Zekaraya
2 M leliri anya hụ otu nwoke ji ụdọ e ji atụ̀ ihe+ n’aka. 2 M jụrụ ya, sị: “Ebee ka ị na-aga?”
Ọ zara m, sị: “M na-aga ịtụ̀ Jeruselem ka m mata otú ọ hà n’obosara na otú ọ hà n’ogologo.”+
3 Ma, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu pụwara, mmụọ ozi ọzọ abịakwute ya. 4 O wee sị ya: “Gbaga ebe ahụ, gwa nwa okorobịa ahụ, sị, ‘“A ga-ebi na Jeruselem+ otú e si ebi n’ime obodo na-enweghị mgbidi n’ihi na ndị mmadụ na anụ ụlọ niile nọ n’ime ya ga-adị ọtụtụ.+ 5 M ga-abụrụ ya mgbidi ọkụ gburugburu ya,+ ebube m ga-adịkwa n’ime ya.”’”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.
6 Jehova kwuru, sị, “Bịanụ! Bịanụ! Sinụ n’ala dị n’ebe ugwu gbapụ,+
N’ihi na m chụsasịrị unu n’ebe niile.”*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.
7 “Zayọn, bịa! Gbapụnụ, unu ndị bi na Babịlọn.+ 8 Mgbe e mechara ka Jehova nke ụsụụ ndị agha dị ebube, o zigara m ná mba ndị nọ na-ebukọrọ ihe unu.+ O kwuru, sị: ‘Onye ọ bụla na-emetụ unu aka na-emetụ mkpụrụ anya m aka.+ 9 N’ihi na ugbu a, m ga-eweli aka m mesie ha ike, ndị ohu ha ga-ebukọrọkwa ihe ha.’+ Unu ga-amata na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m.”
10 Jehova kwuru, sị, “Tie mkpu ọṅụ, Zayọn,*+ n’ihi na m na-abịa,+ m ga-ebikwa n’ime gị.+ 11 Ọtụtụ mba ga-esonyere Jehova n’ụbọchị ahụ,+ ha ga-aghọkwa ndị m. M ga-ebikwa n’ime gị.” Ị ga-amata na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute gị. 12 Jehova ga-eweghara Juda ka ọ bụrụ òkè ya n’ala dị nsọ, ọ ga-ahọrọkwa Jeruselem ọzọ.+ 13 Mmadụ* niile, nọrọnụ jụụ n’ihu Jehova, n’ihi na o si n’ebe obibi ya dị nsọ na-abịa ka o mee ihe.