2 O wee gburie ya, wepụsịakwa nkume na ya wee kụọ ezi mkpụrụ vaịn uhie na ya, wuokwa ụlọ nche n’etiti ya.+ O gwukwara ebe nzọchapụta mmanya n’ime ya.+ O wee na-atụ anya ka ọ mịa ezi mkpụrụ vaịn,+ ma ọ mịrị mkpụrụ vaịn ọhịa.+
5 Ugbu a, biko, ka m gwa unu ihe m ga-eme ubi vaịn m: A ga-ewepụ ogige ya,+ a ghaghịkwa ịgba ya ọkụ.+ A ga-akwatu mgbidi ya e ji nkume wuo, ọ ghaghịkwa ịghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ.+