9 O wee sị ndị ikom ahụ: “Amaara m na Jehova ga-enye unu ala a,+ nakwa na ụjọ unu ejidela anyị,+ nakwa na obi na-alọ ndị niile bi n’ala a mmiri n’ihi unu.+
16 O wee ruo na, ngwa ngwa ndị iro anyị niile+ nụrụ ya, mba niile gbara anyị gburugburu ahụkwa ya, ihere onwe ha mere ha ozugbo, ha amarakwa na ọ bụ Chineke+ mere ka a rụọ ọrụ a.