Na-ebinụ Obi nke Ọma Bụ́ nke Na-enye Chineke Otuto
1 Ebe ọ bụla anyị nọ, àgwà, uwe, na ejiji anyị na-agba àmà banyere anyị na Chineke anyị na-efe ofufe. Nke a na-apụtakarịsị ìhè ná nnọkọ ndị buru ibu nke ndị Chineke, bụ́ ebe ọtụtụ ndị na-ahụ anyị. Mgbe anyị na-egosi ezi ihe nlereanya, a na-eto aha Jehova. (1 Pita 2:12) Otú ọ dị, àgwà na-adịghị mma ma ọ bụ omume mmadụ ole na ole n’ime anyị mere n’echeghị echiche pụrụ iwetara aha Chineke na ndị ya nkọcha. (Ekli. 9:18b) Iburu n’uche na site n’àgwà anyị, ndị nọ n’èzí na-atụ nzukọ anyị na Chineke anyị na-efe ofufe n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ime ka anyị lezie anya ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.’—1 Kọr. 10:31.
2 Àgwà Kwesịrị Nṅomi n’Ebe E Nyere Gị Ụlọ: Ọtụtụ mgbe, ịdị n’usoro, àgwà ọma, na ịdị ọcha nke Ndịàmà Jehova na-amasị ndị nwe ụlọ n’ụzọ dị ukwuu. Mgbe otu onye nwe ụlọ na-ekwu banyere ezinụlọ Ndịàmà bụ́ ndị biri n’ụlọ ya, o kwuru, sị: “Ụmụaka Ndịàmà Jehova bụ ụmụaka kasị mma m hụtụworo! Ha na-eji ejiji dị ka ndị ikom na ndị inyom a na-akwanyere ùgwù; ha nwere olu ọma, nwee nkwanye ùgwù ma na-akpa àgwà ọma; ha akpatabeghịkwa nsogbu ọ bụla. E kwesịrị ịja unu mma n’ezie n’ihi ụmụ unu ndị na-eto eto. Anyị nwere obi ụtọ inwe ụmụ unu n’ebe a.” A na-anụkarị okwu ndị dị otú a n’ihi na ndị anyị na ha na-emekọrịta ihe pụrụ ịhụ ịhụnanya na nkwanye ùgwù dị n’etiti ndị Jehova.
3 N’aka nke ọzọ, okwu ndị nwe ụlọ ndị ọzọ kwuru na-egosi na a ka nwere nsogbu n’ebe ụfọdụ ndị nọ bụ́ ndị na-eme omume ọ gbasaghị m ma ọ bụ ndị na-emetọ ebe e nyere ha ụlọ. Nke a na-akpata nsogbu ma na-ebute nkatọ na-ekwesịghị ịdị. Ụfọdụ ndị nwe ụlọ na-eme mkpesa na ụmụaka na ndị nọ n’afọ iri na ụma na-eme mkpọtụ, na-emekwa aghara, ma bụrụ ndị ndị mụrụ ha na-adịghị elebara anya.
4 N’ọnọdụ ụfọdụ, e nyewo ndị bịara mgbakọ ụlọ na họtel. Ihe ka ọtụtụ n’ime họtel ndị a nwere ụkpụrụ ndị a tụrụ anya ka ndị ọbịa gbasoo. Ụfọdụ ụmụnna emebiwo ụkpụrụ ndị a n’ihe banyere ime mkpọtụ ma ọ bụ isi nri n’ọnụ ụlọ ha. Ndị manịja họtel na-agwa anyị na isi nri n’ebe a na-achọghị ya na-abụkarị ụzọ a na-esi emebi ngwongwo ha. Ọ bụghị nanị na e mebiwo ọnụ ụlọ ndị a n’ụzọ nkịtị kama ísì na-anọgide na-esi na ha na-eme ka o sie ike inye ndị ọzọ ụlọ ndị ahụ ruo ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụ izu mgbe e mesịrị. Ọ gwụla ma e nyere ohere kpọmkwem maka isi ihe n’ọnụ ụlọ, a gaghị eme ya.
