arịa dị iche iche maka ije ozi+ nakwa maka ịchụ àjà, rụọkwa iko+ dị iche iche, jirikwa ọlaedo+ na ọlaọcha rụọ arịa dị iche iche; ha wee na-achụ àjà nsure ọkụ+ n’ụlọ Jehova mgbe niile n’ụbọchị niile Jehoyada dị ndụ.
15 Jehoyada wee mee agadi, afọ ndụ ya jukwara ya afọ,+ o wee nwụọ, ọ dị otu narị afọ na iri atọ mgbe ọ nwụrụ. 16 Ha wee lie ya n’Obodo Devid n’ebe a na-eli ndị eze,+ n’ihi na o mere ihe ọma n’Izrel,+ meekwa ihe ọma n’ihe banyere ezi Chineke na ụlọ Ya.
17 Mgbe Jehoyada nwụsịrị, ndị isi+ nke Juda batara kpọọrọ eze isiala. Eze wee gee ha ntị n’oge ahụ.+ 18 Ha wee jiri nke nta nke nta hapụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke nke ndị nna nna ha wee malite ife ogwe osisi dị nsọ+ na arụsị+ ofufe, nke mere na e wesoro Juda na Jeruselem iwe n’ihi mmehie a ha mere.+ 19 O wee na-ezigara ha ndị amụma+ iji mee ka ha lọghachikwute Jehova; ha wee na-agba àmà megide ha, ma ha egeghị ha ntị.+
20 Mmụọ+ Chineke wee kpuchie+ Zekaraya+ nwa Jehoyada+ onye nchụàjà, o wee guzoro n’ihu ìgwè mmadụ wee sị ha: “Nke a bụ ihe ezi Chineke kwuru, ‘Gịnị mere unu ji na-emebi ihe Jehova nyere n’iwu, nke ga-eme ka ihe ghara ịgaziri unu?+ Ebe ọ bụ na unu ahapụwo Jehova, ya onwe ya ga-ahapụ unu.’”+ 21 N’ikpeazụ, ha gbaara ya izu+ wee were nkume tụgbuo ya+ n’ogige ụlọ Jehova dị ka ihe eze nyere n’iwu si dị. 22 Jehoash bụ́ eze echetaghị obiọma* Jehoyada nna Zekaraya gosiri ya,+ o wee gbuo nwa ya, bụ́ onye kwuru mgbe ọ nọ n’ọnụ ọnwụ, sị, “Ka Jehova hụ maka nke a wee bọọ ọbọ ya.”+
23 O wee ruo ná mmalite+ afọ na-esonụ na ndị agha Siria+ busoro ya agha,+ ha wee na-awakpo Juda na Jeruselem. Ha wee laa ndị isi niile+ nke Juda n’iyi, ha zigakwaara eze Damaskọs+ ihe niile ha kwatara. 24 N’ihi na ọ bụ naanị ndị ikom ole na ole ka ndị agha Siria ji wakpo+ obodo ahụ, Jehova wee nyefee ndị agha dị nnọọ ọtụtụ n’aka ha,+ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha; ha mekwara ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ Jehoash.+ 25 Mgbe ha hapụrụ ya lawa (n’ihi na ha hapụrụ ya ọ dị ndụ ọnwụ ka mma),+ ndị na-ejere ya ozi gbaara ya izu+ n’ihi ọbara+ ụmụ Jehoyada+ onye nchụàjà; ha wee gbuo ya+ ka o dina n’ihe ndina ya. Ha wee lie ya n’Obodo Devid,+ ma ha elighị ya n’ebe a na-eli ndị eze.+
26 Ọ bụ ndị a gbaara ya izu: Zebad+ nwa Shimiat bụ́ nwaanyị Amọn na Jehọzabad nwa Shimrit bụ́ nwaanyị Moab. 27 Ma banyere ụmụ ya na ọtụtụ okwu e kwuru megide ya+ nakwa banyere nrụzi ọ rụziri ntọala+ nke ụlọ ezi Chineke, lee, e dere ha n’akwụkwọ nkọwa nke Akwụkwọ+ Ndị Eze. Amazaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.