21 Jehova wee gaa n’ihu ịgwa Mozis, sị: “Mgbe ị laghachisịrị Ijipt, hụ na ị rụrụ n’ihu Fero ọrụ ebube niile ahụ m tinyeworo n’aka gị.+ Ma mụ onwe m ga-ekwe ka obi ya kpọchie;+ ọ gaghịkwa ahapụ ndị m ka ha laa.+
17 Ma mụ onwe m, lee, m ga-ekwe ka obi ndị Ijipt kpọchie,+ ka ha wee chụrụ ha banye ka m wee nwetara onwe m otuto site n’imeri Fero na ìgwè ndị agha ya niile, ụgbọ ịnyịnya agha ya na ndị agha ịnyịnya ya.+
20 N’ihi na ihe Jehova mere ha bụ ikwe ka obi ha kpọchie+ ka ha buso Izrel agha, ka o wee bibie ha, ka a ghara imere ha ebere,+ kama ka ọ laa ha n’iyi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+
13 O nupụkwaara ọbụna Eze Nebukadneza isi,+ bụ́ onye mere ka o jiri Chineke ṅụọ iyi;+ o wee kwesie olu ike,+ kpọchiekwa+ obi ya wee ghara ịlọghachikwute Jehova bụ́ Chineke Izrel.