Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 22
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Belak kpọrọ Belam ka ọ bụọ ndị Izrel ọnụ (1-21)

      • Jakị Belam kwuru okwu (22-41)

Ọnụ Ọgụgụ 22:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:48

Ọnụ Ọgụgụ 22:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 24:9; Ikp 11:25

Ọnụ Ọgụgụ 22:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 15:15; Di 2:25

Ọnụ Ọgụgụ 22:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 31:7, 8; Jos 13:15, 21

Ọnụ Ọgụgụ 22:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “n’akụkụ osimiri.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 23:3, 4; Jos 13:22; 2Pi 2:15
  • +Je 13:14, 16

Ọnụ Ọgụgụ 22:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:7; Jos 24:9; Neh 13:1, 2

Ọnụ Ọgụgụ 22:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Pi 2:15; Jud 11

Ọnụ Ọgụgụ 22:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:20

Ọnụ Ọgụgụ 22:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:5, 6; 23:7, 11; 24:10

Ọnụ Ọgụgụ 22:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 12:1-3; 22:15, 17; Di 33:29

Ọnụ Ọgụgụ 22:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 24:13

Ọnụ Ọgụgụ 22:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:8

Ọnụ Ọgụgụ 22:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:35; 23:11, 12

Ọnụ Ọgụgụ 22:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “nne jakị.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Pi 2:15; Jud 11

Ọnụ Ọgụgụ 22:22

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/1/2004, p. 27

Ọnụ Ọgụgụ 22:28

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “meghere ọnụ nne jakị ahụ.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Pi 2:15, 16
  • +Ọg 22:32

Ọnụ Ọgụgụ 22:31

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 6:17

Ọnụ Ọgụgụ 22:32

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:12; 2Pi 2:15, 16

Ọnụ Ọgụgụ 22:33

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:23, 25, 27

Ọnụ Ọgụgụ 22:37

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:16, 17; 24:10, 11

Ọnụ Ọgụgụ 22:38

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:26; 24:13

Ọnụ Ọgụgụ 22:40

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “chụrụ ehi na atụrụ n’àjà.”

Ọnụ Ọgụgụ 22:41

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:13, 14

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 22:1Ọg 33:48
Ọnụ Ọgụ. 22:2Jos 24:9; Ikp 11:25
Ọnụ Ọgụ. 22:3Ọp 15:15; Di 2:25
Ọnụ Ọgụ. 22:4Ọg 31:7, 8; Jos 13:15, 21
Ọnụ Ọgụ. 22:5Di 23:3, 4; Jos 13:22; 2Pi 2:15
Ọnụ Ọgụ. 22:5Je 13:14, 16
Ọnụ Ọgụ. 22:6Ọg 23:7; Jos 24:9; Neh 13:1, 2
Ọnụ Ọgụ. 22:72Pi 2:15; Jud 11
Ọnụ Ọgụ. 22:9Ọg 22:20
Ọnụ Ọgụ. 22:11Ọg 22:5, 6; 23:7, 11; 24:10
Ọnụ Ọgụ. 22:12Je 12:1-3; 22:15, 17; Di 33:29
Ọnụ Ọgụ. 22:18Ọg 24:13
Ọnụ Ọgụ. 22:19Ọg 22:8
Ọnụ Ọgụ. 22:20Ọg 22:35; 23:11, 12
Ọnụ Ọgụ. 22:212Pi 2:15; Jud 11
Ọnụ Ọgụ. 22:282Pi 2:15, 16
Ọnụ Ọgụ. 22:28Ọg 22:32
Ọnụ Ọgụ. 22:312Ez 6:17
Ọnụ Ọgụ. 22:32Ọg 22:12; 2Pi 2:15, 16
Ọnụ Ọgụ. 22:33Ọg 22:23, 25, 27
Ọnụ Ọgụ. 22:37Ọg 22:16, 17; 24:10, 11
Ọnụ Ọgụ. 22:38Ọg 23:26; 24:13
Ọnụ Ọgụ. 22:41Ọg 23:13, 14
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
  • 31
  • 32
  • 33
  • 34
  • 35
  • 36
  • 37
  • 38
  • 39
  • 40
  • 41
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 22:1-41

