6 unu ghọkwara ndị na-eṅomi+ anyị na ndị na-eṅomi Onyenwe anyị,+ ebe unu ji ọṅụ nke mmụọ nsọ+ na-enye nabata okwu Chineke mgbe unu nọ ná mkpagbu dị ukwuu,+
14 N’ihi na, ụmụnna anyị, unu ghọrọ ndị na-eṅomi ọgbakọ Chineke ndị dị na Judia n’ime Kraịst Jizọs, n’ihi na unu malitekwara ịta ahụhụ+ n’aka ndị obodo unu n’otu ihe ndị ahụ nke ha na-atakwa ahụhụ ha n’aka ndị Juu,
21 N’eziokwu, a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu,+ wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.+