5 E kwesịrị ime ezi mgbalị iji rubere ndị nwe ụlọ na ndị na-elekọta họtel isi n’ụzọ zuru ezu. N’ezie, anyị achọghị ka ndị mmadụ nwee echiche na-ezighị ezi banyere ndị Jehova. Dị ka ndị Kraịst, anyị aghaghị ịdị na-eme ihe n’eziokwu mgbe nile. Anyị ekwesịghị ịmara ụma were ihe ndị ọzọ n’ebe e nyere anyị ụlọ n’agwaghị ha agwa, n’ihi na nke ahụ bụ ohi; anyị ekwesịghịkwa ịgha ụgha mgbe anyị na-akọ banyere ihe ndị mebiri n’ebe e nyere anyị ụlọ.
6 Ejiji Kwesịrị Ekwesị ná Mgbakọ: N’agbanyeghị ụdị ụlọ e jiri mee ihe, e kwesịrị ile ya anya dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze buru ibu n’oge mgbakọ. Uwe na ejiji kwesịrị ekwesị kwesịrị ịpụta ìhè, dị nnọọ ka ọ na-adị mgbe anyị nọ nzukọ n’ọgbakọ anyị. Ma mgbe nnọkọ na-aga n’ihu ma mgbe a gbasara, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị kwesịrị izere iyi uwe na-ekwesịghị ekwesị na ndị na-ewu ewu, bụ́ ndị na-egosipụta mmụọ nke ụwa ma mee ka o sie ike ịmata anyị dị ka ndị dị iche n’ịdị mma. Ụmụnna nwanyị kwesịrị ilezi anya ịhụ na otú e si kwaa sket na uwe elu ha na ebe ha gbadaruru kwesịrị nnọọ ekwesị. (1 Tim. 2:9, 10) Ma ànyị nọ ná mgbakọ, n’ebe e nyere anyị ụlọ, na-eri nri n’ụlọ nri, ma ọ bụ na-azụ ihe n’ụlọ ahịa, anyị kwesịrị igosipụta mgbe nile na anyị bụ ndị ozi nke Chineke, ghara ịkpata ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla.—2 Kọr. 6:3.
7 A ga-eme baptism n’ụtụtụ Saturday ná mgbakọ ahụ. Ụlọ Nche nke April 1, 1995, peeji nke 30, na-akọwa àgwà anyị kwesịrị igosipụta n’oge ahụ. Ọ na-ekwu na anyị “kwesịrị ile baptism anya n’ụzọ ziri ezi dị ka ihe dị nnọọ mkpa. Ọ bụghị oge igosi mmetụta gabiga oké, ime nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ngosi nke oké mkpali mmụọ. Ma, ọ bụghịkwanụ oge ntakpuchi ọnụ ma ọ bụ ihu mgbarụ.” Ọ ga-abụ ihe na-ekwesịtụdịghị ekwesị nye ndị a gaje ime baptism iyiri uwe ịsa ahụ na-ekpuchichaghị ahụ ma ọ bụ nke na-ahụ ụzọ, ma hà bụ ndị ikom ma hà bụ ndị inyom. N’ihi ya, mmadụ nile kwesịrị igosipụta ma ịdị mkpa ma ọṅụ nke baptism ndị Kraịst.
8 Pita na-echetara anyị ‘aha mmadụ anyị na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ na nsọpụrụ Chineke.’ (2 Pita 3:11) Ka okwu na omume anyị ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke” nyere ndị nwere obi eziokwu bụ́ ndị na-ekiri ihe na-emenụ aka ịmara ma bịa fee Chineke anyị dị ukwuu ofufe, bụ́ onye kwesịrị inweta nsọpụrụ na otuto nile.—1 Kọr. 14:24, 25.