19 Ebe e si arịgo ocheeze ahụ nwere nzọụkwụ isii, ocheeze ahụ nwekwara ihe mkpuchi dị gburugburu n’azụ ya, ebe a na-anọdụ ọdụ nwekwara ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ, ọdụm abụọ+ guzokwa n’akụkụ ebe ndị ahụ a na-atụkwasị aka.+
19 Ihu nke yiri ihu mmadụ chere nkwụ ahụ a tụrụ atụ́ ihu n’otu akụkụ ya. Nke yiri ihu nwa ọdụm tojuru etoju chekwara nkwụ ahụ ihu n’akụkụ ya nke ọzọ,+ a tụkwara ha n’ụlọ ahụ dum gbaa gburugburu.
14 N’ihi na m ga-adị ka nwa ọdụm nye Ifrem,+ m ga-adịkwa ka nwa ọdụm tojuru etoju nye ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-adọgbu ha, m ga-agakwa buru ha, ọ dịghịkwa onye ga-anapụta ha.+