1 Samuel
5 Ma ndị Filistia buuru igbe+ nke ezi Chineke wee si n’Ebeniza bute ya n’Ashdọd.+ 2 Ndị Filistia wee buru igbe nke ezi Chineke bubata ya n’ụlọ Degọn ma dọba ya n’akụkụ Degọn.+ 3 Ndị Ashdọd wee bilie n’isi ụtụtụ echi ya, ma, lee, Degọn dara kpuo ihu n’ala n’ihu igbe Jehova.+ Ha wee buru Degọn debeghachi ya n’ebe ọ na-adị.+ 4 Mgbe ha biliri n’isi ụtụtụ echi ya, lee, Degọn dara kpuo ihu n’ala n’ihu igbe Jehova, e gbupụkwara isi Degọn na ọbụ aka ya abụọ, ha wee tọgbọrọ n’ụzọ mbata.+ Naanị akụkụ ya bụ́ azụ̀ fọdụrụ. 5 Ọ bụ ya mere na ndị nchụàjà Degọn na ndị niile na-abanye n’ụlọ Degọn adịghị azọ ụkwụ n’ụzọ mbata ụlọ Degọn nke dị n’Ashdọd ruo taa.
6 Aka Jehova+ wee dị arọ n’ahụ́ ndị Ashdọd, o wee malite imenye Ashdọd na ókèala ya niile ụjọ na ime ka ha rịawa ọkpụ ikè.+ 7 Ndị Ashdọd wee hụ otú ihe si kwụrụ, ha wee sị: “Unu ekwela ka igbe Chineke Izrel dịrị n’etiti anyị, n’ihi na aka ya dị ike megide anyị na Degọn bụ́ chi anyị.”+ 8 Ya mere, ha zipụrụ ozi wee kpọkọta ndị isi niile nke ndị Filistia, sị: “Gịnị ka anyị ga-eme igbe Chineke Izrel?” N’ikpeazụ, ha sịrị: “Ka e buru igbe Chineke Izrel gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo Gat.”+ Ha wee buru igbe Chineke Izrel gaa nkọnkọ nkọnkọ ruo n’ebe ahụ.
9 O wee ruo na mgbe ha gaara nkọnkọ nkọnkọ bute ya n’ebe ahụ, aka Jehova+ tinyere oké ọgba aghara n’obodo ahụ, o wee malite iti ndị obodo ahụ ihe otiti, malite n’onye nta ruo n’onye ukwu, ọkpụ ikè+ malitekwara ịpụta ha. 10 N’ihi ya, ha bugara igbe ezi Chineke n’Ekrọn.+ O wee ruo na ozugbo igbe ezi Chineke rutere n’Ekrọn, ndị Ekrọn malitere iti mkpu, sị: “Ha ebuteworo m igbe ezi Chineke Izrel iji gbuo mụ na ndị m!”+ 11 Ha wee zipụ ozi wee kpọkọta ndị isi niile nke ndị Filistia, sị: “Bupụnụ igbe Chineke Izrel ka ọ laghachi n’ebe o si, ka ọ ghara igbu mụ na ndị m.” N’ihi na ọgba aghara nke na-akpata ọnwụ dị n’obodo ahụ dum;+ aka nke ezi Chineke dịkwa nnọọ arọ n’ebe ahụ,+ 12 e mekwara ka ndị na-anwụghị rịawa ọkpụ ikè.+ Mkpu+ enyemaka nke obodo ahụ na-eti nọkwa na-arịgo n’eluigwe.