21 Lee nnọọ ka obodo nke kwesịrị ntụkwasị obi+ si ghọọ nwaanyị akwụna!+ Ikpe ziri ezi jupụtaburu n’ime ya;+ ezi omume bibu n’ime ya,+ ma ugbu a, ọ bụ ndị na-egbu ọchụ bi na ya.+
15 “‘Ma ị malitere ịtụkwasị ịma mma gị+ obi ma ghọọ akwụna n’ihi aha gị+ nke na-ede ude. I wee gbara akwụna gakwuru onye ọ bụla nke na-agafe agafe;+ ịma mma gị wee bụrụ nke onye ahụ.
5 “Ohola wee malite ịgba akwụna,+ mgbe ọ nọ n’okpuru m, na-enwekwa agụụ ka ya na ndị ya na ha na-eme enyi nwee mmekọahụ,+ ya bụ, ndị Asiria,+ bụ́ ndị nọ ya nso,
3Jehova wee sị m: “Gaghachi hụ nwaanyị n’anya, bụ́ onye nwoke ọzọ hụrụ n’anya,+ bụ́ nwaanyị na-akwa iko, hụ ya n’anya dị ka Jehova si hụ ụmụ Izrel n’anya+ mgbe ha na-agakwuru chi ọzọ dị iche iche+ wee na-enwe mmasị n’ịchụrụ ha achịcha mkpụrụ vaịn a mịrị amị n’àjà.”+