32 Ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị kweerenụ nwere otu obi na mkpụrụ obi,+ ọ dịghịkwa ọbụna otu onye na-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị o nwere bụ nke ya; kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ.+
10 Ma m na-agba unu ume,+ ụmụnna m, site n’aha+ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, ka unu niile na-ekwu otu ihe,+ ka nkewa gharakwa ịdị n’etiti unu,+ kama ka unu dị n’otu n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’otu obi na n’otu echiche.+