6 M ga-emekwa ka ọ bụrụ ihe e bibiri ebibi.+ A gaghị akwacha alaka vaịn ya akwacha, a gaghịkwa abọ ya ahịhịa.+ Ogwu na ahịhịa ga-epu na ya;+ m ga-enye ígwé ojii iwu ka ọ ghara izokwasị ya mmiri.+
12 “Ònye maara ihe, ka o wee ghọta ihe a, ònyekwa ka Jehova ji ọnụ ya gwa okwu, ka onye ahụ wee kọọ ya?+ N’ihi gịnị ka ala a ga-eji laa n’iyi, e wee gbaa ya ọkụ dị ka ala ịkpa, n’enweghị onye na-esi na ya agafe?”+
7 “‘Mụ onwe m kwa gbochiri oké mmiri ozuzo izoro unu mgbe ọ fọrọ ọnwa atọ ka oge owuwe ihe ubi ruo;+ m mekwara ka mmiri zoo n’otu obodo, ma emeghị m ka mmiri zoo n’obodo ọzọ. Mmiri zoro n’otu ibé ala, ma ibé ala nke m na-emeghị ka mmiri zoo na ya kpọrọ nkụ.+
11 Anọgidekwara m na-ekwu ka elu ala na ugwu kpọọ nkụ, ka o metụtakwa ọka* na mmanya ọhụrụ+ na mmanụ na ihe ala ga-epupụta na mmadụ na anụ ụlọ na ihe niile unu dọgbuuru onwe unu n’ọrụ.’”+