Ọnụ Ọgụgụ

22 Ndị Izrel wee pụọ gaa maa ụlọikwuu n’ọzara Moab, n’ofe Osimiri Jọdan nke ya na Jeriko chere ihu.+ 2 Belak+ nwa Zipọ hụrụ ihe niile ndị Izrel mere ndị Amọraịt. 3 Ezigbo ụjọ tụwara ndị Moab maka na ndị Izrel dị ọtụtụ. N’eziokwu, oké ụjọ bara ndị Moab ahụ́ n’ihi ndị Izrel.+ 4 Ndị Moab wee gwa ndị okenye Midian,+ sị: “Ìgwè mmadụ a ga-erichapụ ihe niile gbara anyị gburugburu otú ehi si atachapụ ahịhịa dị n’ọhịa.”

N’oge ahụ, ọ bụ Belak nwa Zipọ bụ eze Moab. 5 O zigaara Belam nwa Biọ, onye bi n’ebe a mụrụ ya na Pitọ,+ ndị ozi. Pitọ dị n’akụkụ Osimiri Yufretis.* Ọ gwara Belam ka ọ bịakwute ya, sị: “E nwere ndị si n’Ijipt pụta. Ha ejula ụwa.+ Ha nọkwa ezigbo nso n’ala m. 6 Biko, bịa bụọrọ m ha ọnụ+ n’ihi na ha ka m ike. Ikekwe, m ga-emerili ha ma chụpụ ha n’ala a, n’ihi na o doro m anya na onye ị gọziri bụ onye a gọziri agọzi, onye ị bụrụ ọnụ bụkwa onye a bụrụ ọnụ.”

7 Ndị okenye Moab na ndị okenye Midian wee jiri ego ha ga-akwụ ka a gbaara ha afa gakwuru Belam,+ gwa ya ihe Belak kwuru. 8 O wee sị ha: “Rahụnụ ebe a n’abalị a. M ga-agwa unu ihe ọ bụla Jehova gwara m.” Ndị isi Moab wee soro Belam nọrọ n’ebe ahụ.

9 Chineke wee bịakwute Belam, sị:+ “Ole ndị bụ ndị a gị na ha nọ?” 10 Belam sịrị ezi Chineke: “Belak nwa Zipọ, eze Moab, ziteere m ozi, sị, 11 ‘Ndị si n’Ijipt apụta ejula ụwa. Bịa bụọrọ m ha ọnụ.+ Ikekwe, m ga-alụsoli ha ọgụ ma chụpụ ha.’” 12 Ma Chineke sịrị Belam: “Esola ha gaa. Abụla ndị Izrel ọnụ n’ihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”+

13 Belam biliri n’ụtụtụ gwa ndị Belak mere ndị isi, sị: “Laanụ n’ala unu n’ihi na Jehova ekweghị ka m soro unu gaa.” 14 Ndị isi Moab lawara ma gakwuru Belak, sị: “Belam ekweghị iso anyị bịa.”

15 Ma, Belak zigara ndị isi ọzọ. Ha dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ. A na-akwanyekwara ha ùgwù karịa ndị nke mbụ. 16 Ha bịakwutere Belam, sị ya: “Belak nwa Zipọ kwuru, sị, ‘Biko, ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ịbịakwute m, 17 n’ihi na m ga-akwụ gị ezigbo ụgwọ, m ga-emekwa ihe ọ bụla ị gwara m mee. Biko, bịa bụọrọ m ndị a ọnụ.’” 18 Ma Belam gwara ndị na-ejere Belak ozi, sị: “Ọ bụrụgodị na Belak enye m ụlọ ya ọlaọcha na ọlaedo juru, agaghị m eme ihe ọ bụla Jehova bụ́ Chineke m na-agwaghị m mee, ma ọ̀ bụ obere ihe ma ọ̀ bụ nnukwu ihe.+ 19 Ma, biko, nọrọnụ ebe a n’abalị a, ka m mara ihe ọzọ Jehova ga-agwa m.”+

20 Chineke wee bịakwute Belam n’abalị, sị ya: “Ọ bụrụ na ihe ụmụ nwoke a bịara bụ ka ha kpọọ gị, soro ha gawa. Ma, ọ bụ naanị ihe m gwara gị ka ị ga-ekwu.”+ 21 Belam biliri n’ụtụtụ kwadebe jakị* ya ma soro ndị isi Moab gawa.+

