14 Ya mere, Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́+ ma bie n’etiti anyị. Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ naanị ya+ na-enweta n’aka nna ya; o jupụtakwara n’obiọma na-erughịrị mmadụ na eziokwu.+
16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya+ nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka e wee ghara ibibi+ onye ọ bụla nke nwere okwukwe+ na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+
2 agwawo anyị okwu n’ọgwụgwụ ụbọchị ndị a+ site n’ọnụ Ọkpara ya,+ onye ọ họpụtara ka ọ bụrụ onye nketa nke ihe niile,+ onye o sikwa n’aka ya mee+ usoro ihe dị iche iche.