5 Ugbu a, biko, ka m gwa unu ihe m ga-eme ubi vaịn m: A ga-ewepụ ogige ya,+ a ghaghịkwa ịgba ya ọkụ.+ A ga-akwatu mgbidi ya e ji nkume wuo, ọ ghaghịkwa ịghọ ebe a ga na-azọtọ azọtọ.+
28 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m mụ anya n’ebe ha nọ+ ifopụ ha, kwatuo ha, tida ha, laa ha n’iyi, bibiekwa ha,+ otú ahụ ka m ga-amụ anya n’ebe ha nọ iwulite ha, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,”+ ka Jehova kwuru.
6 “N’ihi ya, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka osisi vaịn nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, bụ́ nke m tụnyeworo n’ọkụ ka ọ bụrụ nkụ, otú ahụ ka m meworo ndị bi na Jeruselem.+