12 Ọtụtụ n’ime ndị nchụàjà+ na ndị Livaị na ndị isi nke ọnụmara dị iche iche,+ ndị agadi bụ́ ndị hụrụ ụlọ mbụ ahụ,+ nọ na-akwa ákwá+ n’olu dara ụda mgbe a na-atọ ntọala+ ụlọ a n’ihu ha, ebe ọtụtụ ndị ọzọ nọ na-eti mkpu ọṅụ.+
17 Ọgbakọ ahụ dum nke ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta wee wuo ụlọ ndò, wee biri n’ụlọ ndò; n’ihi na ụmụ Izrel emetụbeghị otú ahụ malite n’oge Jọshụa nwa Nọn+ ruo n’ụbọchị ahụ, ha wee na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+
10 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta,+ tirikwa mkpu ọṅụ bata na Zayọn;+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ, iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+
11 Ndị Jehova gbapụtara ga-alọta, tiri mkpu ọṅụ bata na Zayọn,+ ha ga na-aṅụrịkwa ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-enwe obi ụtọ na ọṅụ.+ Iru uju na ịsụ ude ga-agbafu.+
4 Gị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke bụ́ Izrel, m ka ga-ewughachi gị,+ i wee bụrụ ebe e wughachiri ewughachi. Ị ga-eji obere ịgbà gị chọọ onwe gị mma ọzọ wee na-agba egwú dị ka ndị obi dị ụtọ.+