Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Ndịàmà Jehova
NDỊ ANYỊ BỤ
Isi nke 1-4
Ndịàmà Jehova nọ na narị mba abụọ na iri atọ na itoolu. O nweghị agbụrụ ha na-esighị. Ma, olee ihe mere ha ji dịrị n’otu n’agbanyeghị na ha si n’agbụrụ dị iche iche? Olee ụdị ndị Ndịàmà Jehova bụ?
ỌRỤ ANYỊ NA-ARỤ
Isi nke 5-14
Onye ukwu na onye nta ma na anyị na-ekwusa ozi ọma. Anyị na-ezukọkwa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị mụọ Baịbụl ma fee Chineke. Olee otú anyị si amụ ihe? Oleekwa ndị nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe anyị?
ỌGBAKỌ ANYỊ
Isi nke 15-28
Ọgbakọ anyị zuru ụwa ọnụ. O nweghịkwa onye ji ya achụ ego. Ndị nọ na ya ji obi ha niile na-efe Chineke. Olee otú e si hazie ya? Ole ndị na-elekọta ya? Oleekwa otú e si enweta ego e ji akwado ya? Ndịàmà Jehova hà na-eme uche Jehova n’eziokwu?