Akwụkwọ Ozi Nke Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt
7 N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, ebe e kwere anyị nkwa ndị a,+ ka anyị sachapụ ihe niile na-emerụ ahụ́ anyị na obi anyị.*+ Ọ bụrụ na anyị emee ya, anyị ga-adịkwu nsọ ka anyị na-atụ egwu Chineke.
2 Jirinụ obi unu niile hụ anyị n’anya.+ Ọ dịghị onye anyị mejọrọ. Ọ dịghị onye anyị merụrụ, ọ dịghịkwa onye anyị ghọgburu.+ 3 Anaghị m ekwu ihe a iji katọọ unu. N’ihi na ekwubuola m na unu dị anyị n’obi, ma n’ọnwụ ma ná ndụ. 4 Ọnụ na-aka m nnọọ ma m na-agwa unu okwu. Eji m unu anya isi. A kasiela m nnọọ obi. Obi bụ m sọ aṅụrị n’ahụ́ niile a na-emekpa anyị.+
5 N’eziokwu, mgbe anyị rutere Masedonia,+ anyị* ezughị ike ọ bụla. Ndị mmadụ nọ na-emegide anyị, anyị nọkwa na-echegbu onwe anyị maka ọgbakọ dị iche iche. 6 Ma, Chineke, onye na-akasi ndị e wedara n’ala obi,+ ji Taịtọs kasie anyị obi mgbe ọ bịara hụ anyị. 7 Ma ọ bụghị naanị na ọ bịara kasie anyị obi, kamakwa obi unu kasiri ya kasikwara anyị obi. Ọ kọkwaara anyị otú ịhụ m si agụsi unu ike, otú unu si na-enwe mwute, nakwa otú unu si na-eche gbasara m. Nke a mere ka m nwekwuo aṅụrị.
8 N’ihi ya, ọ bụrụgodị na akwụkwọ ozi m wutere unu,+ anaghị m akwa ụta. Obi adịghị m mma na mbụ na m mere ihe wutere unu. (Ma ama m na mwute akwụkwọ ozi ahụ wutere unu adịteghị aka.) 9 M na-aṅụrị ọṅụ ugbu a, ọ bụghị naanị maka na o wutere unu, kama maka na o wutere unu, unu echegharịa. O wutere unu otú Chineke si chọọ, ọ bụkwa ya mere na ihe anyị gwara unu akpaghị unu aka ọjọọ. 10 N’ihi na ọ bụrụ na ihe na-ewute anyị otú Chineke si chọọ, ọ na-eme ka anyị chegharịa, meekwa ka a zọpụta anyị, anyị agaghịkwa akwa ụta.+ Ma, anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na ihe na-ewute anyị otú o si ewute ndị ụwa. 11 O doro anya na ihe a wutere unu otú Chineke chọrọ. Ọ bụ ya mere unu ji gbaa ezigbo mbọ mee ihe dị mma. Unu mere ka a ghara ịkpọ unu aha ọjọọ. Ihe ọjọọ unu mere wutere unu. Unu tụrụ egwu Chineke. Ọ gụrụ unu agụụ ichegharị. Unu ji obi unu na-ejere Chineke ozi, unu mezikwara ihe unu mejọrọ.+ Unu mere ihe niile otú kwesịrị ekwesị iji hụ na unu doziri nsogbu a. 12 Ihe mere m ji detara unu akwụkwọ abụghị maka onye ahụ mere ihe ọjọọ,+ ọ bụghịkwa maka onye e mejọrọ, kama ọ bụ ka m mara ma ùnu ga-egosi n’eziokwu n’anya Chineke na unu chọrọ ime ihe anyị gwara unu. 13 Ihe unu mere kasiri anyị obi.
Ma, e wezụga obi a kasiri anyị, ihe ka mee ka obi dị anyị ụtọ bụ ọṅụ Taịtọs nwere, n’ihi na unu niile gbara ya ume. 14 Ọ bụrụ na m ji unu nyaara Taịtọs isi, ọ bụghị n’efu. Isi anyị nyaara ya ziri ezi, otú ahụ ihe niile anyị gwara unu bụ eziokwu. 15 Otú o si hụ unu n’anya ugbu a enweghị atụ n’ihi na ọ na-echeta otú unu si rubere ya isi+ ma kwanyere ya ùgwù wee nabata ya. 16 M na-enwe aṅụrị maka na obi siri m ike na unu ga na-eme ihe ziri ezi mgbe niile.