22 “N’ihi na ọ bụrụ na unu edebezuo iwu+ a dum m na-enye unu wee mee ya, wee hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya,+ wee jee ije n’ụzọ ya niile,+ raparakwa ya n’ahụ́,+
5 Naanị lezienụ anya debe ntụziaka+ na iwu ahụ Mozis ohu Jehova nyere unu site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke unu+ n’anya nakwa ije ije n’ụzọ ya niile,+ sitekwa n’idebe ihe o nyere n’iwu+ na ịrapara n’ahụ́ ya,+ sitekwa n’iji obi+ unu dum na mkpụrụ obi+ unu dum na-ejere ya ozi.”+