Ọpụpụ 6:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Otú ọ dị, Mozis kwuru n’ihu Jehova, sị: “Lee! Ụmụ Izrel egeghị m ntị;+ olee otú Fero ga-esi getụdị m ntị,+ ebe m bụ onye a na-ebighị úgwù n’egbugbere ọnụ?”+ Ọnụ Ọgụgụ 12:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ma nwoke ahụ bụ́ Mozis dị nnọọ umeala n’obi+ karịa mmadụ niile nọ n’elu ala. Jeremaya 1:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ma m sịrị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, amaghị m okwu ekwu,+ n’ihi na abụ m nwata.”+ Ọrụ Ndịozi 7:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 N’ihi ya, a kụziiri Mozis ihe n’amamihe+ niile nke ndị Ijipt. N’eziokwu, ọ dị ike n’okwu+ na n’omume. 2 Ndị Kọrịnt 11:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ma ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu,+ n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma;+ kama n’ụzọ niile, anyị mere ka ọ pụtara unu ìhè n’ihe niile.+
12 Otú ọ dị, Mozis kwuru n’ihu Jehova, sị: “Lee! Ụmụ Izrel egeghị m ntị;+ olee otú Fero ga-esi getụdị m ntị,+ ebe m bụ onye a na-ebighị úgwù n’egbugbere ọnụ?”+
22 N’ihi ya, a kụziiri Mozis ihe n’amamihe+ niile nke ndị Ijipt. N’eziokwu, ọ dị ike n’okwu+ na n’omume.
6 Ma ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu,+ n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma;+ kama n’ụzọ niile, anyị mere ka ọ pụtara unu ìhè n’ihe niile.+