28 Chineke gọzikwara ha,+ Chineke wee sị ha: “Mụọnụ ọmụmụ,+ baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu,+ ka azụ̀ ndị dị n’oké osimiri na anụ ufe nke eluigwe na ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.”+
18 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe,+ Onye bụ́ ezi Chineke,+ Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya,+ Onye mere ka o guzosie ike,+ onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya:+ “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+
26 O sitekwara n’otu mmadụ+ mee mba ọ bụla+ nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum,+ o kpebikwara oge+ dị iche iche a kara aka, kpaakwara ebe obibi nke ụmụ mmadụ ókè,+