40 N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-aghọrọ mkpụrụ nke osisi ndị mara mma, gburukwa igu nkwụ+ na alaka nke osisi ndị wara alaka na osisi pọpla nke ndagwurugwu, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu ruo ụbọchị asaa.
12 Unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke unu,+ unu na ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom na ohu unu ndị ikom na ohu unu ndị inyom na onye Livaị nke bi n’obodo unu, n’ihi na ọ dịghị òkè ma ọ bụ ihe nketa o nwere n’etiti unu.+
26 Ị ga-enyekwa ego ahụ maka ihe ọ bụla pụrụ ịgụ mkpụrụ obi gị agụụ,+ dị ka ehi na atụrụ na ewu na mmanya na ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu+ nakwa ihe ọ bụla mkpụrụ obi gị pụrụ ịchọ ka i nye ya; ị ga-erikwa ihe n’ebe ahụ n’ihu Jehova bụ́ Chineke gị ma ṅụrịa ọṅụ,+ gị na ezinụlọ gị.