6 Anyị wee yie onye na-adịghị ọcha, anyị niile, ezi omume anyị niile yikwara uwe e yi mgbe a na-ahụ nsọ;+ anyị ga-akpọnwụ dị ka mkpá akwụkwọ,+ anyị niile, njehie anyị ga-ebufukwa anyị dị ka ifufe.+
17 N’ihi na ị na-asị: “Abara m ọgaranya,+ enwetawokwa m akụnụba, ọ dịghịkwa ihe na-akpa m ma ọlị,” ma ị maghị na ị nọ ná nhụsianya, bụrụkwa onye e kwesịrị imere ebere nakwa onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì+ na onye gba ọtọ,