10 Mmụọ+ Jehova wee dakwasị ya, o wee ghọọ onyeikpe Izrel. Mgbe ọ pụrụ gaa agha, Jehova nyere Kushan-rishateyim eze Siria n’aka ya nke mere na o meriri+ Kushan-rishateyim.
14 Debora wee sị Berak: “Bilie, n’ihi na taa ka Jehova ga-enyefe Sisera n’aka gị. Ọ́ bụghị Jehova buteere gị ụzọ?”+ Berak wee si n’Ugwu Tebọ gbadaa, ya na puku ndị ikom iri so ya.
8 Ọ̀ bụ na ndị Itiopia+ na ndị Libia+ abụghị ìgwè ndị agha dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya?+ Ọ̀ bụ na Jehova enyefeghị ha n’aka gị maka na ị dabeere n’ebe ọ nọ?+
17 Unu agaghị alụ ọgụ+ na nke ugbu a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ, guzoronụ otu ebe+ hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.+ Juda na Jeruselem, unu atụla egwu, unu atụkwala ụjọ.+ Echi gakwurunụ ha, Jehova ga-anọnyekwara unu.’”+