Ilu 27:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Dị nnọọ ka nnụnụ nke na-efepụ n’akwụ́ ya,+ otú ahụ ka nwoke nke na-agbapụ n’ebe obibi ya dị.+ Aịzaya 13:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Ọ ga-erukwa na, dị ka nne mgbada a na-achụ ọsọ, nakwa dị ka ìgwè atụrụ nke na-enweghị onye na-achịkọta ha,+ onye ọ bụla ga-agbakwuru ndị nke ya; onye ọ bụla n’ime ha ga-agbala n’ala ya.+ Jeremaya 48:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 “Guzoro, lewe anya ka ị hụ ihe na-eme n’ụzọ, gị nwaanyị bi n’Aroa.+ Jụọ nwoke na-agba ọsọ na nwaanyị na-agbapụ agbapụ ajụjụ. Sị ha, ‘Gịnị mere?’+
14 Ọ ga-erukwa na, dị ka nne mgbada a na-achụ ọsọ, nakwa dị ka ìgwè atụrụ nke na-enweghị onye na-achịkọta ha,+ onye ọ bụla ga-agbakwuru ndị nke ya; onye ọ bụla n’ime ha ga-agbala n’ala ya.+
19 “Guzoro, lewe anya ka ị hụ ihe na-eme n’ụzọ, gị nwaanyị bi n’Aroa.+ Jụọ nwoke na-agba ọsọ na nwaanyị na-agbapụ agbapụ ajụjụ. Sị ha, ‘Gịnị mere?’+