10 ọ bụrụkwa na i nye onye agụụ na-agụ ihe na-agụ mkpụrụ obi gị,+ nyejuokwa mkpụrụ obi nke nọ n’ahụhụ afọ, ìhè gị ga-enwukwa ọbụna n’ọchịchịrị, itiri gị ga-adịkwa ka etiti ehihie.+
9 Ma unu bụ “agbụrụ a họọrọ, òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze, mba dị nsọ,+ otu ndị pụrụ iche nke Chineke,+ ka unu wee kwusaa n’ebe niile ịdị mma”+ nke onye ahụ kpọpụtara unu n’ọchịchịrị wee kpọba unu n’ìhè ya dị ebube.+
5 Abalị agaghị adịkwa ọzọ,+ ìhè oriọna adịghịkwa ha mkpa, ha enweghịkwa ìhè anyanwụ, n’ihi na Jehova Chineke ga-enye ha ìhè,+ ha ga-achịkwa dị ka ndị eze ruo mgbe niile ebighị ebi.+