-
Nehemaya 9:10, 11Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
10 I wee mee ihe àmà dị iche iche, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche iji mesie Fero na ndị niile na-ejere ya ozi nakwa ndị ala ya niile ike,+ n’ihi na ị ma na ha mekpara ndị gị ahụ́.+ I meere onwe gị aha nke dị ruo taa.+ 11 I kewara oké osimiri n’ihu ha, ha wee si n’ala nkịtị n’etiti oké osimiri gafee.+ Ị tụbakwara ndị na-achụ ha n’ala ala oké osimiri ka nkume a tụbara n’osimiri ifufe na-enugharị.+
-