22 Ma Chineke were ezigbo iwe maka na ọ gawara. Mmụọ ozi Jehova wee gaa guzo n’ụzọ ka o gbochie ya ịga. Belam nọ n’elu jakị ya na-aga, mmadụ abụọ ná ndị na-ejere ya ozi sokwa ya. 23 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka guzoro n’ụzọ, ọ gbalịrị ka ọ hapụ ụzọ banye n’ọhịa. Ma Belam malitere ịkụ jakị ahụ ihe ka ọ gaghachi n’ụzọ. 24 Mmụọ ozi Jehova gaziri guzo n’ebe ụzọ dị warara, n’agbata ubi vaịn abụọ, mgbidi e ji nkume rụọ dịkwa n’akụkụ ha abụọ. 25 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, ọ dagidere ná mgbidi ahụ ma kpagide ụkwụ Belam ná mgbidi ahụ. Belam wee kụwa ya ihe ọzọ.

26 Mmụọ ozi Jehova gafeere ọzọ gaa kwụrụ n’ebe dị warara, n’ebe a na-enweghị otú a ga-esi tụgharịa gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe. 27 Mgbe jakị ahụ hụrụ mmụọ ozi Jehova, o bu Belam makpuru ala. N’ihi ya, Belam were ezigbo iwe, jirikwa mkpara ya na-akụ jakị ahụ. 28 N’ikpeazụ, Jehova mere ka jakị ahụ kwuo okwu.*+ O wee sị Belam: “Gịnị ka m mere gị i ji kụọ m ihe ugboro atọ a?”+ 29 Belam zara jakị ahụ, sị: “Ọ bụ maka na i ji m gwuo egwu. A sị na m ji mma agha n’aka, m gaara egbu gị.” 30 Jakị ahụ sịziri Belam: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị m bụ jakị gị na-ebu gị kemgbe ndụ gị ruo taa? M̀ metụla gị otú a mbụ?” Belam zara, sị: “Mba.” 31 Jehova megheziri anya Belam,+ ya ahụ mmụọ ozi Jehova ka o ji mma agha a mịpụtara amịpụta n’aka kwụrụ n’ụzọ. Belam hulatara ozugbo kpọọ isiala.

32 Mmụọ ozi Jehova wee sị ya: “Gịnị mere i ji kụọ jakị gị ihe ugboro atọ a? Apụtara m ka m gbochie gị ịga n’ihi na ihe a ị na-achọ ime abụghị uche m.+ 33 Jakị a hụrụ m gbalịa ka o si n’ebe m nọ pụọ ugboro atọ a.+ A sị na o sighị n’ebe m nọ pụọ, m gaarala egbu gị ma hapụ ya ndụ.” 34 Belam sịrị mmụọ ozi Jehova: “Emehiela m n’ihi na amaghị m na ọ bụ gị kwụ n’ụzọ ka i zute m. Ugbu a, ọ bụrụ na ihe a m na-aga adịghị gị mma, m ga-alaghachi.” 35 Ma mmụọ ozi Jehova sịrị Belam: “Soro ụmụ nwoke ndị ahụ gawa. Ma ọ bụ naanị ihe m ga-agwa gị ka ị ga-ekwu.” Belam wee soro ndị Belak mere ndị isi gawa.

36 Mgbe Belak nụrụ na Belam abịala, ọ gawara ozugbo ka o zute ya n’obodo Moab, nke dị n’akụkụ mmiri Anọn, n’ókè nke ala Moab. 37 Belak sịrị Belam: “Ọ̀ bụ na ezighị m ozi ka a kpọọ gị? Gịnị mere na ị bịaghị hụ m? Ì chere na enweghị m ike ịkwụ gị ezigbo ụgwọ?”+ 38 Belam zara Belak, sị: “M bịalanụ ịhụ gị. Ma, à ga-ekwenụ ka m kwuo ihe ọ bụla? Naanị ihe m ga-ekwuli bụ ihe Chineke gwara m ka m kwuo.”+

39 Belam sooro Belak gawa. Ha wee bịarute Kiriat-huzọt. 40 Belak gburu ehi na atụrụ* ma zigara Belam na ndị isi ha na ya nọ ụfọdụ n’ime ha. 41 N’ụtụtụ, Belak kpọọrọ Belam wee kpọgote ya na Bemọt-bel. O si ebe ahụ na-ahụ ndị Izrel niile.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya