14 Ọ ga-erukwa na, dị ka nne mgbada a na-achụ ọsọ, nakwa dị ka ìgwè atụrụ nke na-enweghị onye na-achịkọta ha,+ onye ọ bụla ga-agbakwuru ndị nke ya; onye ọ bụla n’ime ha ga-agbala n’ala ya.+
16 Gbuonụ onye na-agha mkpụrụ na Babịlọn,+ tinyere onye ji mma na-ewe ihe ubi n’oge owuwe ihe ubi. N’ihi mma agha nke na-emesi ha ike, onye ọ bụla n’ime ha ga-alakwuru ndị ya, onye ọ bụla n’ime ha ga-agbala n’ala ya.+