3 Otú ọ dị, Sọl malitere imeso ọgbakọ ahụ n’ụzọ jọgburu onwe ya. Ọ na-awakwasị ụlọ niile n’otu n’otu, na-adọkpụpụta ma ndị ikom ma ndị inyom, ọ na-enyefekwa ha ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.+
11 Site n’inye ha ahụhụ ọtụtụ ugboro n’ụlọ nzukọ+ niile, agbalịrị m ịmanye ha ka ha hapụ okwukwe ha; ebe ọ bụkwa na m na-enwe ọnụma n’ụzọ gabigara ókè megide ha, eruru m n’ókè nke ịkpagbu ha ọbụna n’obodo ndị ọzọ.