-
Mak 11:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 Ha wee bịarute Jeruselem. N’ebe ahụ, ọ banyere n’ụlọ nsọ ma malite ịchụpụ ndị na-ere ihe na ndị na-azụ ihe n’ụlọ nsọ. O kpuru tebụl ndị na-agbanwe ego nakwa oche ndị na-ere nduru ihu n’ala.+ 16 O kweghịkwa ka onye ọ bụla buru ihe ọ bụla si n’ụlọ nsọ gafere. 17 Ọ nọ na-ezi ihe, na-asị ha: “Ọ̀ bụ na e deghị, sị, ‘A ga-akpọ ụlọ m ụlọ ekpere maka mba niile’?+ Ma unu emeela ya ọgba ndị ohi.”+
-
-
Jọn 2:13-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ememme Ngabiga+ ndị Juu ruwere nso, Jizọs wee gbagoo Jeruselem. 14 Ọ hụrụ ndị nọ n’ụlọ nsọ na-ere ehi na atụrụ na nduru,+ nakwa ndị na-agbanwe ego ka ha nọ n’oche ha. 15 O ji ụdọ mere ụtarị wee jiri ya chụpụ ndị niile chị atụrụ na ehi bịa n’ụlọ nsọ. Ọ wụfukwara mkpụrụ ego ndị na-agbanwe ego ma kpuo tebụl ha ihu.+ 16 Ọ sịrị ndị ahụ na-ere nduru: “Wepụsịanụ ihe ndị a ebe a! Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!”+ 17 Ndị na-eso ụzọ ya wee cheta na e dere, sị: “Ihe gbasara ụlọ gị ga na-anụ m ọkụ n’obi.”+
-