9 Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e dee ya n’akwụkwọ ka a laa ha n’iyi; m ga-akwụkwa ndị ga-arụ ọrụ+ ahụ iri puku+ talent ọlaọcha ka e tinye ya n’ebe eze na-edebe akụ̀.”
7 Mọdekaị wee kọọrọ ya ihe niile dakwasịworo ya+ nakwa kpọmkwem ego ole Heman kwuru ka a kwụnye n’ebe eze na-edebe akụ̀+ maka imegide ndị Juu, ka e bibie ha.+
8 O nyekwara ya akwụkwọ+ iwu ahụ e tiri na Shushan+ ka a laa ha n’iyi ka o gosi ya Esta ma kọọrọ ya banyere ya, ka o nyekwa ya iwu+ ka ọ gakwuru eze rịọ ya ka o meere ha amara+ ma rịọ ya arịrịọ ihu na ihu maka ndị ya.+