1 Samuel 19:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Jọnatan wee gwa Sọl nna ya okwu ọma+ banyere Devid, sị ya: “Ka eze ghara imehie+ ohu ya Devid, n’ihi na o mehieghị gị, ọrụ ọ na-arụrụ gị dịkwa nnọọ mma.+ 1 Samuel 25:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 O wee daa n’ụkwụ ya,+ sị: “Onyenwe m, ka njehie ahụ dị n’isi m;+ biko, ka ohu gị nwaanyị kwuo okwu ná ntị gị,+ geekwa ntị n’okwu ohu gị nwaanyị. Esta 4:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 N’ihi na ọ bụrụ na ị gbachi nkịtị ugbu a, enyemaka na nnapụta ga-esi n’ebe ọzọ bịara ndị Juu;+ ma gị na ezinụlọ nna gị ga-ala n’iyi. Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?”+ Abụ Ọma 145:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ha ga na-ekwu banyere ịdị ebube nke ọbụbụeze gị,+Ha ga na-ekwukwa banyere ịdị ike gị,+
4 Jọnatan wee gwa Sọl nna ya okwu ọma+ banyere Devid, sị ya: “Ka eze ghara imehie+ ohu ya Devid, n’ihi na o mehieghị gị, ọrụ ọ na-arụrụ gị dịkwa nnọọ mma.+
24 O wee daa n’ụkwụ ya,+ sị: “Onyenwe m, ka njehie ahụ dị n’isi m;+ biko, ka ohu gị nwaanyị kwuo okwu ná ntị gị,+ geekwa ntị n’okwu ohu gị nwaanyị.
14 N’ihi na ọ bụrụ na ị gbachi nkịtị ugbu a, enyemaka na nnapụta ga-esi n’ebe ọzọ bịara ndị Juu;+ ma gị na ezinụlọ nna gị ga-ala n’iyi. Ònye ma ma ọ̀ bụ n’ihi oge dị otú a ka i ji ruo n’ọkwá ịbụ nwunye eze?”+