3 Tọọnụ ntị n’ala+ bịakwute m.+ Geenụ ntị, mkpụrụ obi unu ga-adịkwa ndụ,+ mụ na unu ga-agba ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’ihe banyere obiọma* na-adịghị ada ada m nwere n’ebe Devid nọ.+
8 N’ihi na mụ onwe m, Jehova, hụrụ ikpe ziri ezi n’anya,+ kpọọkwa ịpụnara mmadụ ihe na ajọ omume asị.+ M ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha n’ụzọ ziri ezi,+ mụ na ha ga-agbakwa ndụ, bụ́ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.+