12 ọ ga-ahụ na e bupụrụ ha dum ná mpụga ebe ha mara ụlọikwuu+ wee buga ha n’ebe dị ọcha, n’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara,+ ọ ga-atụkwasị ha n’elu nkụ kpọọ ha ọkụ.+ N’ebe a na-awụsa ntụ nke ya na abụba gwakọtara ka a ga-akpọ ha ọkụ.
27 “Otú ọ dị, ọ ga-ahụ na e bupụrụ oké ehi àjà mmehie ahụ na mkpi àjà mmehie ahụ, bụ́ ndị e bubatara ọbara ha n’ebe nsọ maka iji kpuchie mmehie, ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu; ha ga-akpọ akpụkpọ ha na anụ ha na nsị ha ọkụ.+
9 “‘Nwoke dị ọcha ga-ekporo ntụ+ nne ehi ahụ kposa ná mpụga ebe unu mara ụlọikwuu n’ebe dị ọcha; a ga-edebere ya nzukọ ụmụ Izrel maka mmiri ahụ e ji eme ka mmadụ dị ọcha.+ Ọ bụ àjà mmehie.