Jona
3 Jehova wee gwa Jona okwu nke ugboro abụọ, sị:+ 2 “Bilie, gaa Ninive+ bụ́ obodo ukwu ma kwusaara ndị bi na ya okwu m na-agwa gị.”
3 Jona wee bilie gaa Ninive+ otú Jehova gwara ya.+ Ninive bụ obodo buru ezigbo ibu.* Ọ ga-ewe onye ji ụkwụ ụbọchị atọ iji gazuo ya. 4 Jona wee banye n’obodo ahụ. Ọ gara ije otu ụbọchị, na-ekwusa, sị: “Ọ fọrọ naanị ụbọchị iri anọ ka e bibie* Ninive.”
5 Ndị Ninive wee nwee okwukwe na Chineke.+ Ha kwuziri ka onye ọ bụla n’ime ha buo ọnụ ma yiri ákwà iru uju, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. 6 Mgbe eze Ninive nụrụ ihe Jona na-ekwu, o biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, yiri ákwà iru uju ma nọdụ ala ná ntụ. 7 O nyekwara iwu ka e kwusaa n’ebe niile na Ninive, sị,
“Eze na ndị isi na-eti iwu, sị: Ka onye ọ bụla ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla, ìgwè ehi ma ọ bụ ìgwè atụrụ, ghara iri ihe ọ bụla. Ka ha ghara iri nri ma ọ bụ ṅụọ mmiri. 8 Ka mmadụ niile yiri ákwà iru uju, ka ha jirikwa ya kpuchie anụmanụ ha. Ka ha rịọsie Chineke arịrịọ ike, hapụ ihe ọjọọ ha na-eme ma kwụsị tigbuo zọgbuo. 9 Ònye manụ ma ezi Chineke ọ̀ ga-agbanwe obi ya n’ihe ọ chọrọ ime* ma mee ka iwe ya dị ọkụ dajụọ, ka anyị ghara ịnwụ?”
10 Mgbe ezi Chineke hụrụ ihe ha mere, otú ha si hapụ ụzọ ọjọọ ha,+ ọ gbanwere obi ya banyere ọdachi ahụ o kwuru na ya ga-eme ka ọ dakwasị ha. O wetaghịzi ya.+