6 Ma mgbe ha nọ na-eguzogide ma na-ekwujọ ya,+ o fechara uwe+ ya wee sị ha: “Ka ọbara+ unu dị unu n’isi. Aka m dị ọcha.+ Site ugbu a gaa n’ihu, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”+
19 Ka o sina dị, ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na Izrel amaghị?+ Mozis bu ụzọ sị: “M ga-eji ihe na-abụghị mba kpalie unu ikwo ekworo; m ga-eji mba nzuzu kpasuo unu iwe dị ọkụ.”+