3 Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, ma wughachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel—ọ bụ ya bụ ezi Chineke+—bụ́ ụlọ dị na Jeruselem.+
8 Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ onye na-akpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ kwuru: “M ga-akpọkọtara ha ndị ọzọ ma e wezụga ndị nke ha a kpọkọtaworo akpọkọta.”+
13 M ga-esi n’etiti ndị dị iche iche kpọpụta ha,+ sikwa n’ala dị iche iche chịkọta ha wee kpọbata ha n’ala ha,+ zụọkwa ha n’ugwu ndị dị n’Izrel, n’akụkụ ọwa mmiri nakwa n’ebe obibi niile nke ala ha.+