30 Ma ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọhụrụ ka Jehova ga-eke,+ o wee bụrụ na ala ga-emeghe ọnụ ya loo ha+ na ihe niile bụ́ nke ha, ha onwe ha ewee gbadaruo Shiol ná ndụ,+ unu ga-amara n’ezie na ndị ikom a elelịwo Jehova.”+
23 Ma Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ dụrụ n’ọdụ,+ o wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu wee bilie laa n’ụlọ ya, n’obodo ya.+ O wee nye ezinụlọ ya iwu+ ma kwụgbuo+ onwe ya, o wee si otú a nwụọ.+ E wee lie+ ya n’ebe ili ozu nke nna nna ya hà.
14 Joab wee sị: “Ka m ghara igbuwe onwe m oge otú a n’ihu gị!” O wee chịrị ube atọ n’aka ya wee gaa manye+ ha n’obi+ Absalọm mgbe ọ ka dị ndụ n’etiti nnukwu osisi ahụ.
18 (Ya mere, nwoke a ji ụgwọ ọrụ nke ajọ omume+ zụta+ otu ala, o bukwa ụzọ sụọ isi n’ala,+ afọ ya wee gbawaa mee mkpọtụ, eriri afọ ya niile wee wụpụta.