9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+ ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum;+ n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.+
10 ọ bụrụkwa na i nye onye agụụ na-agụ ihe na-agụ mkpụrụ obi gị,+ nyejuokwa mkpụrụ obi nke nọ n’ahụhụ afọ, ìhè gị ga-enwukwa ọbụna n’ọchịchịrị, itiri gị ga-adịkwa ka etiti ehihie.+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+