9 E wezụga na Jehova nke ụsụụ ndị agha mere ka mmadụ ole na ole ndị lanahụrụ alanahụ fọdụrụ anyị,+ anyị gaara adị nnọọ ka Sọdọm, anyị gaara eyi Gọmọra.+
32 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ;+ n’ihi na ndị gbapụrụ agbapụ ga-anọ n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem,+ dị nnọọ ka Jehova kwuru, nọrọkwa n’etiti ndị lanahụrụ alanahụ, bụ́ ndị Jehova na-akpọ.”+